Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?

Chineke Ọ̀ Bụ Atọ n’Ime Otu Dị Ngọzi?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Ọtụtụ ndị chọọchị na-ekwu na e nwere pesịn atọ dị n’otu Chukwu. Ma, otu akwụkwọ ọkọwa okwu a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na o nweghị ebe e dere atọ n’ime otu ma ọ bụ ihe ọ bụla yiri ya n’Agba Ọhụrụ. Kama na ọ bụ ndị mmadụ ji aka ha wepụta ozizi Atọ n’Ime Otu ọtụtụ afọ gara aga.

 Nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru na e nwere pesịn atọ dị n’ime otu Chukwu. Kama, lee ihe Baịbụl kwuru:

 “Jehova bụ́ Chineke anyị bụ otu Jehova.”—Diuterọnọmi 6:4.

 “Gị onwe gị, onye aha gị bụ Jehova, ọ bụ naanị gị bụ Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.

 “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”—Jọn 17:3.

 “Chineke bụ naanị otu.”—Ndị Galeshia 3:20.

 Olee ihe mere ọtụtụ ndị chọọchị ji ekwu na Chineke bụ Atọ n’Ime Otu?