Vidio Ndị E Ji Amalite Ozi Ọma

Vidio ndị a ga-enyere gị aka ịmalite ịkọrọ ndị mmadụ gbasara Baịbụl.

Vidio Na-ekwu Gbasara Akwụkwọ Bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu

Ekwensu na-eme ka esemokwu dị n’ọtụtụ ezinụlọ taa. Ma, Baịbụl na-agwa anyị ihe anyị ga-eme ka ezinụlọ anyị na-enwe obi ụtọ.

Ị̀ Ga-achọ Ịnụ Ozi Ọma?

Aịzaya 52:7 kwuru na Baịbụl nwere ozi ọma ‘nke ihe ka mma.’ Ozi ọma a ga-enyere unu aka ịna-enwe obi ụtọ n’ezinụlọ unu, obi eruo unu ala, nyekwara unu aka imeta ezigbo ndị enyi.

Ò Nwere Olileanya Dịịrị Ndị Nwụrụ Anwụ?

Baịbụl kwuru na i nwere ike ịhụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ n’ụwa a.

Olee Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ?

Ndị mmadụ chọrọ ịmata ndị Ndịàmà Jehova bụ. Jụọ Ndịàmà Jehova n’onwe ha ka ị mata.