Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olileanya n’Ebe Olileanya Na-adịghị—Mgbakọ E Nwere n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

Olileanya n’Ebe Olileanya Na-adịghị—Mgbakọ E Nwere n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

Olileanya n’Ebe Olileanya Na-adịghị—Mgbakọ E Nwere n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ

OGIGE ndị gbara ọsọ ndụ nke Kakuma dị n’ebe ugwu Kenya, na nso ókè Kenya na Sudan. Ihe karịrị iri puku mmadụ asatọ na puku isii bi na ya. Ala ebe ahụ kpọrọ nkụ, ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ya n’ehihie na-erukwa degrees Celsius 50. Ndị bi n’ogige dị iche iche nke ndị gbara ọsọ ndụ na-emesorịtakwa ibe ha ihe ike mgbe mgbe. Nye ọtụtụ ndị, ogige ahụ bụ ebe olileanya na-adịghị. Otú ọ dị, ụfọdụ nwere olileanya.

Ọtụtụ Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsa ozi ọma Alaeze ahụ, so ná ndị ahụ gbara ọsọ ndụ. Ha bụ akụkụ nke obere ọgbakọ dị na Lodwar, nke ji ihe dị ka otu narị kilomita na iri abụọ dị anya site n’ebe ndịda. Ọ ga-ewe awa asatọ iji nyara ụgbọala gaa n’ọgbakọ ọzọ kasị dịrị ya nso.

Ebe ọ bụ na ndị ahụ gbara ọsọ ndụ enwereghị onwe ha isi n’ogige ahụ pụọ, ọtụtụ n’ime ha enweghị ike ịga mgbakọ ukwu na nke nta nke Ndịàmà Jehova. N’ihi nke a, e mere ndokwa ka e nwee ụbọchị mgbakọ pụrụ iche n’ogige ahụ.

Ime Njem Gaa n’Ebe Ugwu

Iji kwado mgbakọ ahụ, Ndịàmà 15 si n’obodo Eldoret, nke dị narị kilomita anọ na iri asatọ site n’ebe ndịda nke ogige ahụ, wepụtara onwe ha ime njem ahụ na-agwụ ike gaa n’ebe ugwu ahụ kpọrọ nkụ, ha na otu onye a na-amụrụ Bible nke wepụtara obere bọs ya ma kpọta ọkwọ ụgbọala ya. Ọchịchọ ha sitere n’obi bụ ịgba ụmụnna ha ume na iwusi ha ike.

Njem ahụ malitere n’otu isi ụtụtụ oyi na-atụ n’ebe bụ́ ugwu ugwu nke dị n’ebe ọdịda anyanwụ Kenya. Ụzọ ahụ na-adịghị mma gbagoro ugwu ebe e nwere ugbo na oké ọhịa ma kpọdazie banye n’ọzara na-ekpo ọkụ nke ụmụ obere osisi dị na ya. Ìgwè ewu na kamel na-ata ahịhịa n’ala ahụ kpọrọ nkụ. Ndị ebe ahụ nọ na-agafe, ha jiri ejiji ọdịnala ha, ọtụtụ bu okpiri, ụta na akụ́. Mgbe Ndịàmà ahụ mesịrị njem ruo awa 11, ha ruru Lodwar, bụ́ obodo na-ekpo ọkụ nke jupụtara n’uzuzu, na nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri puku mmadụ abụọ bi na ya. Mgbe Ndịàmà ha gara na nke ha nabatasịrị ha n’ụzọ na-ekpo ọkụ, ndị njem ahụ gara izurutụ ike ka ha wee nwee ike ịkwadebe maka ngwụsị izu nke jupụtara nnọọ n’ihe omume.

N’ụtụtụ echi ya, ndị ọbịa ahụ gawara ikiri ebe ụfọdụ n’ógbè ahụ. Ha ga-agarịrị ikiri Ọdọ Mmiri Turkana, bụ́ ọdọ mmiri kasịnụ e nwere na Kenya. Ọnụ ọgụgụ kasịnụ nke agụ iyi e nwere n’ụwa nile bi n’ọdọ mmiri ahụ nke ịkpa dị ọtụtụ kilomita gbara gburugburu. Mmiri nnu ahụ na-enyere mmadụ ole na ole bi n’akụkụ ya aka. Ha nwere obi ụtọ ná mgbede ụbọchị ahụ n’ihi na ha jiri ya gaa Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi n’ọgbakọ dị n’ógbè ahụ. Ọgbakọ ahụ nwere ọmarịcha Ụlọ Nzukọ Alaeze nke e wuru na 2003 site ná ndokwa usoro owuwu ihe nke Ndịàmà mere maka mba ndị nwere ihe onwunwe dị nta.

Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche

E wepụtara ụbọchị Sunday ịbụ ụbọchị mgbakọ ahụ pụrụ iche. E nyere Ọgbakọ Lodwar na ụmụnna ahụ si esi bịa ikike ịbanye n’ogige ahụ n’elekere asatọ nke ụtụtụ, n’ihi ya, Ndịàmà ahụ chọsiri ike ịmalite ngwa ngwa. Ụzọ ahụ gaara banye n’ala ihe na-adịghị ruo n’ókè Kenya na Sudan. Ugwu ndị ọnụ ha pịrị apị dị n’akụkụ ụzọ ahụ. Anyị malitere ịhụ obodo nta bụ́ Kakuma. Mmiri anọwo na-ezo, idei mmiri dọkwa n’ebe ụfọdụ n’ụzọ a na-eteghị ete e si abanye n’ogige ahụ. E ji ájá ụrọ rụọ ihe ka ọtụtụ n’ụlọ ndị e nwere ebe ahụ ma jiri gbamgbam ma ọ bụ tapolin kpuchie elu ha. Ìgwè dị iche iche nke ndị Etiopia, Somalia, Sudan na ndị ọzọ, ndị nke ọ bụla bi n’akụkụ nke ha. Ndị ahụ gbara ọsọ ndụ ji obi ụtọ nabata ndị njem ahụ.

E mere mgbakọ ahụ n’ebe a na-azụ ndị mmadụ. Ihe ndị e sere ná mgbidi ụlọ ahụ na-egosi ihe ndị na-emenye egwu nke ibi ndụ dị ka ndị gbara ọsọ ndụ na-akpata, ma àgwà e nwere n’ụlọ ezumezu ahụ n’ụbọchị ahụ na-egosi na olileanya dị. E kwuru okwu nke ọ bụla n’asụsụ Bekee na Swahili. Ụfọdụ ndị ọkà okwu na-asụ asụsụ abụọ ahụ nke ọma kwuru okwu ha ma tụgharịa ya n’onwe ha. Otu nwanna nwoke nke si Sudan gbata ọsọ ndụ n’ebe ahụ kwuru okwu mmeghe, nke isiokwu ya bụ “Inyocha Obi Ihe Atụ Anyị.” Ndị okenye si esi bịa kwuziri okwu ndị ọzọ.

Otu ihe omume pụrụ iche a na-eme ná mgbakọ ọ bụla bụ baptizim. Ná ngwụcha nke okwu baptizim, mmadụ nile lekwasịrị otu onye a na-aga ime baptizim anya mgbe o biliri ọtọ. Gilbert na nna ya si n’obodo ha gbapụ n’oge mgbukpọ nke agbụrụ nke 1994. Na mbụ, ha chere na ha ga-enweta nchebe na Burundi, ma ha mechara chọpụta na ha ka nọ n’ihe ize ndụ. Gilbert gbagara na Zaire, mesịa gbaga Tanzania—mgbe ụfọdụ na-ezogharị n’ime oké ọhịa—mesịzie gbata na Kenya n’ikpeazụ. Anya mmiri juru ọtụtụ mmadụ n’anya mgbe ọkà okwu ahụ nabatara ya dị ka nwanna n’ọgbakọ. Ka o guzo n’etiti ìgwè nta nke mmadụ iri itoolu na ise mejupụtara, Gilbert ji olu dara ụda na obi ike zaa, sị, “Ndiyo!”—nke pụtara “Ee!” n’asụsụ Swahili—n’ajụjụ abụọ ahụ ọkà okwu ahụ jụrụ ya. Ya na ụfọdụ ụmụnna nwoke ndị ọzọ jiri aka ha gwuo obere olulu ma jiri tapolin o jibu kpuchie ụlọ ya n’ogige ahụ tọọ n’olulu ahụ. Iji gosi ọchịchọ ya siri ike ịbụ onye e mere baptizim, n’ụtụtụ ahụ, nanị ya ji bọket gbajuo mmiri n’olulu ahụ!

Otu n’ime ihe ndị pụtara ìhè e mere ná nnọkọ nke ehihie bụ ịkọ ahụmahụ banyere ọnọdụ pụrụ iche nke Ndịàmà ahụ gbara ọsọ ndụ. Otu nwanna nwoke kọwara otú o si gakwuru otu nwoke nọ na-ezu ike n’okpuru ukwu osisi.

“Ọ̀ bụ mgbe nile ka mmadụ ga-anọ n’okpuru osisi n’enweghị nsogbu ọ bụla?”

Nwoke ahụ zara, sị “Ee.” Ọ gbakwụnyeziri, sị, “Ma, ọ bụghịkwa ma n’abalị.”

Nwanna ahụ gụụrụ ya Maịka 4:3, 4: “Ha ga-ebi, onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.” Ọ kọwara, sị: “Ị̀ hụrụ, n’ụwa ọhụrụ Chineke, ọ ga-abụ mgbe nile.” Nwoke ahụ naara akwụkwọ e ji amụ Bible.

Mmadụ atọ bụ́ ndị ezinụlọ nke otu nwanna nwanyị gara Kakuma nwụnahụrụ ya n’oge na-adịbeghị anya. Mgbe ọ na-ekwu banyere ụmụnna nọ n’ogige ahụ, ọ sịrị: “Ebe a siri nnọọ ike ọnụnọ; n’agbanyeghị nke ahụ, ha anọgidewo na-ewusi okwukwe ha ike. Ha bi n’ebe obi ụtọ na-adịghị na ya, ma ha ji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Ha na Chineke dị n’udo. A gbara m ume ịnọgide na-enwe udo ma na-ejere Jehova ozi. Enweghị m mkpesa ọ bụla!”

Ụbọchị mgbakọ ahụ gwụrụ ngwa ngwa. N’okwu mmechi, ọkà okwu kwuru na e nwere ndị nnọchianya si mba asatọ bịa mgbakọ ahụ. Otu n’ime Ndịàmà ahụ gbara ọsọ ndụ kwuru na mgbakọ a bụ ihe àmà nke ịdị n’otu na ịhụnanya dị n’etiti Ndịàmà Jehova n’ime ụwa nke kewara ekewa. Nke ha bụ ezigbo òtù ụmụnna Ndị Kraịst.—Jọn 13:35.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 25]

ỤMỤAKA SUDAN FURU EFU

Kemgbe agha obodo malitere na Sudan na 1983, a chụpụla nde mmadụ ise n’ụlọ ha. E nwere ihe dị ka iri puku ụmụaka abụọ na puku isii, bụ́ ndị e kewara ha na ezinụlọ ha. Ọtụtụ puku n’ime ha gbagara n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ dị n’Etiopia, bụ́ ebe ha nọrọ ruo ihe dị ka afọ atọ. N’ịbụ ndị a manyere ịkwapụ ọzọ, ha ji ụkwụ gaa ije ruo otu afọ iji laghachi n’ebe ugwu Kenya site na Sudan, ndị soja, ndị ohi, ọrịa na anụ ọhịa wakporo ha na njem ndị a. Ọ bụ nanị ọkara ụmụaka ahụ dịgidere ndụ ka ha mesịrị njem ndị a na-agwụ ike, mesịa ghọọ ntọala nke ogige Kakuma. Ndị ọrụ enyemaka na-akpọ ha ụmụaka Sudan furu efu.

Ogige ndị gbara ọsọ ndụ nke Kakuma bụzi ụlọ nke ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ bụ́ ndị si Sudan, Somalia, Etiopia na mba ndị ọzọ. Mgbe onye ọ bụla na-agba ọsọ ndụ rutere n’ogige ahụ, a na-enye ya ihe ndị bụ́ isi e ji ewu ụlọ, na tapolin iji kpuchie elu ya. Ugboro abụọ n’ọnwa, a na-enye onye ọ bụla gbara ọsọ ndụ ihe dị ka kọọpụ ntụ ọka iri na abụọ, kọọpụ àgwà abụọ, na obere mmanụ nri na nnu. Ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ na-ere nke ha iji zụta ihe ndị ọzọ.

A kpọaghachirila ụfọdụ n’ime ụmụaka a furu efu ndị ezinụlọ ha, ma ọ bụ kpọga ha ná mba ndị ọzọ. Ma dị ka Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Mkpọghachi nke Ndị Gbara Ọsọ Ndụ si kwuo, “ọtụtụ puku ndị ọzọ anọgidela n’ogige Kakuma ahụ nke uzuzu na ijiji jupụtara, bụ́ ebe ha na-ata ahụhụ iji nweta ihe oriri ma ọ bụ agụmakwụkwọ.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike a natara òtù Refugees International

[[Map dị na peeji 23]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

KENYA

Ogige Kakuma

Ọdọ Mmiri Turkana

Lodwar

Eldoret

Nairobi

[Foto dị na peeji nke 23]

A na-eke mmiri eke n’ogige Kakuma

[Foto dị na peeji nke 23]

Ndịàmà bụ́ ndị Kenya mere njem na-agwụ ike gaa n’ebe ugwu iji gbaa ụmụnna ha ume

[Foto dị na peeji nke 23]

Ihe siri ike n’ogige ahụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Onye ozi ala ọzọ nke na-atụgharị okwu nke onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ n’ógbè ahụ

[Foto dị na peeji nke 24]

Ebe a nọrọ mee baptizim

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 23]

Ike mmiri n’Ogige Ndị Gbara Ọsọ Ndụ nke Kakuma: Site n’ike a natara òtù Refugees International