Gaa n'Isiokwu

Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe

Anyị Kpebiri Ilegide Anya Otu Ebe

 Madián na Marcela bi n’obodo Medlin, nke dị na Kolombia. Ha nwekwara ihe na-ezuru ha. Madián na-arụ ọrụ a na-akwụ ya ezigbo ụgwọ, nke mere ka ha biri n’otu ọmarịcha ụlọ. Ma otu ụbọchị, e nwere ihe mere ha ji lebagharịa anya n’ihe kacha ha mkpa ná ndụ ebe ha bụ ndị na-efe Jehova Chineke. Ha sịrị: “N’afọ 2006, anyị gara otu mgbakọ pụrụ iche isiokwu ya bụ ‘Legide Anya Otu Ebe.’ N’ọtụtụ okwu ndị e kwuru n’ụbọchị ahụ, e kwusiri okwu ike na ọ dị mkpa ka Ndị Kraịst hapụ ihe ụfọdụ ha na-eme ka ha nwekwuo ohere ijere Chineke ozi. Ka anyị si mgbakọ ahụ na-ala, anyị chọpụtara na ndụ anyị na-ebi dị nnọọ iche n’ihe anyị nụrụ. Anyị na-azụkarị ihe ọ bụla anyị hụrụ masịrị anyị, ọ sọkwa ya ya bụrụ na anyị enweghị ego ya mgbe ahụ. O mekwara ka anyị jide nnukwu ụgwọ.”

 Mgbe Madián na Marcela gechara okwu ndị ahụ e kwuru ná mgbakọ ahụ, ha malitere iselata aka n’ihe ndị ha na-azụ. Ha sịrị: “Ihe mbụ anyị mere bụ iselata aka n’otú anyị si emefu ego. Anyị kwagakwara n’ụlọ dị ntakịrị, ree ụgbọala anyị, zụrụzie ọgba tum tum.” Ha kwụsịkwara ịga ná nnukwu ụlọ ahịa ka ha ghara ịna-ahụ ihe ndị ahụ ga-agụwa ha agụụ ịzụta. Ha malitekwara iji oge buru ibu na-agwa ndị agbata obi ha gbasara Baịbụl. Ha metakwara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche enyi, bụ́ ndị na-eji oge buru ibu akụziri ndị ọzọ banyere Jehova Chineke. a

 Ọ dịghị anya, Madián na Marcela ekpebie na ha ga-etinyekwu oge buru ibu n’ikwusa ozi ọma. Ha kwagara otu obere ime obodo ebe e nwere ọgbakọ chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Madián kwụsịrị ọrụ ya ka ha nwee ike ịkwaga ebe ahụ. Onye Madián na-arụrụ ọrụ aghọtaghị ihe mere o ji mee ụdị mkpebi ahụ. N’ihi ya, Madián jụrụ ya, sị: “Ị na-akpata ego buru ibu, ma ị̀ na-enwe obi ụtọ?” O kwetara na ya anaghị enwe obi ụtọ n’ihi na e nwere ọtụtụ nsogbu ọ na-amaghị ihe ọ ga-eme gbasara ha. Madián sịziri ya: “Ị̀ hụlanụ na ihe kacha mkpa n’ụwa a abụghị mmadụ inwe ego? Ihe kacha mkpa bụ ihe na-eme ka i nwee obi ụtọ. Ịkụziri ndị mmadụ gbasara Chineke na-eme mụ na nwunye m obi ụtọ, anyị chọkwara ka anyị na-enwekwu obi ụtọ ahụ. Ọ bụ ya mere anyị ji chọọ ijikwu oge anyị na-akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke.”

 Madián na Marcela nwere ezigbo obi ụtọ n’ihi na ha ji oge ha niile na-ejere Chineke ozi. Kemgbe afọ iri na atọ gara aga, ha ejeela ozi n’ọgbakọ dị iche iche a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe ugwu Kolombia. Ha bụkwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ugbu a.

a Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị ná mba ọ bụla na-ahọpụta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha na-ezigakwa ha ebe ha ga-eji oge buru ibu na-ekwusa ozi ọma. A na-enye ha obere ego mmachi akpa ha ga-eji na-egbo mkpa ha.