Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Comstock Images/Stockbyte via Getty Images

MKPỌSA PỤRỤ ICHE

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ndị Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Na-arụrụ Aka

Ihe Alaeze Chineke Ga-eme Gbasara Ndị Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Na-arụrụ Aka

 Ike ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụrụ aka agwụla ndị mmadụ, n’ihi ya, ha na-achọ ndị ọchịchị ha ga-atụkwasịli obi. Ihe e bipụtara n’afọ 2023 gbasara ihe a chọpụtara n’ụwa niile kwuru na ọ bụ ndị ọchịchị ka ndị mmadụ kacha ghara ịtụkwasị obi. a

 Baịbụl kwuru na e nwere otu ọchịchị nke a ga-atụkwasịli onye ọchịchị ya obi maka na ọ na-akwụwa aka ọtọ, ọ naghịkwa arụrụ aka. Ọchịchị ahụ bụ Alaeze Chineke, onye ga na-achị na ya bụkwa Jizọs Kraịst.​—Aịzaya 9:7.

 Ihe ndị Jizọs mere gosiri n’eziokwu na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ya n’obi. (Matiu 9:35, 36) Mgbe ọ ga-achịwa n’Alaeze Chineke, ọ ga-ekpere ndị niile nabatara ọchịchị ya ikpe ziri ezi, meekwa ka obi ruo ha ala.​—Abụ Ọma 72:​12-14.

a 2023 Edelman Trust Barometer Global Report.