Gaa n'Isiokwu

Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Ihe Baịbụl kwuru

 E nwere ụzọ ọzọ e nwekwara ike isi jụọ ajụjụ a. Dị ka ihe atụ, Gịnị ka Chineke chọrọ ka m jiri ndụ m mee?” Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na ihe Chineke bu n’obi kee anyị bụ ka anyị na ya bụrụ enyi. Legodị ihe ndị a Baịbụl kwuru.

  •   Ọ bụ Chineke kere anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ [Chineke] kere anyị, ọ bụghị anyị kere onwe anyị.”​—Abụ Ọma 100:3; Mkpughe 4:11.

  •   Chineke nwere ihe o bu n’obi kee ihe ọ bụla o kere. O nwekwara ihe o bu n’obi kee ụmụ mmadụ.​—Aịzaya 45:18.

  •   Chineke kere anyị ka “mkpa ime mmụọ” na-akpa anyị. Otu ihe so ná mkpa ime mmụọ anyị bụ ịmata ihe mere Chineke ji kee anyị. (Matiu 5:3) Chineke chọkwara ka anyị mata ihe ahụ.​—Abụ Ọma 145:16.

  •   Otu ihe anyị ga-eme iji gboo mkpa ime mmụọ anyị bụ imete Chineke enyi. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị nwere ike iche na anyị agaghị emeteli Chineke enyi, ma Baịbụl na-agwa anyị, sị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”​—Jems 4:8; 2:23.

  •   Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ enyi Chineke, anyị ga-eme ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Baịbụl gwara anyị ihe Chineke chọrọ ka anyị mee n’Ekliziastis 12:13. Ọ sịrị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa ihe o nyere n’iwu. N’ihi na ọ bụ ya bụ ọrụ dum dịịrị mmadụ.”

  •   N’ọdịnihu, Chineke ga-ewepụ ahụhụ ma mee ka ndị enyi ya, ya bụ, ndị niile na-efe ya nweta ndụ ebighị ebi. N’oge ahụ, anyị ga-amatakwu ihe mere Chineke ji kee mmadụ.​—Abụ Ọma 37:10, 11.