Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

2 Timoti 1:7​—“Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ Nke Ụjọ”

2 Timoti 1:7​—“Chineke Enyeghị Anyị Mmụọ Nke Ụjọ”

 “N’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ, kama, ọ na-enye anyị ike, na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ka anyị na-ele ihe anya otú dị mma.”​— 2 Timoti 1:​7, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “Chineke enyeghị anyị mmụọ nke ụjọ, kama mmụọ nke ike, nke ịhụnanya na nke ịkwanyere onwe anyị ugwu.”​—2 Timoti 1:7, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Ihe 2 Timoti 1:7 Pụtara

 Chineke nwere ike inyere mmadụ aka ịkata obi mee ihe dị mma. Chineke achọghị ka mmadụ jiri maka ụjọ mee ihe n’adịghị mma, mmadụ ime ụdị ihe a ga-ewute Chineke.

 E nwere ihe atọ amaokwu a kwuru ga-enyere anyị aka ịghara ịtụ ụjọ.

 “Ike.” Ndi na-efe Chineke akatala obi na-efe ya n’agbayeghị nsogbu ndị iro ha obi fere azụ na-enye ha. Ha anaghị eji ụjọ akwụsị ife ya. (2 Ndị Kọrịnt 11:​23-27) Olee ihe na-enyere ha aka? Legodi otú Pọl onyeozi si kwuo ya: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.” (Ndị Filipaị 4:13) Chineke nwere ike inye ndị na-efe ya “ike karịrị ike mmadụ” iji merie nsogbu ọ bụla.​—2 Ndị Kọrịnt 4:7.

 “Ịhụnanya.” Mmadụ ịhụ Chineke n’anya ga-enyere ya aka ịkata obi mee ihe dị mma. Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ na-adị ma mmadụ hụ mmadụ ibe ya n’anya. Ọ na-enyere ya aka ọbụrụgodi na o nwere ike ịta isi anyị.​—Jọn 13:34; 15:13.

 “Ị na-ele ihe anya otú dị mma.” Mgbe ọ bụla Baịbụl kwuru na mmadụ na-ele ihe anya otú dị mma, ihe ọ na-apụta bụ na onye ahụ na-eji ihe ndị Baịbụl kwuru ekpebị ihe ndị ọ na-eme. Onye na-ele ihe anya otú dị mma na-eme mkpebi ndị dị mma, ma mgbe ihe siiri ya ike. Ọ na-eme mkpebi ndị gosiri na ọ na-eche echiche otú Chineke chọrọ, na-echeta na o kwesịrị ime ihe dị Chineke mma ọ bụghị ihe ndị mmadụ chọrọ.

Ihe Ndị Gbara 2 Timothy 1:7 Gburugburu

 Ọ bụ Timoti ka Pọl onyeozi degaara akwụkwọ Timoti Nke Abụọ. Ọ bụ enyi ya na onye ya na ya na-arụkọ ọrụ. N’akwụkwọ ozi a, Pọl medara obi gbaa ya ume ka o jisie ike na-emekwu nke ọma n’ozi ọma. (2 Timoti 1:​1, 2) O nwere ike ịbụ na Timoti bụ onye ihere, ya emezie ka ọ ghara ịna-esoro ụmụnna eme ihe niile ha na-eme. (1 Timoti 4:12) Ma Pọl chetaara Timoti na o nwere onyinye e nyere ya, onyinye a bụ ọrụ pụrụ iche e nyere ya n’ọgbakọ. Pọl gwakwara Timoti ka ọ ghara ịla azụ mgbe ọ bụla o kwesịrị ịrụ ọrụ ya ka okenye ọgbakọ, mgbe ọ na-ezi ozi ọma nakwa mgbe a na-akpagbu ya n’ihi okwukwe ya.​—2 Timoti 1:​6-8.

 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Timoti ka Pọl degaara akwụkwọ ozi a, o mere ka obi sie ndị niile chọrọ ife Chineke taa ike na ọ ga-enyere ha aka n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara ha.