Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 3 n'Afọ 2021 | Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Gịnị ka ị ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu? Isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche a ga-akọwa ihe ọtụtụ ndị na-eme ka ihe dịrị ha ná mma. Ha ga-enyekwara gị aka ịmata ihe ọ bụ naanị ya ga-eme ka ị mata ihe ị ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma.

 

Onye Ọ Bụla Chọrọ Ka Ihe Dịrị Ya ná Mma

Ọ bụrụ na ihe a na-atụghị anya ha emee ná mberede ma ghasaa ndụ ndị mmadụ, olee ihe ga-enyere gị aka ka ị mata ihe ị ga-eme?

Gịnị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Ọtụtụ ndị na-eme feng shui na ndị na-eji kpakpando akọ ihe ga-eme n’ọdịnihu, na ndị na-efe ndị nna nna hà nwụrụ anwụ ofufe, na ndị kweere n’ịlọ ụwa chere na ọ bụ ihe ndị a ga-eme ka ihe dịrị ha ná mma n’ọdịnihu.

Inwe Ego na Ịgụ Oké Akwụkwọ Hà Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Ọtụtụ ndị achọpụtala na n’agbanyeghị na ha gụrụ oké akwụkwọ, nweekwa ego, ihe anaghị agachara ha otú ha tụrụ anya ya.

Ịbụ Ezigbo Mmadụ Ọ̀ Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Ịbụ ezigbo mmadụ dị mma, ma ọ bụghị naanị ya ga-eme ka ihe dịrị mmadụ ná mma.

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịmata Ihe Ị Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu?

Anyị chọọ ikpebi ihe anyị ga-eme, anyị na-agakarị ka onye tọrọ anyị, kakwa anyị mara ihe, nyere anyị aka. Ọ bụkwa ihe anyị kwesịrị ime ma anyị chọọ ịmata ihe ga-enyere anyị aka ka ihe dịrị anyị ná mma n’ọdịnihu.

Ihe Ga-eme Ka Ihe Dịrị Gị ná Mma n’Ọdịnihu

Gịnị ka i chere ị ga-eme ka ihe dịrị gị ná mma n’ọdịnihu?