Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE GA-ENYERE NDỊ NA-ERU UJU AKA

Ihe Ga-akacha Enyere Onye Na-eru Uju Aka

Ihe Ga-akacha Enyere Onye Na-eru Uju Aka

NA NSO NSO A, ỌTỤTỤ NDỊ EDEELA ỌTỤTỤ IHE GBASARA OTÚ NDỊ ỌNWỤ MMADỤ GBAWARA OBI GA-ESI EDI YA. Ma dị ka anyị kwuburu, ndụmọdụ ọ bụla kacha mma ha nyere na-ekwekọ n’ihe Baịbụl kwuru. Nke a gosịrị na ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl na-aba uru mgbe niile. Ọ bụghị naanị na Baịbụl na-enye anyị ndụmọdụ na-abara anyị uru, kamakwa, ọ na-agwa anyị ihe ndị anyị na-enweghị ike ịgụta ebe ọzọ, nke nwere ike ịkasị onye na-eru uju obi.

  • Baịbụl mere ka obi sie anyị ike na ndị nwụnahụrụ anyị anaghị ata ahụhụ

    Ekliziastis 9:5 kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.” Baịbụl kwukwara na ha “na-akwụsị iche echiche.” (Abụ Ọma 146:4) Ọ bụkwa ihe a ka Baịbụl na-ekwu mgbe o ji ọnwụ tụnyere ụra.—Jọn 11:11.

  • Ikwetasi ike na Chineke hụrụ anyị n’anya na-akasi anyị obi

    Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 34:15, sị: “Anya Jehova a dị n’ebe ndị ezi omume nọ, ntị ya na-anụkwa ákwá ha na-ebe ka e nyere ha aka.” Ịgwa Chineke otú obi dị anyị na-abara anyị uru karịa nkasi obi ọ bụla anyị na-enweta ma anyị gwa ya onye ọzọ ma ọ bụ mee ihe ọ bụla ọzọ iji die ihe mere anyị. Ọ na-eme ka anyị na Onye kere anyị dịrị ná mma, bụ́kwanụ onye ga-eji ike ya kasie anyị obi.

  • Anyị na-atụ anya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

    Chegodị otú ihe ga-adị n’ọdịnihu mgbe a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha adịrị ndụ n’ụwa a. Baịbụl kwuru banyere otú oge ahụ ga-adị ugboro ugboro. O kwuru na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị [anyị] n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị.”—Mkpughe 21:3, 4.

Ndị kweere na Jehova bụ́ Chineke, onye nwe Baịbụl, na-enweta nkasi obi n’aka ya n’ihi na ha kweere na ọ ga-emezu nkwa o kwere ịkpọlite ndị ha nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, otu nwaanyị aha ya bụ Ann, onye ya na di ya lụrụ afọ iri isii na ise tupu di ya anwụọ, kwuru, sị: “Baịbụl mere ka obi sie m ike na ndị nwụnahụrụ anyị anaghị ata ahụhụ nakwa na Chineke ga-akpọlite ndị niile nọ ná ncheta ya. Ọnwụ di m bụ ihe ọjọọ kachanụ metụrụla m. Mgbe ọ bụla m chetara ya, nkwa ndị a Chineke kwere na-agbata m n’obi, ha na-enyekwara m aka idi ya.”

Tiina anyị kọrọ banyere ya ná mbido akwụkwọ a kwuru, sị: “Kemgbe di m nwụrụ, achọpụtala m na Chineke na-enyere m aka idi ya. N’oge ahụ ọ gbajuru dọrọ, m hụrụ otú Jehova si nyere m aka. Ekwetasikwara m ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ otú ahụ Baịbụl kwuru. Ọ na-enyere m aka idi ọnwụ Timo di m, ruo mgbe m ga-ahụ ya ọzọ.”

Ọtụtụ nde mmadụ ndị kweere na ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu kwetara n’ihe a ha kwuru. Ọ bụrụ na i chere na ihe Baịbụl kwuru agaghị eme ma ọ bụkwanụ na ọ bụ nrọ efu, ọ dịzi gị n’aka ịchọpụta ma ihe ndị Baịbụl kwuru ọ̀ na-aba uru nakwa ma hà bụ eziokwu. I nwere ike ịchọpụta na ọ bụ Baịbụl ga-akacha enyere onye na-eru uju aka.

MỤTAKWUO BANYERE OLILEANYA DỊỊRỊ NDỊ NWỤRỤ ANWỤ

I nwere ike ile vidio ndị kwuru gbasara ya na jw.org/ig

Baịbụl kwuru na oge na-abịa mgbe anyị ga-anabata ndị nwụnahụrụ anyị

GỊNỊ NA-EME NDỊ MMADỤ MA HA NWỤỌ?

Gịnị na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ? Ihe Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi, na-emekwa ka obi sie anyị ike

Gaa n’ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịa ebe e dere VIDIO (Vidio: Pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI)

Ị̀ GA-ACHỌ ỊNỤ OZI ỌMA

Olee ebe anyị ga-anụ ozi ọma n’ụwa a akụkọ ọjọọ juru?

Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịzie ebe e dere UDO NA OBI ỤTỌ

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.