Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OBODO NA NDỊ BI NA YA

Mgbe M Gara Kameruun

Mgbe M Gara Kameruun

OYIRI ka ọ̀ bụ ndị akakpọ bucha ndị niile bi na Kameruun ụzọ biri ebe ahụ. Ma, ndị Pọchụgal batara n’obodo ahụ ihe dị ka narị afọ ise gara aga. Mgbe narị afọ ụfọdụ gara, ndị Fulani gara biri n’ebe ugwu ya. Taa, e kee ndị Kameruun ụzọ iri, ụzọ anọ sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ụzọ abụọ bụ ndị alakụba, ebe ụzọ anọ ndị nke ọzọ bụ ndị ọgọ mmụọ.

Ihe a bụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara n’asụsụ Basa, bụ́ nke a na-asụ na Kameruun. Ha na-eji ya akụziri ndị mmadụ Baịbụl

Ndị bi n’ime ime obodo ndị dị na Kameruun anaghị eji ile ọbịa egwu egwu. Ọ na-abụ mmadụ bịa na nke ha, ha kelechaa ya, ha akpọbata ya ụlọ, kunye ya mmiri ọṅụṅụ, nyekwa ya nri. Ọ bụrụ na mmadụ ajụ ka e meere ya ụdị ihe a, onye ọ bịara na nke ya na-ewere ya na ọ kparịrị ya. Ma, ọ bụrụ na o kwe ka e lee ya ọbịa, ọ pụtara na obi dị ya ụtọ.

Ị gaa na nke onye Kameruun, ị ga-ebu ụzọ kelee ndị niile nọ ebe ahụ ma jụọ ha otú ha mere tupu i kwuwe ihe mere i ji bịa. A na-ajụdị ha otú anụ ụlọ ha mere. Onye Kameruun aha ya bụ Joseph kwuru, sị: “Onye bịara na nke gị chọwa ịla, ị gaghị asị ya naanị gaa nke ọma. Ị ga-aga dupụ ya, gị na ya ga na-akparịtakwa ụka n’ụzọ. I duruo ya ebe ị chọrọ, gị asị ya gaa nke ọma. Obi agaghị adị ya mma ma ọ bụrụ na ị gaghị dupụ ya.”

Ihe a bụ Osimiri Sanaga. E nwere ike iji ihe ọ bụla rụọ ọtụtụ ụgbọ epeepe ndị na-agba na ya

A bịa iri nri, enyi na enyi nwere ike iri nri n’otu efere. Mgbe ụfọdụ, ha na-ejidị aka nkịtị eri ya. Ha na-eji ihe a ha na-eme egosi na ha dị n’otu. Ọ bụrụ na enyi na enyi esee okwu ma mechaa kpezie, ha abụọ nwere ike irikọ nri. Ihe mere ha ji eme ya bụ ka ha gosi na ha ekpeziela.

Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara magazin a. Ha nwere ihe karịrị narị ọgbakọ atọ na Kameruun. Ha na-amụkwara ihe dị ka iri puku mmadụ isii na puku ise Baịbụl n’obodo a