Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ABỤ NKE 8

Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

Jehova Bụ Ebe Mgbaba Anyị

(Abụ Ọma 91)

  1. 1. Jehova n’echeb’anyị.

    Anyị gbakwuuru ya.

    Jehova n’ekpuchia-nyị.

    Ahapụkwala ya.

    Ọ g’agbachiteren-dị ya.

    Anyị maara n’ọ g’eme ya.

    Jehova n’echeb’anyị.

    Ọ n’emezukwa okwu ya.

  2. 2. Ọtụtụ puku g’ada.

    M’anyị g’akwụrụ chịm.

    Jehova g’azọpụta

    Ndị ezio-mume.

    K’anyị ghara ịtụ egwu.

    Ọ gagh’ekwe k’e bibi’anyị.

    Jehova n’echeb’anyị.

    Ọ g’ejin-ku ya kpuchi’anyị.

  3. 3. Jehova g’echeb’anyị

    K’ọnyà ghar’ịm’anyị.

    Anyị ma n’ọ g’edua-nyị

    N’ebe anyị n’aga.

    Ma n’ehihie ma n’abalị,

    Anyịa-gaghị atụ egwu.

    Jehova n’echeb’anyị.

    Ọ ga n’edua-nyị kw’ụbọchị.