Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Mkpọsa A Haziri nke Ọma Si Baa Uru

Otú Mkpọsa A Haziri nke Ọma Si Baa Uru

Otu nwata nwaanyị aha ya bụ María Isabel bụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi n’obodo San Benado, nke dị na Chili, n’Ebe Ndịda Amerịka. Ya na ndị ezinụlọ ha si n’agbụrụ a na-akpọ ndị Mapuchi. Ezinụlọ ahụ dum ji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado mbọ a na-agba ikepụta ọgbakọ ọhụrụ n’asụsụ ndị Mapuchi, nke a na-akpọ Mapudungun.

Mgbe a mara ọkwa na a ga-eme Ncheta Ọnwụ Kraịst n’asụsụ Mapudungun nakwa na e biri puku akwụkwọ ịkpọ òkù abụọ a ga-ekesa n’asụsụ ahụ, o mere ka María Isabel chee echiche ihe o nwere ike ime. Olee otú ọ ga-esi enye aka? O chetara akụkọ ndị a kọrọla banyere ndị na-eto eto ndị ọzọ, bụ́ ndị ziri ụmụ klas ha na ndị nkụzi ha ozi ọma, ha egee ntị. Ọ gwara nne ya na nna ya banyere ya. Ha na ya ekpebie ka ọ gbalịa icheta otú ọ ga-esi kesaa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ụlọ akwụkwọ ha. Olee otú o chetara ọ ga-esi eme ya?

Ihe mbụ María Isabel mere bụ ịrịọ ndị isi ụlọ akwụkwọ ha ka a mapawa akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ebe e si abata n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ha kwetara, jaakwa ya mma maka ihe ahụ o kpebiri ime. Otu ụbọchị, mgbe a na-akpọ aha ụmụ akwụkwọ n’ụtụtụ, onyeisi ụlọ akwụkwọ ahụ mara ọkwa banyere akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ n’ígwè okwu!

Ihe ọzọ María Isabel mere bụ ịgwa ndị isi ụlọ akwụkwọ ahụ na ya chọrọ ịga gwa klas niile okwu. Mgbe ọ natachara ikike n’aka ndị nkụzi, ọ gara na klas nke ọ bụla, jụọ ha ma è nwere onye n’ime ha bụ́ onye Mapuchi. O kwuru, sị: “Echere m na a ga-enwe ihe dị ka mmadụ iri ma ọ bụ iri na ise bụ́ ndị Mapuchi n’ụlọ akwụkwọ ahụ dum. Ma ha karịrị ole ahụ. Akwụkwọ ịkpọ òkù m kesara n’ụlọ akwụkwọ anyị dị otu narị na iri ise!”

“Ọ TỤRỤ ANYA ỊHỤ ONYE TORO ETO”

Otu nwaanyị hụrụ akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ a mapawara n’ebe e si abata n’ụlọ akwụkwọ ahụ ma chọọ ịma onye ọ ga-ajụ ihe gbasara Ncheta Ọnwụ Jizọs ahụ a ga-eme. A gwara ya ka ọ gakwuru María Isabel. Ma, o juru ya ezigbo anya ịhụ ya n’ihi na ọ dị naanị afọ iri! María Isabel mụmụrụ ọnụ ọchị ma kwuo, sị: “Ọ tụrụ anya ịhụ onye toro eto.” Mgbe o nyere nwaanyị ahụ akwụkwọ ịkpọ òkù, ọ jụrụ nwaanyị ahụ ebe o bi ka ya na ndị mụrụ ya nwee ike ịbịa n’ụlọ ya, gwakwuo ya banyere Alaeze Chineke. Obi dị ndị nkwusa iri abụọ na-asụ asụsụ Mapudungun ezigbo ụtọ ịhụ nwaanyị ahụ na mmadụ iri abụọ na isii ndị ọzọ bụ́ ndị Mapuchi ka ha bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ka ọ dị ugbu a, ha aghọọla ọgbakọ na-eme nke ọma!

N’agbanyeghị afọ ole ị dị, ì nwere ike ime ka nwata nwaanyị a ma kpọọ ụmụ akwụkwọ ibe gị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe gị ka ha bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs, mgbakọ distrikti ma ọ bụ bịa gere okwu ihu ọha? Ọ́ gaghị adị mma ka i mee nchọnchọ n’akwụkwọ anyị ka ị hụ ihe ụmụnna ụfọdụ mere, bụ́ ihe ndị nwere ike ime ka ị mata otú ị ga-esi mee ụdị ihe ahụ? Kpeekwa ekpere rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya, nke ga-enyere gị aka ịkata obi gwa ndị mmadụ banyere ya. (Luk 11:13) I mee otú ahụ, uru ezigbo mbọ ị gbara ga-aba nwekwara ike iju gị anya ma gbaa gị ezigbo ume.