Gaa n'Isiokwu

Olee Ihe M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ike Ịga Akwụkwọ Agwụla M?

Olee Ihe M Ga-eme Ma Ọ Bụrụ na Ike Ịga Akwụkwọ Agwụla M?

Lee ihe ga-enyere gị aka

 Na-ele ịga akwụkwọ anya ka ihe ọma. Gbalịa ka ị mata ihe a na-akụziri unu. I nwere ike ịna-eche na ọ bụghị ihe niile a na-akụziri unu na-abara gị uru ugbu a. Ma, ihe niile ahụ unu na-amụ ga-eme ka ị mata ọtụtụ ihe dị n’ụwa a. Ọ ga-eme ka ị ghọọ “ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ.” Mgbe ahụ ka ị ga-enwe ike ịgwa ụdị mmadụ dị iche iche okwu. (1 Ndị Kọrịnt 9:22) Ma o nweghị ihe ọzọ, ọ ga-eme ka ị na-echekwu echiche nke ọma. Ọ bụrụkwa na ị na-eche echiche nke ọma, ọ ga-abara gị uru n’ọdịnihu.

E nwere ike iji ịga ụlọ akwụkwọ tụnyere ịsụpe ụzọ ị ga-esi apụta n’oké ọhịa. Ma, ị ga-emeli ha abụọ ma i jiri ezigbo ngwá ọrụ

 Na-ele onye nkụzi unu anya ọma. Ọ bụrụ na i chere na otú onye nkụzi unu si akụzi ihe na-agwụ ike, gbalịa ka ị ghọta ihe ọ na-akụzi. Cheta na onye nkụzi unu akụzierela ọtụtụ ndị ihe ahụ ọ na-akụziri unu ugbu a. N’ihi ya, o nwere ike isitụrụ ya ike ịkụziri unu ihe otú ahụ o si kụziere ndị ahụ.

 Ihe ga-enyere gị aka: Na-edetu ihe ụfọdụ, medaa obi gwa ya ka ọ kọwaara gị ihe na-edochaghị gị anya. Jiri ihe ahụ ọ na-akụziri unu kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na i jiri ihe ọ na-akụziri unu kpọrọ ihe, yanwa ga-ejikwa ihe ahụ ọ na-akụziri unu kpọrọ ihe.

 Echekwala na o nweghị ihe ị ma. Ịga akwụkwọ nwere ike ime ka ị mata ihe ndị ị na-amaghị na ị ma. Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: ‘Mee ka onyinye Chineke nke dị n’ime gị nwuo dị ka ọkụ.’ (2 Timoti 1:6) O doro anya na Chineke si n’ike mmụọ nsọ nye Timoti onyinye ọ ga-eji na-eme ihe bara uru. Ma, o kwesịrị iji ike ahụ Chineke nyere ya, ya bụ, onyinye o nyere ya, na-eme ihe bara uru, ka onyinye ahụ ghara ifu ọhịa. Ihe anyị na-ekwu abụghị na Chineke nyere gị onyinye i ji amụ ihe n’ụlọ akwụkwọ. Ma, onyinye ndị ahụ i nwere dị iche n’onyinye e nyere ndị ọzọ. Ịga akwụkwọ nwere ike inyere gị aka ịmata onyinye ndị ị na-amabughị na i nwere. Ọ ga-enyekwara gị aka iji ha na-eme ihe bara uru.