Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà So Na-ekwu Ka E Nwee Ọchịchị Ndị Juu?

Ndịàmà Jehova Hà So Na-ekwu Ka E Nwee Ọchịchị Ndị Juu?

 Mba, ha anaghị ekwu ụdị ihe ahụ. Ndịàmà Jehova bụ Ndị Kraịst. Ihe niile ha kweere sikwa na n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụ eziokwu na okpukpe ụfọdụ na-ekwu na Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị Juu niile ga-emecha biri na Palestaịn, jiri aka ha na-achị onwe ha, ma Ndịàmà Jehova anaghị ekwu ụdị ihe ahụ. O nweghị ebe ha gụtara ụdị ihe ahụ n’Akwụkwọ Nsọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Akwụkwọ Nsọ ekwughị na o nwere obodo ka ibe ya mma ma ọ bụ nke ọchịchị ha ka nke ndị ọzọ mma. Akwụkwọ Ndịàmà Jehova kacha ebipụta, nke a na-akpọ Ụlọ Nche, kwuru hoo haa na o nweghị ebe Akwụkwọ Nsọ kwuru na ndị Juu niile ga-aga biri na Palestaịn na-achị onwe ha.

 Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na ihe ahụ ndị Juu na-eme bụ ‘ịgbalị ka ndị obodo ha niile gaa biri na Palestaịn na-achị onwe ha.’ Ọ bụ ndị okpukpe na ndị ọchịchị ndị Juu gbakọrọ aka na-eme ihe a. Ndị Jehova anaghị akwado ihe a ndị Juu na-eme. O nwetụdịghị otú aka ha si dịrị na ya.

 Ihe Ndịàmà Jehova na-eme bụ ife Chineke. Ha anaghị etinye aka n’ọchịchị obodo, ọ sọgodị ya ya bụrụ nke ndị Juu. A ma Ndịàmà Jehova ama na ha anaghị etinye aka n’ọchịchị. O nweekwala obodo ndị e ji maka ya mekpọọ Ndịàmà Jehova ọnụ. Ihe anyị ma bụ na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka udo dịrị n’ụwa a. O nweghị ọchịchị mmadụ ga-emeli ya.

 A ma Ndịàmà Jehova ama n’ụwa niile na ha na-erubere ndị ọchịchị isi. Ha anaghị agba ọchịchị mgba okpuru ma ọ bụ na-alụso ha ọgụ.