Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!

Gịnị bụ ozi ọma si n’aka Chineke? Gịnị mere anyị ga-eji kwere ya? A zara ajụjụ ụfọdụ ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Baịbụl na broshọ a.

Otú Broshọ A Ga-esi Baara Gị Uru

Broshọ a ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl bụ́ Okwu Chineke na-ekwu. Gbaa mbọ chọta amaokwu ndị ahụ na Baịbụl gị.

ISI NKE 1

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.

ISI NKE 2

Ònye Bụ Chineke?

Chineke ò nwere aha? Ihe banyere anyị ọ̀ na-emetụ ya n’obi?

ISI NKE 3

Ozi Ọma Ahụ Ò Si n’Aka Chineke n’Eziokwu?

Olee otú anyị si mara na Baịbụl bụ Okwu Chineke?

ISI NKE 4

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Gụọ banyere ihe mere Jizọs ji nwụọ, ihe àjà mgbapụta pụtara, na ihe Jizọs na-eme ugbu a.

ISI NKE 5

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?

Baịbụl kwuru ihe mere Chineke ji kee ụwa, mgbe nsogbu ga-akwụsị, otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs na ndị ga-ebi na ya.

ISI NKE 6

Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Ga-adị Ndụ Ọzọ?

Gịnị na-eme ndị mmadụ ma ha nwụọ? Ànyị ga-ahụ ndị anyị nwụrụ anwụ ọzọ?

ISI NKE 7

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Onye bụ Eze Alaeze Chineke, gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ?

ISI NKE 8

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Olee otú ihe ọjọọ si malite, gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a? È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?

ISI NKE 9

Gịnị Ga-eme Ka Obi Na-adị Ezinụlọ Gị Ụtọ?

Jehova bụ onye obi ụtọ. Ọ chọrọ ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Gụọ ihe Baịbụl gwara ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna na ụmụaka.

ISI NKE 10

Olee Otú Ị Ga-esi Ama Ndị Na-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ?

Ọ̀ bụ naanị otu ezigbo okpukpe ka e nwere taa? Gụọ ihe ise eji ama ezigbo Ndị Kraịst.

ISI NKE 11

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.

ISI NKE 12

Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

Chọpụta ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile, otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere, na ihe anyị ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso.

ISI NKE 13

Gịnị Ga-eme Okpukpe Ndị E Nwere n’Ụwa A?

È nwere mgbe mmadụ niile ga na-efe Chineke?

ISI NKE 14

Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?

Baịbụl kwuru ihe mere Chineke ji nwee ndị na-efe ya, kwuokwa otú e si hazie ha.

ISI NKE 15

Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-amụkwu Gbasara Jehova?

Ọ bụrụ na ị na-amụ Okwu Chineke, olee uru ọ ga-abara ndị ọzọ? Olee ihe ùgwù ị ga-enwe ma ị na-amụ Okwu Chineke?