Aịzaya 40:1-31

  • A kasiri ndị Chineke obi (1-11)

    • Onye nọ n’ala ịkpa na-eti mkpu (3-5)

  • Otú Chineke si dị ebube (12-31)

    • Mba niile dị ka mmiri si na bọket tapụ (15)

    • Chineke bi n’ebe dị elu karịa “ụwa dị gburugburu” (22)

    • Chineke na-akpọ kpakpando niile aha n’otu n’otu (26)

    • Ike anaghị agwụ Chineke (28)

    • Ndị nwere olileanya na Jehova ga-enwetaghachi ike (29-31)

40  Chineke unu kwuru, sị: “Kasienụ ndị m obi. Kasienụ ha obi.”+   “Gwanụ ndị bi na Jeruselem okwu ga-eru ha n’obi.* Gwanụ ha na oge ha ga-akwụsị ịta ahụhụ eruolaNakwa na a kwụchaala ụgwọ mmehie ha.+ N’ihi na Jehova ataala ha ahụhụ niile ha kwesịrị ịta maka mmehie ha niile.”+   E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: “Dozienụ ụzọ Jehova!+ Sinụ n’ọzara waara Chineke anyị okporo ụzọ kwụ ọtọ.+   Meenụ ka ndagwurugwu niile dị elu,Meekwanụ ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị. Ala dị ndakoro ndakoro ga-adị larịị. Ala na-adịghị larịị ga-adịkwa larịị.+   A ga-eme ka a mara na Jehova dị ebube.+ Mmadụ* niile ga-ahụkwa ya,+N’ihi na Jehova ji ọnụ ya kwuo ya.”   Gee ntị! E nwere onye sị: “Maa ọkwa!” Onye ọzọ ajụọ ya, sị: “Gịnị ka m ga-ama n’ọkwa?” “Mmadụ* niile bụ ahịhịa ndụ. Ịhụnanya ha niile dị ka ifuru ahịhịa.+   Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,+N’ihi na Jehova na-ekusa ya ume.+ N’eziokwu, ndị mmadụ bụ ahịhịa ndụ.   Ahịhịa ndụ na-akpọnwụ akpọnwụ,Okooko ya na-achanwụkwa achanwụ,Ma, okwu Chineke anyị na-adịru mgbe ebighị ebi.”+   Nwaanyị nke na-ezi Zayọn ozi ọma,+Gbagoo n’ugwu dị elu. Nwaanyị nke na-ezi Jeruselem ozi ọma,Jiri ike gị tie mkpu. Tie mkpu. Atụla egwu. Gwa obodo ndị dị na Juda, sị: “Leenụ Chineke unu.”+ 10  Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-abịa gosi ike ya. Aka ya ka ọ ga-eji na-achị.+ Ọ dị njikere ịkwụ ndị ya ụgwọ ọrụ. Ihe ọ ga-akwụ ha dịkwa n’ihu ya.+ 11  Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ ya otú onye na-azụ atụrụ si azụ atụrụ.+ Ọ ga-eji aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya. Ọ ga-ekuru ha n’obi ya. Ọ ga-eji nwayọọ na-edu ndị nke ka na-enye ụmụ ha ara.+ 12  Ònye ka ọbụ aka ya nwere ike ịba mmiri niile dị n’oké osimiri?+ Ònyekwa ji ọbụ aka* ya tụọ eluigwe? Ònye wụnyere ájá dị n’ala n’ihe e ji atụ̀ ihe+Ma ọ bụ jiri ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu ukwu,Jirikwa ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ugwu nta? 13  Ònye tụrụ mmụọ Jehova ka ọ mata otú ọ hà?* Ònyekwa ga-adụli Chineke ọdụ, kụziekwara ya ihe?+ 14  Ònye ka ọ gakwuuru ka ọ ghọta ihe? Ònye na-akụziri ya otú e si ekpe ikpe ziri ezi? Ònye na-akụziri ya ihe? Ònye na-agwa ya otú e si aghọta ihe nke ọma?+ 15  Ọ na-ewere mba niile ka mmiri si na bọket tapụ. Ọ na-ewerekwa ha ka uzuzu dị n’elu ihe e ji atụ̀ ihe.+ Ọ na-abọli agwaetiti elu ka uzuzu. 16  Ọ bụrụgodị na mmadụ egbutuo osisi niile dị na Lebanọn, dowe ha n’elu ebe ịchụàjà ka o tinye ha ọkụ,Onye ahụ ejirikwa anụ ọhịa niile dị ebe ahụ chụọ àjà a na-esu ọkụ, ihe o kwesịrị inye Chineke ezubeghị. 17  Mba niile dị ka ihe na-adịghị adị n’anya ya.+ Ọ na-ewere ha ka ihe na-enweghị ihe ha bụ na ihe efu.+ 18  Ònye ka unu ga-eji tụnyere Chineke?+ Oleekwa ihe unu ga-asị na o yiri?+ 19  Omenkà na-akpụ arụsị. Onye na-eji ígwè akpụ ihe na-ejikwa ọlaedo machie ya,+Jirikwa ọlaọcha kpụọ ihe a ga-eji chọọ ya mma. 20  Mmadụ na-ahọrọ otu osisi ọ ga-eji pịa arụsị.+ Ọ na-ahọrọ osisi na-agaghị ere ure. Ọ na-achọta omenkà bụ́ aka ochieKa ọ pịara ya arụsị na-agaghị na-ete kweke kweke.+ 21  Ọ̀ bụ na unu amaghị ihe a? Ọ̀ bụ na unu anụbeghị ihe a? Ọ̀ bụ na a kọbereghị unu ya kemgbe ụwa? Ọ̀ bụ na unu aghọtaghị ihe a n’agbanyeghị na o doro anya kemgbe a tọrọ ntọala ụwa?+ 22  Chineke bi n’ebe dị elu karịa ụwa dị gburugburu,+Nke ndị bi na ya dị ka ụkpara. Ọ na-agbasa eluigwe ka ákwà dị fere fere,Na-agbasakwa ya ka ụlọikwuu a ga-ebi ebi.+ 23  Ọ na-eweda ndị isi ala,Na-emekwa ka ndị ikpe* nọ n’ụwa bụrụ ndị na-enweghị ihe ha bụ. 24  Ha dị ka mkpụrụ a ka kụrụ akụ. Ha dịkwa ka mkpụrụ a ka ghara agha. Úkwù ha agbanyebeghị mgbọrọgwụ n’ala. Ikuku fee ha, ha akpọnwụọ,Ifufe na-ebufukwa ha ka ahịhịa ọka.+ 25  Onye Nsọ kwuru, sị: “Ònye ka unu ga-eji tụnyere m? Ònye ka mụ na ya hà?” 26  “Leenụ anya n’eluigwe hụ ihe ndị a. Ònye kere ha?+ Ọ bụ Chineke, onye na-edu ha n’ìgwè, na-agụkwa ha ọnụ. Ọ na-akpọ ha niile aha n’otu n’otu.+ O nweghị otu n’ime ha ọ na-achọ achọ,N’ihi na ike ya dị egwu, ume ya enweghịkwa atụ.+ 27  Jekọb, gịnị mere i ji ekwu ihe a? Izrel, gịnị mere i ji na-asị,‘Jehova anaghị ahụ otú ihe si dịrị m,Chineke leghaara mmegbu a na-emegbu m anya’?+ 28  Ị́ matabeghị ihe a? Ị́ nụbeghị ihe a? Jehova, onye kere ihe niile dị n’ụwa, bụ Chineke ruo mgbe ebighị ebi.*+ Ọ naghị ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.+ O nweghị onye ga-amatali otú ọ na-aghọtaru ihe.+ 29  Ọ na-eme ka onye ike gwụrụ nwee ike. Ọ na-emekwa ka ume ju onye na-enweghị ume obi.+ 30  Ụmụaka ndị nwoke ga-ada mbà. Ike ga-agwụkwa ha. Ụmụ okorobịa ga na-adajọgharị, na-adarukwa ala. 31  Ma, ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike. Ha ga-efeli elu ka à ga-asị na ha nwere nku ka ugo.+ Ha ga-agba ọsọ, ma ike agaghị agwụ ha. Ha ga-eje ije, ma ha agaghị ada mbà.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Na-agụgụnụ ndị bi na Jeruselem obi.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Na Hibru, “Anụ ahụ́.”
Ya bụ, malite ná mkpịsị aka ukwu ruo na nke nta ma a gbasaa aka. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ, “Ònye ghọtara otú mmụọ Jehova si arụ ọrụ.”
Ma ọ bụ “ndị ọchịchị.”
Ma ọ bụ “malite mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”