Gaa n'Isiokwu

Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?

Ò Nwere Onye Dị́ Adị Bụ́ Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee. Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe gosiri na Chineke dị. Baịbụl gwakwara anyị ka anyị nwee okwukwe na Chineke. Ma, ọ naghị ekwu ka anyị kweta ihe niile ndị chọọchị na-ekwu. Ihe ọ na-ekwu bụ ka anyị jiri ‘ike iche echiche’ na ‘ikike anyị ji aghọta ihe’ mata nke bụ́ eziokwu banyere Chineke. (Ndị Rom 12:1; 1 Jọn 5:​20) Ka anyị lebagodị anya n’ihe ndị a Baịbụl kwuru bụ́ ndị gosiri na Chineke dị:

  •   Otú eluigwe na ụwa si dịrị n’usoro, ihe ndị dị́ ndụ adịkwa n’ime ha gosiri na e nwere Onye kere ha. Baịbụl kwuru, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịdị ka ihe a Baịbụl kwuru enweghị oké ihe ọ bụ, ma ọtụtụ ndị gụrụ oké akwụkwọ kwetara na ihe a o kwuru gbara ọkpụrụkpụ. *

  •   Ọ na-agụsi anyịnwa bụ́ ụmụ mmadụ agụụ ike ịghọta ihe mere anyị ji dịrị ndụ. Ọ bụrụgodị na anyị enwetachaa ihe niile dị́ anyị mkpa ma anyị aghọtabeghị ihe mere anyị ji dịrị ndụ, obi anaghị eru anyị ala. Ihe a anyị chọrọ ịghọta so n’ihe Baịbụl kpọrọ “mkpa ime mmụọ.” Ịmata onye Chineke bụ na ife ya sokwa ná mkpa ime mmụọ anyị nwere. (Matiu 5:3; Mkpughe 4:​11) Mkpa a anyị nwere so n’ihe gosiri na Chineke dị adị. O gosikwara na onye kere anyị hụrụ anyị n’anya, chọọkwa ka anyị ghọta ihe mere anyị ji dịrị ndụ.​—Matiu 4:4.

  •   E nwere ọtụtụ amụma ndị e dere na Baịbụl ọtụtụ narị afọ tupu oge e kwuru na ha ga-emezu. Ha mezukwara otú e kwuru na ha ga-eme. Otú ha si mezuchaa gosiri na e nwere onye karịrị mmadụ amụma ndị ahụ si n’aka ya.​—2 Pita 1:​21.

  •   Ndị so dee Baịbụl ma ọtụtụ ihe banyere sayensị karịa otú ndị ha na ha dịkọrọ ndụ ma. Dị ka ihe atụ, n’oge ochie, ọtụtụ ndị kweere na e nwere anụmanụ a dọkwasara ụwa n’elu ya, dị ka enyí, ézì ọhịa, ma ọ bụ oké ehi. Ma, Baịbụl kwuru na ‘ọ dịghị ihe Chineke kokwasịrị ụwa na ya.’ (Job 26:7) Baịbụl kwukwara na ụwa “dị gburugburu” ma ọ bụ okirikiri. (Aịzaya 40:22) Ọtụtụ ndị kwetara na naanị ihe mere ndị so dee Baịbụl ji mara ihe ndị a bụ na ọ bụ Chineke mere ka ha mata ha.

  •   Baịbụl zara ọtụtụ ajụjụ tara akpụ, ndị ọ ga-abụ ma mmadụ amataghị azịza ha, ya ekwerezie na Chineke adịghị. Ụfọdụ ajụjụ ndị ahụ bụ: Ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya ma ka ihe niile ike, gịnị mere ahụhụ na ihe ọjọọ ji ju n’ụwa? Gịnị mere okpukpe ji emekarị ka ndị mmadụ na-eme ihe ọjọọ kama ịna-eme ihe ọma?​—Taịtọs 1:​16.

^ Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke nwụrụla anwụ aha ya bụ Allan Sandage. Ọ bụ ọkachamara n’ihe banyere mbara igwe. O kwuru banyere eluigwe na ụwa, sị: “O siiri m ike ikweta na eluigwe na ụwa a dị́ n’usoro pụtara n’onwe ya. A ga-enwerịrị ihe haziri ha ahazi. Ọ ka na-agbagwoju m anya ma Chineke ọ̀ dị. Ma, ọ bụ naanị ikweta na ọ dị ga-eme ka mmadụ ghọta otú ihe niile si malite ịdị.”