Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ò NWERE MMASỊ N’EBE Ị NỌ?

Chineke Ma Gị nke Ọma

Chineke Ma Gị nke Ọma

“Jehova, i nyochawo m, ị makwaara m.”—ABỤ ỌMA 139:1.

“Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.”—ABỤ ỌMA 139:16

IHE MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE IKWETA: Ọtụtụ ndị chere na naanị otú Chineke si were ụmụ mmadụ bụ na ha bụ ndị mmehie, ya bụ, ndị na-adịghị ọcha na ndị ọ na-ekwesịghị ilebara anya. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwaanyị aha ya bụ Kendra. E nwere mgbe obi dara ya mbà, obi ana-amakwa ya ikpe maka na ọ naghị emetacha ihe Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eme. Kendra sịrị na ihe a mere ka ya kwụsị ikpe ekpere.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ: Ihe Jehova na-ahụ abụghị naanị na i zughị okè, ọ na-enyochakwa obi gị, ghọta ụdị mmadụ ị bụ. Baịbụl sịrị: “Ya onwe ya maara nnọọ otú e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ ájá.” Ihe ọzọ bụ na “ọ dịghị emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị.” Ọ bụrụ na anyị echegharịa, ọ na-emere anyị ebere ma gbaghara anyị.—Abụ Ọma 103:10, 14.

Ka anyị lebagodị anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara eze Izrel aha ya bụ Devid, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya n’isiokwu mbụ gbara n’Ụlọ Nche a. Devid kpegaara Chineke ekpere, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị . . . Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m.” (Abụ Ọma 139:16, 23) N’eziokwu, Devid maara na n’agbanyeghị na o nwere oge ndị ya mere mmehie dị oké njọ, Jehova ga-achọpụtali na ya ji obi ya niile chegharịa.

Jehova ma gị nke ọma karịa otú mmadụ ọ bụla maara gị. Baịbụl sịrị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.” (1 Samuel 16:7) Chineke ma ihe ndị mere i ji akpa àgwà otú i si akpa. Ihe ndị ahụ bụ: ihe ị ṅụtara n’ara, otú e si zụọ gị, ebe ị nọ too, na ụdị mmadụ ị bụ. Chineke na-ahụkwa ụdị mmadụ ị na-agbalị ka ị bụrụ. O jighị mgbalị a ị na-eme egwu egwu n’agbanyeghị na ị na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ.

Ma, oleezi otú Chineke si eji ihe niile a ọ ma banyere gị akasi gị obi?