Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova Hà Na-aga Ụlọ Ọgwụ?

Ndịàmà Jehova Hà Na-aga Ụlọ Ọgwụ?

 Ee, Ndịàmà Jehova na-aga ụlọ ọgwụ, na-aṅụkwa ọgwụ. Ọ bụ eziokwu na anyị na-elekọta onwe anyị, na-agbalịkwa ka ahụ́ sie anyị ike, ma mgbe ụfọdụ anyị na-aga hụ ndị ọgwọ ọrịa. (Luk 5:31) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụfọdụ Ndịàmà Jehova bụdị ndị dọkịta, otú ahụ Luk bụkwa ọgwọ ọrịa n’oge ndịozi Jizọs.—Ndị Kọlọsi 4:14.

 Ma, Baịbụl kagburu otú ụfọdụ e si agwọ ọrịa, anyị anaghịkwa achọ ka e si otú ahụ gwọọ anyị. Dị ka ihe atụ, anyị anaghị ekwe ka a mịnye anyị ọbara n’ihi na Baịbụl kwuru ka anyị zere ọbara. (Ọrụ Ndịozi 15:20) Baịbụl kagbukwara iji ike ndị mmụọ ọjọọ agwọ mmadụ ọrịa.—Ndị Galeshia 5:19-21.

 Ma, e nwere ọtụtụ ụzọ ndị dị mma e si agwọ ọrịa. Baịbụl akagbughịkwa ụzọ ndị ahụ. Ọ bụzi mmadụ ga-eji aka ya kpebie nke ọ ga-ahọrọ n’ime ụzọ ndị a dị mma. Otu Onyeàmà Jehova nwere ike ikpebi ka e si n’otu ụzọ gwọọ ya, ebe onye ọzọ bụkwa Onyeàmà Jehova na-agaghị achọ ka e si otú ahụ gwọọ ya.—Ndị Galeshia 6:5.