Gaa n'Isiokwu

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA

Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Na-emekwu nke Ọma n’Ule

Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Na-emekwu nke Ọma n’Ule

 O yiri ka ịga akwụkwọ anaghị atọzi nwa gị ụtọ. Ọ naghị ekwe amụ ihe ma ọ bụ mee ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ. Gịnị ka ọ ga-akpatara ya? Ọ ga-ada n’ule, àgwà ya a na-akakwu njọ. Olee otú ị ga-esi enyere nwa gị aka ịna-eme nke ọma n’ule?

 Ihe i kwesịrị ịma

 Ịmanye nwa gị ka o mee nke ọma n’ule na-eme ka nsogbu ya ka njọ. Ịna-amanye nwa gị ka o mee nke ọma n’ule ga-eme ka obi koro ya n’elu ma n’ụlọ akwụkwọ ma n’ụlọ. Iji gbaara nsogbu ị na-enye ya ọsọ, o nwere ike ịghara gị ụgha banyere onye ole ọ gbara ma ọ bụ zochie akwụkwọ ule ya ma ọ bụrụ na o meghị nke ọma. N’obodo ụfọdụ ebe ndị nne na nna ga-abịanye aka na rịpọt kaadị nwa ha iji gosi na ha ahụla ya, o nwedịrị ike iji aka ya bịanyere gị aka ka à ga-asị na ọ bụ gịnwa bịanyere ya. O nwekwara ike jụ ịga akwụkwọ mgbe ụfọdụ. Nke ahụ ga-eme ka ihe kakwuo njọ.

 Inye nwa gị ihe mgbe ọ bụla o mere nke ọma n’ule nwekwara ike ịkpata nsogbu. Otu nna aha ya bụ Andrew kwuru, sị: “Anyị na-enye nwa anyị nwaanyị ihe mgbe ọ bụla o mere nke ọma n’ule iji mee ka ọ na-emekwu nke ọma. Ma nke ahụ meziri ka uche ya dịrịzie naanị n’ihe ndị ahụ anyị na-enye ya. Mgbe ọ bụla ọ na-emeghị nke ọma n’ule, kama obi ga na-ajọ ya njọ na o meghị nke ọma, ọ na-ewute ya na o nweghị ihe anyị ga-enye ya.”

 Ịta ndị nkụzi nwa gị ụta agaghị eme ka ihe ka mma. Nwa gị nwere ike chewe na o nweghi uru mmadụ ịna-agba mbọ ka ọ na-emekwu nke ọma bara. O nwedịrị ike mụta ịna-ata ndị ọzọ ụta maka ihe ndị ọ na-emetaghị. O nwekwara ike tụwa anya ka ndị ọzọ na-emere ya ihe nille. Nwa gị nwere ike ghara ịmụta otu ihe dị mkpa ga-abara ya uru ná ndụ mgbe o toro, ya bụ, ikweta ihe o mejọrọ.

 Ihe i nwere ike ime

 Na-ejide onwe gị. Gị na nwa gị akparịtala gbasara onye ole ọ gbara mgbe iwe ji gị. Otu nna aha ya bụ Brett kwuru, si: “Ọ bụrụ na mụ na nwunye m na nwa anyị ekwuo gbasara onye ole ọ gbara mgbe obi dị anyị mma nakwa mgbe ahụ́ ruru anyị ala, ọ na-akacha abara ya uru.”

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’​—Jems 1:19.

 Chọpụta ihe bụ́ nsogbu ya. Ihe kacha eme ka ụmụaka ghara ịna-eme nke ọma n’ule bụ nsogbu ụmụ akwụkwọ ibe ha na-enye ha, ịna-agbanwe ụlọ akwụkwọ, ụjọ ule, nsogbu ezinụlọ, ehighi ụra ọfụma, ahazighi ihe ha na-eme ahazi, na etinyeghị uche n’ihe a na-amụ n’ụlọ akwụkwọ. Echela na ihe kpatara ya bụ na nwa gị anaghị agba mbọ.

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Onye na-egosi na ya nwere nghọta n’okwu ga-enweta ihe ọma”​—Ilu 16:20.

 Mee ka nwa gị nwee ebe dị mma ọ ga-anọ na-amụ ihe. Haziere nwa gị oge ndị ọ ga na-eji eme ihe omume ụlọ akwụkwọ ya na nke ọ ga na-eji amụ ihe. Chọtara ya ebe ọ ga-anọ mụọ ihe n’enweghị ihe ndị dị ka, tiivi ma ọ bụ ekwe ntị, ga na-adọpụ ya uche. Kebie oge ị ga-eji enyere nwa gị aka ime ihe omume ụlọ akwụkwọ ya obere obere, ka o mee ka uche ya dịrị n’ihe ị na-akụziri ya. Otu nna bụ́ onye Jamanị aha ya bụ Hector kwuru, sị: “Tupu oge ule nwa anyị eruo, anyị na-ebido n’oge lebawa anya n’ihe ndị a kụziiri ya n’ụlọ akwụkwọ obere obere, kama ichewe mgbe oge ule ha ruru.”

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”​—Ekliziastis 3:1.

 Mee ka nwa gị mata uru ịmụ ihe n’onwe ya bara. Ọ bụrụ na nwa gị aghọta uru ịga ụlọ akwụkwọ ga-abara ya ugbu a, ọ ga-eme ka ọ na-agụ ya agụụ ịmụ ihe. Dị ka ihe atụ, ya mụta otú e si arụ mgbakọ na mwepụ, ọ ga-enyere aka ịma otú ọ ga-esi ahazi otú ọ ga-esi emefu ego mmachi akpa ya.

 Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: “Nweta amamihe, nweta nghọta. . . . Were ya kpọrọ oké ihe.”​—Ilu 4:​5, 8.

 Aro: Kụziere nwa gị otú ọ ga-esi eme ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ, mana emekwarala ya ihe omume ya. Andrew anyị kwuburu okwu ya ná mmalite kwuru, sị: “Nwa anyị bịara tụwa anya ka anyị na-emere ya ihe omume ya niile, o nweghịzi nke ike na-ekwe ya mee.” Kụziere nwa gị otú ọ ga-esi na-eme ihe omume e nyere ya n’ụlọ akwụkwọ n’onwe ya.