Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Mmadụ Nwere Ike Ịnwụ Lọghachikwa Na-akọ Ihe Ndị Ọ hụrụ?

Ọ̀ Bụ Eziokwu na Mmadụ Nwere Ike Ịnwụ Lọghachikwa Na-akọ Ihe Ndị Ọ hụrụ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọtụtụ ndị ọ fọrọ ntakịrị ka ha nwụọ ekwuola na ọ dị ha ka hà hapụrụ ahụ́ ha pụọ ma ọ bụ na ha chetara na ha hụrụ ìhè na-enwu gbaa, ma ọ bụ ebe mara ezigbo mma. Akwụkwọ bụ́ Recollections of Death sịrị na ‘ụfọdụ weere ya na ihe ahụ merenụ bụ nhụpere ka ha hụpeere otú ụwa ọzọ ma ọ bụ eluigwe dị. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị gbasara onye ụdị ihe a mere, ma o kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịmata na ihe ahụ ụfọdụ ndị sịrị na ha hụrụ abụghị otú ụwa ọzọ dị.

 Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.

Baịbụl sịrị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Mmadụ nwụọ, ọ naghị aga ebe ọzọ gaa nọrọ, kama ọ na-akwụsị ịdị adị. Ozizi bụ́ na mmadụ nwụọ na mkpụrụ obi ya anaghị anwụ esighị na Baịbụl. (Ezikiel 18:4) N’ihi ya, ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ikwu na ya chetara mgbe ahụ ọ dị ya ka ọ̀ nwụọla enweghị ike ịbụ otú eluigwe, ọkụ ala mmụọ, ma ọ bụ ebe ọ bụla ọzọ dị.

 Olee ihe Lazarọs kwuru merenụ mgbe ọ nwụrụ?

Lazarọs Baịbụl kọrọ akụkọ ya nwụrụ anwụ n’eziokwu. Jizọs kpọlitere ya mgbe ọ nọchara abalị anọ n’ili. (Jọn 11:38-​44) Ọ bụrụ na Lazarọs nọ na-ekpori ndụ n’oge ahụ ọ nwụrụ, ọ pụtara na ọ bụghị ihe ọma ka Jizọs meere ya kpọlite ya, ya abịaghachi n’ụwa. O nweghị ebe Lazarọs kwuru na Baịbụl na e nwere ihe ọ hụrụ mgbe ahụ ọ nwụrụ. A sị na e nwere, ọ gaara ekwu. Buru n’obi na Jizọs ji ọnwụ Lazarọs tụnyere ụra. Nke a gosiri na e nwetụdịghị ihe ọ bụla Lazarọs ma n’oge ahụ ọ nwụrụ.​—Jọn 11:11-​14.