Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2022 | Ihe Ga-eme Ka Ịkpọasị Kwụsị

Ọtụtụ ndị n’ụwa taa kpọrọ ibe ha asị. E nwere ọtụtụ ihe ndị mmadụ na-eme na-egosi na ha kpọrọ ndị ọzọ asị. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-akpa ókè, ndị na-amaja ibe ha, ndị na-akparị ibe ha, nakwa ndị na-eti ibe ha ihe. È nwere mgbe ịkpọasị ga-akwụsị? Isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ka anyị kwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị. E kwukwara na Chineke kwere nkwa ime ka ịkpọasị kwụsị kpamkpam.

 

Anyị Ga-akwụsịli Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

Gịnị mere ndị mmadụ ji akpọ ibe ha asị? Olee ihe ha na-eme iji gosi na ha kpọrọ ndị ọzọ asị?

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Ji Akpọ Ibe Ha Asị?

Baịbụl kwuru isi ihe mere ndị mmadụ ji akpọ ibe ha asị, ihe mere ọ naghị esiri ha ike ịkpọ ndị ọzọ asị, nakwa ihe mere ịkpọasị ji arị ibe ya elu taa.

Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịkpọ Ndị Ọzọ Asị

Ihe Baịbụl kwuru emeela ka ọtụtụ ndị gbanwee biwe ndụ dị mma.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

1 | Elela Mmadụ Anya n’Ihu

Ị ga-akwụsị ịna-ele ndị mmadụ anya ọjọọ ma ị na-eme ka Chineke ma ghara ịna-ele mmadụ anya n’ihu.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

2 | Emegwarala Ihe E Mere Gị

Ị tụkwasị Chineke obi na ọ ga-edozi nsogbu niile n’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-emegwara.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

3 | Wepụ Ịkpọasị n’Obi Gị

Okwu Chineke ga-enyeliri gị aka ịkwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị n’obi gị.

IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊKPỌ NDỊ ỌZỌ ASỊ

4 | Chineke Ga-enyere Gị Aka Ịkwụsị Ịkpọ Ndị Mmadụ Asị

Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere gị aka ịmụta àgwà ndị ga-eme ka ị kwụsị ịkpọ ndị mmadụ asị.

Mgbe Ịkpọasị Ga-akwụsị Kpamkpam

Olee ihe ga-eme ka ịkpọasị kwụsị kpamkpam?

Ndị A Kpọrọ Asị Juru Ebe Niile

Gịnị ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ịkpọ ibe ha asị? N’ụwa taa, ọtụtụ ndị akwụsịla ịkpọ ndị ọzọ asị. Ịkpọasị ga-emechakwa kwụsị kpamkpam.