Gaa n'Isiokwu

Ekwensu Ò Nwere Ike Inweta Mmadụ?

Ekwensu Ò Nwere Ike Inweta Mmadụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ji ụmụ mmadụ aka ọjọọ nke na Baịbụl sịrị na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:​19) Baịbụl kwuru ụzọ dị iche iche Ekwensu na-esi enweta ndị mmadụ.

  •   Ịghọgbu ha. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘guzosie ike megide atụmatụ aghụghọ Ekwensu.’ (Ndị Efesọs 6:​11) Otu ụzọ Ekwensu na-esi aghọgbu ndị mmadụ bụ ime ka ha chee na ndị na-ejere ya ozi na-ejere Chineke ozi.​—2 Ndị Kọrịnt 11:13-​15.

  •   Ime mgbaasị. Ụzọ ọzọ Ekwensu na-esi eduhie ndị mmadụ bụ ime ka ha na-eme ihe ndị di ka, ịjụ ndị mmụọ ase, ịgba afa, ịchọ ịmata ọdịnihu, na iji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu. (Diuterọnọmi 18:10-​12) Mmadụ ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịgwọ ọgwụ, iji ọgwụ ekechi mmadụ, na mmadụ ịtụgharị uche otú ga-eme ka ihe niile pụọ ya n’obi nwekwara ike ime ka Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya nweta onye ahụ.​—Luk 11:24-​26.

  •   Okpukpe ụgha. Okpukpe ndị na-akụzi ihe ndị na-abụghị eziokwu na-eme ka ndị mmadụ na-enupụrụ Chineke isi. (1 Ndị Kọrịnt 10:20) Baịbụl kpọrọ ihe ndị ahụ ha na-akụzi “ozizi ndị mmụọ ọjọọ.”​—1 Timoti 4:1.

  •   Ịbanye n’ime mmadụ. Baịbụl kwuru banyere ndị ndị mmụọ ọjọọ banyere n’ime ha. Ndị mmụọ ọjọọ na-eme ka ụfọdụ ndị ha ji kpuo ìsì, daa ogbi, ma ọ bụ na-emerụ onwe ha ahụ́.​—Matiu 12:22; Mak 5:​2-5.

Ihe anyị ga-eme ka Ekwensu ghara inweta anyị

 I kwesịghị ịna-atụ egwu na ndị mmụọ ọjọọ ga-enweta gị n’ihi na Baịbụl kwuru otú i nwere ike isi iguzogide Ekwensu:

  •   Mụta ụzọ Ekwensu na-esi enweta ndị mmadụ ka ị ghara ịbụ onye “na-amaghị atụmatụ ya.”—2 Ndị Kọrịnt 2:11.

  •   Na-amụ Baịbụl, na-emekwa ihe ndị ị na-amụta. Ọ bụrụ na ị na-eme ihe Baịbụl kwuru, Ekwensu agaghị enweta gị.—Ndị Efesọs 6:11-18.

  •   Wepụ ihe ọ bụla nwere otú o si gbasa ndị mmụọ ọjọọ. (Ọrụ Ndịozi 19:19) Ụfọdụ n’ime ha bụ egwú, akwụkwọ, magazin, akwụkwọ a na-amapawa n’ahụ́ ụlọ, na fim ndị na-eme mgbaasị.