Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma

Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma

Bịaruo Chineke Nso

Ọ Chọrọ Ka Ihe Gaara Anyị nke Ọma

Jọshụa 1:6-9

ỌNA-AGỤ ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya agụụ ka ihe gaara ụmụ ha nke ọma, ka ha bie ezigbo ndụ nke ga-enye ha obi ụtọ. N’otu aka ahụ, Jehova, bụ́ Nna anyị nke eluigwe, chọrọ ka ihe gaara ụmụ ya bi n’ụwa nke ọma. Iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya, ọ na-agwa anyị ihe ga-eme ka ihe gaara anyị nke ọma. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ọ gwara Jọshụa, bụ́ nke e dere na Jọshụa 1:6-9.

Chegodị echiche banyere ebe a nọ gwa ya okwu a, bụ́ nke e sere n’aka nri. Mgbe Mozis nwụchara, Jọshụa ghọrọ onye ndú ọhụrụ nke ụmụ Izrel, bụ́ ndị dị ọtụtụ nde mmadụ n’ọnụ ọgụgụ. Ụmụ Izrel na-akwado ịbanye n’ala ahụ Chineke kwere ndị nna nna ha ná nkwa. Chineke nwere ndụmọdụ ọ chọrọ inye Jọshụa. Ọ bụrụ na o soro ndụmọdụ ahụ, ihe ga-agara ya nke ọma. Ma, ọ bụghị naanị Jọshụa ka ndụmọdụ a ga-abara uru. Ihe ga-agakwara anyị nke ọma ma ọ bụrụ na anyị esoro ya.—Ndị Rom 15:4.

Jehova gwara Jọshụa ka o nwee obi ike ma di ike—ọ bụghị otu ugboro, kama ugboro atọ. (Amaokwu 6, 7, 9) O doro anya na obi ike na ike dị Jọshụa mkpa ma ọ bụrụ na ọ ga-eduru mba ahụ banye n’Ala Nkwa ahụ. Ma, olee otú o nwere ike isi nwee àgwà ọma ndị ahụ?

Jọshụa nwere ike inweta obi ike na ike site n’akwụkwọ ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee. Jehova gwara ya, sị: “Lezie anya mezuo iwu ahụ dum nke Mozis ohu m nyere gị.” (Amaokwu 7) N’oge ahụ, o nwere ike ịbụ naanị akwụkwọ Baịbụl ole na ole e dere ede ka Jọshụa nwere. * Ma, naanị inwe Okwu Chineke agaghị eme ka ihe gaara ya nke ọma. Iji rite uru na ya, ọ dị Jọshụa mkpa ime ụzọ ihe abụọ.

Nke mbụ bụ na Jọshụa aghaghị ime ka Okwu Chineke dịrị n’obi ya mgbe niile. Jehova sịrị: “Ị ga na-agụkwa ihe dị na ya n’olu dị ala ehihie na abalị.” (Amaokwu 8) Otu akwụkwọ e ji eme nnyocha kwuru, sị: “Chineke nọ na-enye Jọshụa iwu ka o cheta Iwu Ya site ‘n’iji olu dị ala na-agwa’ ya onwe ya, ma ọ bụ ‘na-atụgharị uche na’ ya.” Ịgụ Okwu Chineke na ịtụgharị uche na ya kwa ụbọchị ga-enyere Jọshụa aka imeri nsogbu ndị ga-abịara ya n’ọdịnihu.

Nke abụọ bụ na ọ dị Jọshụa mkpa ịna-eme ihe ndị ọ na-amụta n’Okwu Chineke. Jehova gwara ya, sị: “Lezie anya mee ihe niile e dere na ya; n’ihi na mgbe ahụ, ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma.” (Amaokwu 8) Ihe ga-agara Jọshụa nke ọma ma o mee uche Chineke. Ó kwesịghị ịdị otú ahụ? Uche Chineke na-emezu mgbe niile.—Aịzaya 55:10, 11.

Jọshụa ṅara ntị na ndụmọdụ ahụ Jehova nyere ya. N’ihi ya, o biri ogologo ndụ ma nwee obi ụtọ n’iji ikwesị ntụkwasị obi fee Jehova.—Jọshụa 23:14; 24:15.

Ị̀ chọrọ ibi ndụ na-enye obi ụtọ otú ahụ Jọshụa biri? Jehova chọrọ ka i bie ụdị ndụ ahụ. Ma, naanị inwe Okwu ya, bụ́ Baịbụl, ezughị. Otu Onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ruo ogologo oge tụrụ aro, sị: “Wepụta Baịbụl ahụ na peeji ya, ma tinye ya n’ime obi gị.” Ọ bụrụ na ị na-eme ka okwu Chineke dịrị n’obi gị mgbe niile ma na-eme ihe ị na-amụta eme ná ndụ gị, mgbe ahụ, dị ka Jọshụa mere, “ị ga-eme ka ụzọ gị gaa nke ọma.”

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Ọ ga-abụ na akwụkwọ ndị e si n’ike mmụọ nsọ dee Jọshụa nwere bụ akwụkwọ ise Mozis dere (Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ, na Diuterọnọmi), akwụkwọ Job, na otu abụ ọma ma ọ bụ abụọ.