Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nke 1—Na-elebara Ihe Ị Na-eri Anya

Nke 1—Na-elebara Ihe Ị Na-eri Anya

Nke 1​—Na-elebara Ihe Ị Na-eri Anya

“Na-eri nri. Erila oké nri. Na-erikarị akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi.” Mkpụrụ okwu ole na ole a ka Michael Pollan, bụ́ onye na-ede akwụkwọ, ji chịkọta ihe ndị a chọpụtara banyere nri na-edozi ahụ́. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

Na-eri ezigbo nri. Kama ịga zụwa nri ndị a gbara ná mkpọ, na-eri nri ndị a kọtara n’ala otú ndị mmadụ si eme kemgbe ụwa. A na-etinyekarị oké shuga, nnu, na mmanụ ná nri ndị a gbara ná mkpọ nakwa ná nri ndị a na-ere n’ụlọ nri. Ihe ndị a na-akpatakarịkwa ọrịa obi, ọrịa strok, ọrịa kansa na ọrịa ọjọọ ndị ọzọ. Kama ighe ihe ị chọrọ iri eghe, sie ya esie ma ọ bụ hụọ ya ahụọ. Gbalịa na-eji ihe ndị dị ka ụ́da na ụzịza na-esi nri, etinyekwala oké nnu ná nri. Anụ ọ bụla ị chọrọ iri, sie ya nke ọma; erikwala nri mebiri emebi.

Erila oké nri. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na n’ụwa niile, e nweziri ọtụtụ ndị buru ibu na ndị buru oké ibu. Ihe na-akpatakarịkwa ya bụ iri oké nri. Otu nnyocha e mere ná mba ụfọdụ dị n’Afrịka gosiri na “ụmụaka ndị buru oké ibu karịrị ndị nke erijughị afọ mere ka ha taa ahụ́.” Ụmụaka ndị buru oké ibu nwere ike ịrịa ọrịa ọjọọ, ndị dị ka ọrịa shuga, ma ugbu a ha dị obere nakwa ma ha too. Ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha ịghara iri oké nri ma ọ bụrụ na hanwa anaghị eri oké nri.

Na-erikarị akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi. Mmadụ kwesịrị ịna-eri ọtụtụ akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi karịa anụ na nri ndị na-adọrọ adọrọ n’ahụ́. Ná mba ebe ndị mmadụ na-erikarị anụ, ha kwesịrị ịna-erikarị azụ̀ n’ihi na ọ bụ ya na-aka edozi ahụ́. Wetulata aka n’otú i si eri nri ndị dị ka makaroni na spageti, n’ihi na e wepụla ọtụtụ ihe ndị na-enye ihe n’ahụ́ ná nri ndị ahụ. Erila nri ndị a sị na ha na-eme ka mmadụ ghara ibu ibu, n’ihi na ụdị nri ndị ahụ nwere ike ịkpatara gị ọrịa. Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka ka ha mụta ịna-eri nri ndị na-edozi ahụ́. Dị ka ihe atụ, kama inye nwa gị swiit ma ọ bụ ihe ndị e ghere eghe mgbe ọ chọrọ ihe ọ ga-eji megharịa ọnụ, nye ya mkpụrụ osisi ị sachasịrị nke ọma ma ọ bụ ihe ndị dị ka ahụekere.

Na-aṅụ nnukwu mmiri. Ma ndị toro eto ma ụmụaka kwesịrị ịna-aṅụ mmiri hiri nne kwa ụbọchị. Ha kwesịkwara ịna-aṅụkarị ihe ọṅụṅụ ndị e si ná mkpụrụ osisi nweta, nke a na-etinyeghị ihe na-atọ bịrịbịrị. Ọ dị mma ịṅụkwu ihe ndị a n’ụbọchị okpomọkụ dị nakwa mgbe ị na-eme ihe ọ bụla ga-eme ka ọsụsọ gbaa gị. Ihe ọṅụṅụ ndị ahụ na-enye aka agbari nri ngwa ngwa n’ahụ́, na-asachapụ mmiri ọjọọ ndị dị n’ahụ́, na-eme ka akpụkpọ ahụ́ dị mma n’anya, na-enyekwara mmadụ aka ka ọ ghara ibu oké ibu. Ha na-enye aka eme ka ahụ́ dị gị garagara nakwa ka ị dị mma ile anya. Ị ṅụwa mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ mmanya ọtọ bịrịbịrị, aṅụla ya nnukwu. Ọ bụrụ na ị na-aṅụ otu karama mmanya ọtọ bịrịbịrị kwa ụbọchị, n’ime otu afọ, ị ga-ebu ibu karịa ka i kwesịrị.

Ná mba ụfọdụ, ọ na-esi ike inweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ, a hụ ya ahụ, ọ na-adị oké ọnụ. Ma ịṅụ ezigbo mmiri dị ezigbo mkpa. E kwesịrị isi mmiri na-adịghị ọcha n’ọkụ ma ọ bụ tinye ya ọgwụ ga-eme ka ọ dị mma ọṅụṅụ tupu a ṅụọ ya. E kwuola na ndị mmiri na-adịghị ọcha na-egbu karịrị ndị ala ọma jijiji ma ọ bụ agha na-egbu; mmiri na-adịghị ọcha na-egbukwa puku ụmụaka anọ kwa ụbọchị. Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru na e kwesịrị inye ụmụ a mụrụ ọhụrụ naanị mmiri ara ruo ọnwa isii. Ha ruzie ọnwa isii, e nweziri ike inyewe ha nri ndị ọzọ ma ka na-enyekwa ha mmiri ara, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, ruo afọ abụọ.