Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ ỌNỤ | RAJESH KALARIA

Onye Gụrụ Gbasara Ụbụrụ Mmadu Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

Onye Gụrụ Gbasara Ụbụrụ Mmadu Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke

PRỌFESỌ Rajesh Kalaria bụ ọkachamara na-arụ ọrụ na Mahadum Niukastụl, dị n’Ịngland. O ji ihe karịrị afọ iri anọ mụọ gbasara ụbụrụ mmadụ. O kweburu na nkụzi evolushọn. Ma, o mechara gbanwee echiche ya. Anyị gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara ọrụ ya na ihe mere o ji gbanwee okwukwe ya.

Biko, kọtụrụ anyị gbasara okpukpe ndị mụrụ gị.

Papa m na mama m bụ ndị India. Mana, a mụrụ mama m na Uganda. Ha na-ekpe okpukpe Hindu. Ọ bụ mụnwa bụ nwa nke abụọ n’ime ụmụ nwoke atọ ha mụrụ. Ezinụlọ anyị biri na Nairobi, Kenya. Ọtụtụ ndị agbata obi anyị n’ebe ahụ bụ ndị na-ekpe okpukpe Hindu.

Olee ihe mere i ji nwee mmasị na sayensị?

Ihe gbasara ụmụ anụmanụ na-amasịkarị m. Ọ na-atọkwa m ụtọ iso ndị enyi m gaa ịrị ugwu na ịga nọrọ n’ime ọhịa mgbe ụfọdụ iji nwee ike ịhụ ụmụ anụmanụ. Ná mbụ, m chọburu ịbụ dọkịta ụmụ anụmanụ. Ma, mgbe m gachara kọleji na Nairobi, m gara gụọ gbasara ọrịa dị iche iche na Mahadum Lọndọn, dị n’Ịngland. Mgbe e mechara, m ghọrọ ọkachamara n’ime nchọnchọ banyere ụbụrụ mmadụ.

Ihe ndị ahụ ị mụrụ ò mere ka ị gbanwee okwukwe gị?

Ee. Ka m na-amụkwu sayensị ka ọ na-esikwuru m ike ikweta n’ihe ndị m kweburu na Hindu, dị ka ife ụmụ anụmanụ na iji ihe oyiyi efe ofufe.

Gịnị mere i ji kwere ná nkụzi evolushọn?

Mgbe m dị obere, ọtụtụ ndị nọ n’ebe m toro kweere na ọ bụ n’Afrịka ka ihe ndị na-akụzi evolushọn kwuru gbasara mmadụ bidoro. Na mahadum, ndị nkụzi anyị mere ka anyị niile bụ́ ụmụ akwụkwọ kweta na ndị sayensị niile a ma ama kweere n’evolushọn.

Gịnị mere i ji mechaa gbanwee obi gị n’ihe gbasara otú ndụ si malite?

Anọọla m ọtụtụ afọ na-amụ gbasara bayọlọji na otú ahụ́ ụmụ mmadụ, ụmụ anụmanụ na osisi dị, tupu otu nwa akwụkwọ ibe m abịa kọọrọ m ihe ndị Ndịàmà Jehova kụziiri ya na Baịbụl. Ihe ọ kọọrọ m mere ka m chọọ ịmatakwu gbasara ha. N’ihi ya, mgbe Ndịàmà Jehova nwere mgbakọ n’ụlọ ezumeezu dị na kọleji anyị dị na Nairobi, m gara. Ka oge na-aga, Ndịàmà Jehova abụọ ọrụ ha bụ ikwusa ozi ọma ná mba dị iche iche ji Baịbụl kọwaara m ụfọdụ ihe. M chọpụtara na ha kweere na e nwere Onye kere ihe niile, ga-agwọtali nsogbu ihe a kpọrọ mmadụ. Ihe a ha kwuru abụghị akụkọ ifo. Ọ masịrị m.

Ihe ndị ị mụtara gbasara ahụ́ ike ò mere ka ị ghara ikweta na e kere ihe niile eke?

Mba. Kama nke ahụ, ka m na-amụkwu gbasara ha ka m na-amata na e leziri anya mee ha. Ikwu na ihe ndị dị ndụ dị ịtụnanya otú ahụ nọkatara dịrị, bụ n’uche m, okwu n’enweghị isi na ọdụ.

Ị nwere ike inyetụ anyị ihe atụ?

Kemgbe afọ 1971 ka m nọ na-amụ gbasara ụbụrụ mmadụ. Otú o si arụ ọrụ ka na-atụ m n’anya ruo taa. Ụbụrụ na-enyere anyị aka iche echiche na icheta ihe. Ọ na-achịkwa ihe niile na-eme n’ahụ́ anyị. Ọ bụkwa ụbụrụ na-akọwara anyị ihe niile na-eme anyị n’ime ahụ́ na ihe na-eme gburugburu ahụ́ anyị.

Ihe mere ụbụrụ ji na-arụ ọrụ ndị dị ịtụnanya bụ n’ihi ọtụtụ kemikal na ọtụtụ irighiri akwara juru n’ime ya na-enyere ya aka izirịta ozi. Ụbụrụ mmadụ nwere ọtụtụ ijeri akwara ndị dị otú ahụ. Akwara ndị ahụ na-esi n’ụdị ụmụ irighiri akwara ndị ọzọ a kpọrọ azọn na-ezirịta ozi n’etiti ibe ha. Otu irighiri akwara nwere ike iji eriri ndị si ya n’ahụ́ pụta jikọta onwe ya na akwara ọzọ ihe dị ka ọtụtụ puku ugboro. Ihe a meziri ka ụdị njikọ ndị a dị n’ụbụrụ bụrụ agụta agụta. Ma, ihe dị ịtụnanya bụ na n’agbanyeghị otú njikọ ndị a si jupụta ebe niile ma na-agbagwoju anya, a haziri ha nke ọma, ha ana-arụkwa ọrụ ọfụma.

Biko, mee ka o dokwuo anya.

Ebe ị ga-akacha ahụ ụdị nhazi ụmụ irighiri akwara ndị a nwere bụ n’ahụ́ nwa nọ n’afọ nakwa n’ahụ́ nwa a mụrụ ọhụrụ. Ụmụ irighiri akwara ndị a na-eme ka eriri si n’ahụ́ ha pụta gaa jikọta ha na irighiri akwara ndị ọzọ. Ha nwekwara ike iji eriri ahụ kegide n’akụkụ irighiri akwara ha na ya chọrọ ijikọta.

Ọ bụrụ na eriri ahụ esi n’otu irighiri akwara pụta gawa n’irighiri akwara ọzọ, o nwere kemikal ụfọdụ na-enyere ya aka ịmata ebe ọ na-aga. Kemikal ndị ahụ na-enwe ike ime ka eriri ahụ kwụsị, gawa, ma ọ bụ tụgharịa n’ebe ọ dị mkpa ka ha mee otú ahụ, ruo mgbe ha ruru ebe ha na-aga. E wezụga kemikal ndị ahụ, eriri ndị ahụ agaghị amata ebe ha na-aga. Otú ihe niile si na-aga n’anya ya n’anya ya gosiri nhazi pụrụ iche ndị e mere ebe ahụ.

N’agbanyeghị ihe ndị a niile a chọpụtarala gbasara otú ụbụrụ anyị si arụ ọrụ, otú o si enyere anyị aka iche echiche na icheta ihe, ihe anyị ma gbasara ụbụrụ anyị ka dịkwa ezigbo ntakịrị. Ihe niile gbasara otú ụbụrụ anyị si arụ ọrụ mere ka m kwetasie ike na ọ ga-enwerịrị onye haziri ihe ndị a. O nwekwanụghị otú a ga-esi jiri amamihe onye ahụ tụnyere amamihe anyị.

Olee ihe mere i ji ghọọ Onyeàmà Jehova?

Ndịàmà Jehova gosiri m ihe ndị mere ka m kweta na Baịbụl bụ Okwu Chineke. Dị ka ihe atụ, Baịbụl abụghị akwụkwọ sayensị, ma n’ebe ọ bụla o kwuru ihe gbasara sayensị, ihe o kwuru na-abụ eziokwu. Amụma ndị o buru na-emezukwa otú ahụ o si buo ya. Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru na-ebi ndụ dị mma. Ọ gbanwere ndụ nke mụnwa. Kemgbe afọ 1973 m ghọrọ Onyeàmà Jehova, ọ bụ Baịbụl na-eduzi m n’ihe niile m na-eme. Ọ bụ ya mere m ji na-enwe obi ụtọ, ma na-ebikwa ndụ nwere isi.