Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Kweere na E Ji Ụbọchị Isii Nkịtị Kee Ihe Niile Puku Afọ Ole na Ole Gara Aga?

Ndịàmà Jehova Kweere na E Ji Ụbọchị Isii Nkịtị Kee Ihe Niile Puku Afọ Ole na Ole Gara Aga?

 Mba. Ndịàmà Jehova kweere na Chineke kere ihe niile. Ma, anyị ekweghị na o ji abalị isii nkịtị kee ihe niile, nakwa na o kere ha puku afọ ole na ole gara aga. Gịnị mere anyị ekweghị? Ọ bụ n’ihi na ọ dabaghị n’ihe Baịbụl kwuru. Lee ihe abụọ gosiri na ọ dabaghị:

  1.   Otú ụbọchị ndị e ji kee ihe haruru n’ogologo. Ụfọdụ n’ime ndị kweere na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe na-ekwu na ụbọchị isii nke ọ bụla bụ awa iri abụọ na anọ. Ma, na Baịbụl, “ụbọchị” nwere ike ịpụta ogologo oge karịrị awa iri abụọ na anọ.​—Jenesis 2:4; Abụ Ọma 90:4.

  2.   Afọ ole ụwa nọrọla. Ụfọdụ n’ime ndị a kweere na Chineke ji ụbọchị isii kee ihe na-ekwukwa na ọ bụ naanị puku afọ ole na ole ka ụwa a nọrọla. Ma, ihe e dere na Baịbụl gosiri na ụwa na eluigwe adịlarị tupu ụbọchị nke mbụ a malitere ike ihe. (Jenesis 1:1) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị agbagha nchọpụta ọ bụla ndị sayensị mere nke gosiri na ụwa a anọọla ọtụtụ ijeri afọ.

 Ndịàmà Jehova kweere na Chineke kere ihe niile, ma ọ pụtaghị na anyị ekweghị na sayensị. Anyị kweere na ihe ọ bụla ndị sayensị chọpụtara bụ́ eziokwu na-adaba n’ihe Baịbụl kwuru.