Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

  • Ka e were ya na unu na-aga ịkwaga ebe ọzọ n’ihi ọrụ papa gị.

  • Ezigbo enyi gị na-akwaga ebe dị anya.

  • Nwanne gị nwaanyị unu na ya bi n’ụlọ na-ala n’ụlọ di ya.

Olee ihe ị ga-eme n’ọnọdụ nke ọ bụla?

O nwekarịghị ihe oké ifufe na-eme osisi ọ bụla na-ekwe ka ifufe na-efegharị ya. N’otu aka ahụ, i nwere ike ịmụta otú ị ga-esi anabata ọnọdụ ọ bụla ị na-agaghị agbanweli. Tupu anyị ekwuwe ihe mmadụ ga-eme ma ihe gbanweere ya, ka anyị burugodị ụzọ tụlee ihe ụfọdụ anyị kwesịrị ịma gbasara ihe ịgbanwere mmadụ.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

O nwere ike ịdabara onye ọ bụla. Baịbụl kwuru hoo haa na ‘oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị mmadụ niile.’ (Ekliziastis 9:11) Ma, ihe agbanwereghị gị taa, o nwere ike ịgbanwere gị echi. Ma, ọ bụghị ihe niile mmadụ na-atụghị anya ya bụ ihe ọjọọ. O nwedịrị ihe na-eyi ihe ọjọọ ma ọ dabara mmadụ, ka oge na-aga ya abaara onye ahụ uru. Ọtụtụ ndị na-eme nke ọma n’ihe ha na-emekarị kwa ụbọchị, ihe gbanweere ha, ọ na-akpa ha aka ọjọọ.

Ọ na-akacha akpa ndị na-eto eto aka ọjọọ. N’ihi gịnị? Otu nwa okorobịa aha ya bụ Okezie * kwuru na ọ naghị adịrị onye na-eto eto ahụ́ ya ka na-agbanwe agbanwe mfe ma ihe gbanweere ya.

Ihe ọzọ bụ na onye na-eto eto enwebeghị ihe ọ hụrụ ná ndụ. Ihe gbanweere ya, ọ gaghị ama ihe ọ ga-eme eme. Ma, ọ bụrụ onye torola eto, o nwere ike icheta ihe o mere mgbe ụdị ihe ahụ meburu ya.

Ị ga-edili ya. Mmadụ ga-edili ihe ọ bụla gbanwere ná ndụ ya. Ihe ga-eme ka ihe gbanweere mmadụ mara ya ahụ́ abụghị naanị onye ahụ idi ihe ahụ. O kwesịkwara ịgbalị chọpụta otú o nwere ike isi jiri ohere ahụ mepụta ihe bara uru. Ọ ga-ara ahụ́ onye na-eto eto ahụ́ ya nabatara ihe gbanweere ya aṅụwa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ oké mmanya.

IHE I NWERE IKE IME

Nabata ya. O doro anya na ị chọghị ka ihe ọ bụla gbanweere gị otú ị chọrọ ka ndụ gị dịrị. Ma, ndị enyi gị nwere ike ịkwaga ebe ọzọ ma ọ bụkwanụ lụọ di ma ọ bụ nwunye. Nwanne gị nwere ike ịga biri nke ya. Ihe ụfọdụ nwere ike ime ka unu kwaga ebe ọzọ, gị ahapụ ndị enyi gị na ebe marala gị ahụ́. Ọ ka mma na ị nabatara ya otú ahụ, karịa ikwe ka ọ na-echu gị ụra.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 7:10.

Lekwasị anya n’ihu. Onye na-eche naanị gbasara otú ihe dịbuuru ya yiri onye na-anya ụgbọala nke anya ya dị naanị n’enyo na-egosi ya ihe ndị dị n’azụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye na-anya ụgbọala kwesịrị ịna-eletụ anya n’enyo ahụ, ma, o kwesịrị ịka na-ele anya n’ihu. N’otu aka ahụ, onye ihe gbanweere kwesịrị ilekwasị anya n’otú ihe ga-emecha dị n’ọdịnihu. (Ilu 4:25) O nwere ike ịjụ onwe ya, sị: Olee ihe ndị m nwere ike imepụta n’ime otu ọnwa ma ọ bụ n’ime ọnwa isii na-abịa abịa?

Lekwasị anya n’ihe ọma dị na ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ifeoma kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ die ihe gbanweere ya bụ otú onye ahụ si were ihe ahụ. O kwukwara na mmadụ kwesịrị ịchọpụta otú ọ ga-esi jiri ọnọdụ ọhụrụ ahụ mepụta ihe bara uru. Ì nwere ike ikwu otu ihe ị ga-ejili ụdị oge ahụ emepụta?—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ekliziastis 6:9.

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Ugomma kwuru ihe mere ya mgbe ndị enyi ya niile kwagara ebe ọzọ. O rubeghị afọ iri abụọ mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Owu nọ na-ama m, ya adị m ka ya bụrụ na mụ na ha ka nọ. Ma, ọ bụ mgbe ahụ ka m ghọtawara ihe ụwa na-akọ. Ọ bịara doo m anya na ihe ga-enyere mmadụ aka ịna-amụta ihe bụ ihe ịgbanwere onye ahụ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m chọpụtara na m nwere ike imete ndị ọzọ mụ na ha ka nọ enyi.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 27:10.

Onye na-eche naanị gbasara otú ihe dịbuuru ya yiri onye na-anya ụgbọala nke anya ya dị naanị n’enyo na-egosi ya ihe ndị dị n’azụ

Na-emere ndị ọzọ ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Ndị Filipaị 2:4) Otu ihe ga-enyere gị aka ma ihe gbanweere gị bụ inyere ndị ọzọ aka. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asaa aha ya bụ Njideka kwuru, sị: “Ka m na-eto, m chọpụtara na obi na-adị m ụtọ ma m nyere onye ọ dị ka ọ dị m aka, ma ọ bụkwanụ onye ọnọdụ ya ka nke m njọ.”

^ para. 11 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.