Abụ Ọma 37:1-40

  • Ihe ga-agaziri ndị tụkwasịrị Jehova obi

    • Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ (1)

    • “Na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi Jehova” (4)

    • “Kwe ka Jehova na-edu gị” (5)

    • “Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa” (11)

    • Nri agaghị akọ onye ezi omume (25)

    • Ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa ruo ebighị ebi (29)

Abụ Devid. א [Alef] 37  Ewerela ndị na-eme ihe ọjọọ iwe,Enwekwarala ndị ajọ omume anyaụfụ.+   Ha ga-akpọnwụ ọsọ ọsọ ka ahịhịa,+Ha ga-achanwụkwa ka ahịhịa ndụ. ב [Bet]   Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma.+ Biri n’ụwa,* na-emekwa ihe ga-eme ka a tụkwasị gị obi.+   Na-enwe ezigbo obi ụtọ* n’ihi Jehova,Ọ ga-emere gị ihe obi gị chọrọ. ג [Gimel]   Kwe ka Jehova na-edu gị.*+ Tụkwasị ya obi. Ọ ga-enyere gị aka.+   Ọ ga-eme ka ezi omume ị na-eme na-enwu ka ìhè ụtụtụ,Meekwa ka ihe ndị dị mma ị na-eme na-acha ka anwụ etiti ehihie. ד [Dalet]   Gba nkịtị n’ihu Jehova,+Na-atụsikwa anya ya ike.* Ewerela onye na-akpa nkata ọjọọ iweMaka na nkata ọ na-akpa na-agaziri ya.+ ה [Hee]   Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma.+ Ewela iwe wee gaa mee ihe ọjọọ.*   N’ihi na a ga-ebibi ndị na-eme ihe ọjọọ.+ Ma ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.+ ו [Wọọ] 10  N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ.+ Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ,Ma ha agaghị anọ ya.+ 11  Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa,+Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.+ ז [Zayin] 12  Onye ajọ omume na-akpara onye ezi omume nkata ọjọọ.+ Ọ na-ata ikikere ezé maka na ọ na-ewesa onye ezi omume iwe. 13  Ma Jehova ga-achị ya ọchị,N’ihi na ọ ma na ụbọchị a ga-ebibi ya na-abịa.+ ח [Het] 14  Ndị ajọ omume na-amịpụta mma agha ha, na-ekwekwa ụta haKa ha gbatuo ndị a na-emegbu emegbu na ndị ogbenyeNakwa ka ha gbuo ndị na-eme ihe ziri ezi.* 15  Ma mma agha ha ga-amaba ha n’obi.+ A ga-agbaji ụta ha. ט [Tet] 16  Obere ihe onye ezi omume nwere dị mmaKarịa nnukwu ihe ọtụtụ ndị ajọ omume nwere.+ 17  N’ihi na a ga-anapụ ndị ajọ omume ike,*Ma Jehova ga na-akwado ndị ezi omume. י [Yod] 18  Jehova ma nsogbu niile na-abịara ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta,Ihe ha ga-eketa ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ 19  Ihere agaghị eme ha n’oge ọdachi dakwasịrị ha. Ha ga-enwe ọtụtụ ihe ha ga-eri n’oge ụnwụ. כ [Kaf] 20  Ma a ga-ebibi ndị ajọ omume.+ Ndị iro Jehova ga-ala n’iyi otú ahịhịa ndị dị n’ebe mara mma anụmanụ na-ata ahịhịa si akpọnwụ. Ha ga-apụ n’anya ka anwụrụ ọkụ. ל [Lamed] 21  Onye ajọ omume na-agbaziri ihe, ma ọ naghị akwụghachi. Ma onye ezi omume na-emesapụ aka,* na-emetekwara ndị mmadụ ebere.*+ 22  Ndị Chineke gọziri ga-enweta ụwa,Ma a ga-ebibi ndị ọ bụrụ ọnụ.+ מ [Mem] 23  Ọ bụrụ na ihe mmadụ na-eme dị Jehova mma,+Ọ ga na-eduzi onye ahụ n’ihe ọ bụla ọ na-eme.+ 24  Ọ bụ eziokwu na onye ahụ nwere ike ịda, ma ọ gaghị adaru ala,+N’ihi na Jehova ji ya aka, na-akwado ya.+ נ [Nun] 25  E nwere mgbe m bụ nwata. Ma ugbu a, abụzi m agadi. Ma ahụbeghị m ka a hapụrụ onye ezi omume ọ bụla,+Ahụbeghịkwa m ụmụ ya ka ha na-arịọ nri.*+ 26  Ọ na-eji obi ya niile agbazinye ihe,+A ga-agọzikwa ụmụ ya. ס [Samek] 27  Hapụ ihe ọjọọ ma mewe ezi ihe,+Ị ga-anọgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. 28  N’ihi na ikpe ziri ezi na-amasị Jehova,Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-erubere ya isi.+ ע [Ayin] Ọ ga na-echebe ha mgbe niile.+ Ma a ga-ebibi ụmụ ndị ajọ omume.+ 29  Ndị ezi omume ga-enweta ụwa,+Ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.+ פ [Pee] 30  Onye ezi omume na-eji ọnụ ya ekwu ihe ga-eme ka mmadụ mara ihe,* na-ekwukwa ihe ziri ezi.+ 31  Iwu Chineke ya dị n’obi ya.+ Ọ gaghị azọhie ụkwụ.+ צ [Sadee] 32  Onye ajọ omume na-ele onye ezi omume anya,Na-achọ ka o gbuo ya. 33  Ma Jehova agaghị ahapụ onye ezi omume n’aka ya,+Ọ gaghịkwa ekwu na ikpe mara onye ezi omume mgbe a na-ekpe ya ikpe.+ ק [Kof] 34  Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, na-esokwa ụzọ ya,Ọ ga-emekwara gị amara, mee ka i nweta ụwa. Mgbe a ga-ebibi ndị ajọ omume,+ ị ga-ahụ ya.+ ר [Resh] 35  Ahụla m onye ajọ omume nke obi fere azụKa ihe na-agaziri ya, ya adị ka nnukwu osisi na-ama pokopoko n’ala a kụrụ ya.+ 36  Ma, ọ nwụrụ na mberede. Ọ nọghịzi.+ Anọ m na-achọ ya, ma ahụghị m ya.+ ש [Shin] 37  Hụwa onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta ama,Na-elekwa onye ezi omume anya,+N’ihi na udo ga-adịrị ya n’ọdịnihu.+ 38  Ma a ga-ebibi ndị niile na-emebi iwu. Ndị ajọ omume enweghị ọdịnihu.+ ת [Tọọ] 39  Ọ bụ Jehova na-azọpụta ndị ezi omume.+ Ọ bụ ebe a rụsiri ike nke ha na-agbaba n’oge ahụhụ.+ 40  Jehova ga-enyere ha aka ma napụta ha.+ Ọ ga-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume ma zọpụta ha,Maka na ha gbabara n’ime ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ala.”
Ma ọ bụ “Na-enwe ọṅụ kachanụ.”
Na Hibru, “Nyefee Jehova ụzọ gị.”
Ma ọ bụ “Jiri ndidi na-eche ya.”
O nwere ike ịbụ, “Ewela iwe, n’ihi na naanị ihe o nwere ike ịkpata bụ nsogbu.”
Ma ọ bụ “ndị ụzọ ha kwụ ọtọ.”
Na Hibru, “ga-agbaji aka ndị ajọ omume.”
Ma ọ bụ “na-enwekwa ọmịiko.”
Ma ọ bụ “na-eme amara.”
Na Hibru, “achịcha.”
Na Hibru, “Ire ya.”