Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

N’ỤWA A NSOGBU JURU

3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya

3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Otú nsogbu si akakwu njọ n’ụwa na-eme ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha, ya emezie ka ha kwụsị ịna-ahụ ndị ha na ha dị ná mma n’anya. Ha nwere ike ime ya n’amaghị ụma.

  • Ndị mmadụ na-ahapụ ndị enyi ha gaa nọrọ naanị ha.

  • Di na nwunye na-esekarị okwu karịa otú ha na-emebu.

  • Ndị mụrụ ụmụ anaghị elebachara ihe ndị na-enye ụmụ ha nsogbu n’obi anya, ụfọdụ anaghị elebatụdịrị ha anya.

Ihe I Kwesịrị Ịma

  • Inwe ezigbo ndị enyi na-eme ka ahụ́ sie anyị ike, na-emekwa ka obi ruo anyị ala, karịchaa, n’oge nsogbu.

  • Nsogbu juru n’ụwa nwere ike ikowe unu obi n’elu ma kpaghasịa ezinụlọ unu otú unu na-atụghị anya ya.

  • Akụkọ ọjọọ ndị a na-agbasa na tivii ma ọ bụ na redio nwere ike imenye ụmụ gị ụjọ karịa otú i chere.

Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A

Baịbụl sịrị: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”​—Ilu 17:17.

Ndị enyi anyị nwere ike inyere anyị aka ma nye anyị ezigbo ndụmọdụ. Naanị ịmara na e nwere ndị hụrụ gị n’anya nwere ike ime ka i kpebisikwuo ike na ị ga-edi nsogbu ndị bịaara gị.