Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU TETA! A | BAỊBỤL Ọ̀ KA BARA URU?

Na-ejide Onwe Gị

Na-ejide Onwe Gị

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.”Ilu 29:11.

“Ọ dị m nnọọ ka a napụtara m n’aka ọnwụ”

URU Ọ BARA: Uru onye na-anaghị ewe iwe ọkụ na-erite karịrị akarị. Ma ó nweghị ihe ọzọ, onye na-anaghị ewe iwe ọkụ anaghị arịakarị ọrịa. Baịbụl kwuru, sị: “Obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” O kwukwara na “obi nke na-aṅụrị ọṅụ bara uru dị ka ihe na-agwọ ọrịa.” (Ilu 14:30; 17:22) Ma, nchọpụta ndị e merela na-egosi na ndị na-ewe iwe ọkụ na ndị na-ebu iwe n’obi na-arịakarị ọrịa obi. E nwekwara uru ndị ọzọ onye na-anaghị ewe iwe ọkụ na-erite.

Otu nwoke karịrịla afọ iri atọ aha ya bụ Cassius kwuru, sị: “Abụ m onye iwe ọkụ, mụ na ndị mmadụ na-esekarị okwu, m na-alụkarịkwa ọgụ. O nweghị ihe m bụ n’anya ndị mmadụ. Ma, ihe gbanwere mgbe m malitere ime ihe Baịbụl kwuru. M mụtara ịna-ejide onwe m, ịdị umeala n’obi, na ịgbaghara ndị ọzọ. A sị na mụ agbanweghị, m gaara aga mkpọrọ. Ọ dị m nnọọ ka a napụtara m n’aka ọnwụ.”

Cassius mụtara ịna-ejide onwe ya na ịgbaghara ndị ọzọ