Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Naanị Ndị Ọcha Ka E Meere Baịbụl?

Ọ̀ Bụ Naanị Ndị Ọcha Ka E Meere Baịbụl?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụ eziokwu na ndị niile Chineke nyere mmụọ nsọ ya ka ha dee Baịbụl bụcha ndị ọcha, Chineke mere ka o doo anya na ya chọrọ ka mmadụ niile mụta gbasara ya. Aịzaya onye amụma kwuru, sị: “Ọtụtụ ndị ga-ejekwa wee sị: ‘Bịanụ ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.’” (Aịzaya 2:3) Ihe ọzọkwa bụ na Baịbụl ekwughị na e nwere agbụrụ ka ibe ya mma. Kama, o kwuru, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.