Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú I Nwere Ike Isi Nyere Enyi Gị Nọ n’Ọrịa Aka

Otú I Nwere Ike Isi Nyere Enyi Gị Nọ n’Ọrịa Aka

Otú I Nwere Ike Isi Nyere Enyi Gị Nọ n’Ọrịa Aka

Ò NWETỤLA mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-ekwu ekwu mgbe gị na enyi gị nọ n’oké ọrịa na-akparịta ụka? Obi sie gị ike na ị ga-emerili nsogbu a. Olee otú ị ga-esi merie ya? O nweghị otu ụzọ e si eme ya. Omenala na-adị iche iche. Àgwà ndị mmadụ na-adịrịtakwa nnọọ iche. N’ihi ya, ihe nwere ike ime ka otu onye ọrịa nwetatụ onwe ya nwere ike ọ gaghị enyere onye ọrịa ọzọ aka. Ọnọdụ onye ọrịa na otú obi dị ya taa nwekwara nnọọ ike ịgbanwe echi.

N’ihi ya, ihe kacha mkpa bụ itinye onwe gị n’ọnọdụ onye ahụ ma chọpụta ihe ọ chọrọ nnọọ n’aka gị ma ọ bụ ihe ọ dị ya mkpa ka i meere ya. Olee otú i nwere ike isi mee nke a? Ka anyị tụlee aro ole na ole dabeere n’ụkpụrụ Baịbụl.

Na-ege ntị nke ọma

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL:

“Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa.”JEMS 1:19.

“E nwere . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.”EKLIZIASTIS 3:1, 7.

▪ Mgbe ị gara na nke enyi gị na-arịa ọrịa, jiri ọmịiko gee ya ntị nke ọma. Adịla ngwa inye ya ndụmọdụ ma ọ bụ chee na ị ga-agwarịrị ya ihe ọ ga-eme mgbe niile. Ịdị ngwa ikwu okwu nwere ike ime ka i kwuo ihe ga-ewute ya n’amaghị ama. Ihe enyi gị na-arịa ọrịa chọrọ abụchaghị onye ga-agwa ya ihe ọ ga-eme, kama, ọ bụ onye ga-eji obi ya niile gee ya ntị.

Nye enyi gị ohere ikwu otú obi dị ya. Anapụla ya okwu n’ọnụ, na-eleda ọnọdụ ya anya site n’ịgwa ya ihe ndị a na-agwakarị ndị ọrịa. Emílio * kwuru, sị: “Arịara m ọrịa mgbakwo olu, nke mechara mee ka m kpuo ìsì. Mgbe ụfọdụ, obi na-ajọ m nnọọ njọ, ndị enyi m na-akasikwa m obi site n’ịsị m: ‘Ọ bụghị naanị gị bụ onye nwere nsogbu. E nwere ndị nke ha ka nke gị njọ.’ Ma, ha amaghị na ileda ọnọdụ m anya anaghị enyere m aka. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka ọnọdụ m ka njọ, na-akụda m obi.”

Kwe ka enyi gị gwa gị ihe dị ya n’obi n’atụghị ụjọ na ị ga-akatọ ya. Ọ bụrụ na ọ gwa gị na ụjọ na-atụ ya, kwuo na ị ghọtara otú obi dị ya kama ịgwa ya naanị ka ọ ghara ịtụ ụjọ. Eliana, bụ́ onye ya na ọrịa kansa na-alụ, kwuru, sị: “Mgbe ọrịa m tụwara m ụjọ, mụ amalitekwa ibe ákwá, ọ pụtaghị na atụkwasịghịzi m Chineke obi.” Gbalịa ịhụ enyi gị otú ọ dị, ọ bụghị otú ị chọrọ ka ọ dịrị. Cheta na ihe nwere ike ịna-ewe ya iwe ugbu a karị nakwa na obi erughị ya ala. Nwee ndidi. Gee ya ntị—ya bụrụgodị na ọ pụtara ịnụ otu ihe ugboro ugboro. (1 Ndị Eze 19:9, 10, 13, 14) O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ịkọrọ gị ihe ọ na-agabiga.

Nwee ọmịiko ma na-echebara ya echiche

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL:

“Soronụ ndị na-aṅụrị ọṅụ ṅụrịa ọṅụ; soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.”NDỊ ROM 12:15.

“Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”MATIU 7:12.

▪ Tinye onwe gị n’ọnọdụ enyi gị. Ọ bụrụ na ọ na-ejikere ịga waa ahụ́, ịga ụlọ ọgwụ, ma ọ bụ na-eche ịmata ihe e letara ya n’ahụ́, obi nwere ike ikoro ya n’elu, obere ihe ana-akpasukwa ya iwe. Gbalịa ịghọta nke a ma nabata otú ọ bụla o si na-akpa àgwà. O nwere ike ugbu a agaghị abụ oge ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ, karịsịa banyere ihe ndị ọ na-agaghị achọ ịkọrọ mmadụ.

Ana Katalifós, bụ́ ọkà n’akparamàgwà ndị ọrịa, kwuru, sị: “Hapụ ndị ọrịa ka ha kwuo banyere ọrịa ha n’oge ha chọrọ nakwa otú ike kwere ha. Mgbe ha nwere mmasị ikwu okwu, gị na ha kwurịta ihe ọ bụla ha chọrọ ikwu. Ma, mgbe ọ bụla ha na-achọghị ikwu okwu, i nwere nnọọ ike ịnọrọ ọdụ n’ekwughị ihe ọ bụla, ijide enyi gị ahụ aka nwekwara ike inyere ya ezigbo aka. Ma ọ bụkwanụ i nwere ike ịchọpụta na naanị ihe dị ha mkpa bụ onye ha ga-ebesara ákwá.”

Akọsala izu nzuzo enyi gị. Onye edemede bụ́ Rosanne Kalick, bụ́ onye a gwọrọla kansa ugboro abụọ, dere, sị: “Mgbe ị na-agbalị isi n’ihe onye ọrịa kwuru mata ihe bụ́ mkpa ya, were ya na ihe ọ gwara gị bụ ihe nzuzo. Ọ gwụla ma a gwara gị ka ị bụrụ ọnụ na-ekwuru ezinụlọ ya, agwala onye ọzọ ihe ọ gwara gị. Jụọ onye ọrịa ahụ ihe ọ ga-achọ ka ndị ọzọ mara.” Edson, bụ́ onye gbakere n’ọrịa kansa, kwuru, sị: “Otu enyi m kọsaara ndị mmadụ na m nwere kansa nakwa na m ga-anwụ n’oge na-adịghị anya. Chetakwa na a ka wapụrụ m ahụ́. Ama m na m nwere kansa, ma m na-eche ka a kọọrọ m ihe e letara m n’ahụ́. Ọrịa ahụ agbasabeghị m n’ahụ́. Ma akụkọ ahụ emebiela ihe. Okwu na-enweghị isi ndị ọzọ na-ekwu na ajụjụ na-enweghị isi ha na-ajụ gbawara nwunye m obi.”

Ọ bụrụ na enyi gị nọ na-atụle ụzọ dị iche iche a chọrọ isi gwọọ ya, adịla ngwa ikwu ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ ya. Onye edemede bụ́ Lori Hope, bụ́ onye a gwọrọ kansa, kwuru, sị: “Tupu ị na-ezigara onye na-arịa kansa ma ọ bụ onye a gwọrọ ọrịa ahụ ihe ị gụtara n’akwụkwọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ị nụrụ n’akụkọ, ọ kacha mma ịjụ ya ma ọ ga-achọ ka i zitere ya ụdị ihe ahụ. Ma ọ́ bụghị ya, ihe ọma ahụ i bu n’obi na ị na-emere enyi gị nwere ike ịkpatara ya mwute, o nwekwara ike ịbụ na ị gaghị emekata mara.” Ọ bụghị mmadụ niile na-achọ ka a na-akọrọ ha ọtụtụ ihe dị iche iche a chọpụtara banyere otú e si agwọ ọrịa ha.

Ọ bụrụgodị na gị na onye ọrịa ahụ bụ ezigbo enyi, anọla na nke ya gabiga ókè. Ọ dị ezigbo mkpa ka ị na-anọnyere enyi gị, ma o nwere ike ghara ịchọ ka gị na ya nọrọ. Ike nwere ike ịgwụcha ya, ike ikwu okwu ma ọ bụdị ige ntị ruo ogologo oge agharakwa ịdị ya. N’aka nke ọzọ, emela ka o chee na ọ dị gị ngwa ngwa ịlawa. Enyi gị kwesịrị ịhụ otú ị hụruru ya n’anya.

Ichebara onye ọzọ echiche chọrọ anyị imeru ihe n’ókè na ichezi echiche echezi. Dị ka ihe atụ, tupu gị esiere onye ọrịa ihe ma ọ bụ wetara ya okooko osisi, i nwere ike ịjụ ya ma ò nwere ihe ọ na-asọ nsọ. Ọ bụrụ na ahụ́ adịghị gị, ikekwe i nwere àzụ̀zụ̀, ị ga-egosi na ị hụrụ enyi gị n’anya ma ọ bụrụ na i chere ruo mgbe àzụ̀zụ̀ gị lara tupu gị agawa ileta ya.

Na-ekwu okwu na-agba ume

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL:

“Ire ndị maara ihe na-agwọ ọrịa.”ILU 12:18.

“Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.”​NDỊ KỌLỌSI 4:6.

▪ Ọ bụrụ na ị nọgide na-ele enyi gị na-arịa ọrịa anya otú kwesịrị ekwesị, ikekwe okwu gị na omume gị ga-egosi ya. Lee enyi gị anya na ọ ka bụ onye ọ bụbu nakwa na ọ ka nwere àgwà ndị ahụ mere ka i nwee mmasị n’ebe ọ nọ. Ekwela ka ọrịa ya gbanwee otú i si ele ya anya. Ọ bụrụ na ị na-agwa enyi gị okwu otú ị ga-esi agwa onye na-abakwaghị uru, o nwere ike ịmalite ile onwe ya anya otú ahụ. Roberta, bụ́ onye rịara ụdị ọrịa ọkpụkpụ ndị mmadụ na-anaghị arịakarị, kwuru, sị: “Mesoo m ka mmadụ. Enwere m nkwarụ, ma, m na-eche echiche, m nwekwara ihe ndị m chọrọ na ihe ndị m na-achọghị. Elela m anya ka onye ụwa na-atụ n’ọnụ. Agwala m okwu ka onye iberiibe.”

Cheta na ihe dị mkpa abụghị naanị ihe i kwuru kamakwa otú i si kwuo ya. Ụda olu i ji kwuo ya nwedịrị ike ime ka a ghọtahie ya. Obere oge a chọpụtasịrị na Ernesto nwere kansa, otu enyi ya si ná mba ọzọ kpọọ ya na fon ma sị ya: “O siiri m ike ikweta na nwere kansa!” Ernesto kwuru, sị: “Otú enyi m si kwuo ‘i’ na ‘kansa’ wụrụ m akpata oyi n’ahụ́.”

Onye edemede bụ́ Lori Hope nyere ihe atụ ọzọ, sị: “Ịjụ onye ọrịa ‘Olee otú ị dị?’ nwere ike ịpụta ihe dị iche iche n’uche ya. Dabere n’ụda olu nke onye jụrụ ajụjụ ahụ, otú o si megharịa ahụ́, mmekọrịta ya na onye ọrịa ahụ, nakwa oge ọ jụrụ ya ajụjụ ahụ, o nwere nnọọ ike ịkasi onye ọrịa ahụ obi, kpatara ya mwute, ma ọ bụ mee ka ụjọ tụwa ya.”

O yiri nnọọ ka enyi gị na-arịa ọrịa ọ̀ ga-achọ ịma na ị hụrụ ya n’anya, na-aghọta ya, ma na-akwanyere ya ùgwù. N’ihi ya, mesie ya obi ike na i ji ya nnọọ kpọrọ ihe nakwa na ị dị njikere inyere ya aka. Rosemary, bụ́ onye nwere akpụ n’ụbụrụ, kwuru, sị: “Ihe kasị gbaa m ume bụ ịnụ ka ndị enyi m na-agwa m na ha hụrụ m n’anya nakwa na ha kwụ m n’azụ n’agbanyeghị ihe merenụ.”—Ilu 15:23; 25:11.

Na-enyere ya aka

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL:

“Ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.”1 JỌN 3:18.

▪ Mkpa enyi gị ga na-agbanwe n’agbata oge a chọpụtara ihe na-arịa ya na mgbe a na-agwọ ya. Ma, enyemaka nwere ike ịdị ya mkpa n’oge niile ahụ. Kama ịgwa ya ihe a a na-akapịghị ọnụ—“ya nwee ihe dị gị mkpa, kpọọ m”—gbalịa ịkapị okwu ọnụ. Ụfọdụ n’ime ihe ndị bara uru i nwere ike ime iji gosi na ị hụrụ enyi gị n’anya bụ ịgwa ya ka ị rụọrọ ya ọrụ ndị a na-arụ kwa ụbọchị, dị ka ihicha ụlọ, ịsa ákwà, idere ya ákwà, ịgara ya ozi, ịgara ya ahịa, na ịkwọga ya ụlọ ọgwụ na ịkwọlata ya. Bụrụ onye e nwere ike ịtụkwasị obi ma na-edebe oge. Na-emezu okwu gị.—Matiu 5:37.

Onye edemede bụ́ Rosanne Kalick kwuru, sị: “Ihe ọ bụla anyị mere, ma ọ̀ dị ukwuu ma ọ̀ dị obere, nke mere ka onye ọrịa chefutụ ọrịa ya ga-enyere ya aka.” Sílvia, bụ́ onye a gwọrọla kansa ugboro abụọ, kwetara, sị. “Ndị enyi m dị iche iche ịkwọrọ m gaa obodo ọzọ kwa ụbọchị ịga nara ọgwụ mere nnọọ ka ahụ́ ruo m ala ma kasie m obi! N’ụzọ, anyị na-ekwurịta ihe dị iche iche, mgbe m narasịkwaara ọgwụ, anyị na-akwụsị ịṅụ kọfị n’ebe a na-ere kọfị. Nke a mere ka ọ dị m ka ọ dịkwaghị ihe na-eme m.”

Ma, echela na ị maara nnọọ ihe dị enyi gị mkpa. Kalick tụrụ aro, sị: “Jụọ m, jụọ m, jụọ m.” O kwukwara, sị: “Ka ị na-agbalị inyere m aka, emerela m mkpebi. Nke ahụ nwere ike imebi ihe. Ọ bụrụ na o nweghị ihe i kwere m mee, ihe ị na-agwa m nwere ike ịbụ na ọ dịghị ihe m ga-emeli. Ọ dị m mkpa ịmara na ọ dị ihe m ka ga-emeli. Ọ dị m mkpa ịmara na abụghị m onye ụwa ribidoro. Nyere m aka ime ihe m ga-emeli.”

Ikekwe enyi gị chọrọ ịma na ọ dị ihe ọ ka ga-emeli. Adilson, bụ́ onye nwere ọrịa o biri n’ájá ọcha, kwuru, sị: “Mgbe ị na-arịa ọrịa, ị naghị achọ ka a kpapụ gị iche, ka à ga-asị na ọ dịghị uru ị bara ma ọ bụ na ọ dịghị nnọọ ihe ị ga-emeli. Ị na-achọ inye aka mee ihe ụfọdụ, ya bụrụgodị ịrụ obere ọrụ. Ọ na-eme obi ụtọ ịmara na ọ ka nwere ihe ị ga-emeli! Ọ na-eme ka i nwee mmasị ịdịrị ndụ gawa. Ọ na-amasị m ka ndị mmadụ hapụ m ka m mee mkpebi—ha akwanyekwara mkpebi m ùgwù. Na anyị na-arịa ọrịa apụtaghị na anyị agaghịzi arụli ọrụ dịịrị anyị dị ka ndị nna, ndị nne, ma ọ bụ ọrụ ọ bụla ọzọ.”

Ahapụla ya

ỤKPỤRỤ BAỊBỤL:

“Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”ILU 17:17.

▪ Ọ bụrụ na otú ebe i bi si dị anya n’ebe enyi gị bi ma ọ bụ ihe ọzọ emee ka ị ghara inwe ike ileta ya, i nwere ike ịkpọ ya na fon ka unu kwurịta okwu, degara ya akwụkwọ ozi, ma ọ bụ zigara ya ozi iimel. Olee ihe i nwere ike idegara ya? Alan D. Wolfelt, onye na-adụ ndị na-eru uju ọdụ, tụrụ aro, sị: “Kwuo banyere ihe ụfọdụ tọrọ gị ụtọ gị na ya mekọrọ. Kwe ya nkwa na ị ga-edetara ya akwụkwọ ozi . . . ọzọ n’oge na-adịghị anya—mezuokwa nkwa gị.”

I kwesịghị ịla azụ ịga na nke enyi gị na-arịa ọrịa, tụwa ụjọ na i nwere ike ikwu ihe na-adịghị mma ma ọ bụ mejọọ ihe. Ọtụtụ mgbe, ihe ka mkpa bụ na ị bịara. Lori Hope dere n’akwụkwọ ya, sị: “Anyị niile na-ekwu ma na-eme ihe ndị ọzọ nwere ike ịghọtahie ma ọ bụ mejọọ mmadụ n’amaghị ama. Nke ahụ abụghị nsogbu. Ihe bụ́ nsogbu bụ mgbe ụjọ imejọ ihe mere ka ị gbaara onye ị dị mkpa ọsọ.”

I nwere ike ịdị enyi gị na-arịa ọrịa mkpa ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Bụrụ “ezi enyi.” O nwere ike mgbalị gị agaghị eme ka ọrịa ya laa, ma o nwere nnọọ ike ime ka onye ị hụrụ n’anya nwekwuo ike idi ọnọdụ tara akpụ.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 9 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.