Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Aịzaya 41:10​—“Atụla Egwu, n’Ihi na M Nọnyeere Gị”

Aịzaya 41:10​—“Atụla Egwu, n’Ihi na M Nọnyeere Gị”

 “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.”​—Aịzaya 41:​10, Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 ‘Atụla egwu, gi ka M’nọyere: elela anya gburugburu n’ụjọ, n’ihi na Mụ onwem bụ Chineke-gi. M’gagba gi ume; e, M’geyere gi aka; e, M’geji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.’​—Aịzaya 41:10, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Aịzaya 41:10 Pụtara

 Jehova a Chineke mesiri ndị na-efe ya obi ike na ya ga na-enyere ha aka n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ha.

 “M nọnyeere gị.” Jehova gwara ndị na-efe ya ihe mere na ha ekwesịghị ịtụ ụjọ. Ọ bụ maka na ọ nọnyeere ha. Ọ maara nsogbu ndị ha na-enwe, ọ na-azakwa ha ekpere. Ọ dị nnọọ ka à ga-asị na ya na ha nọ.​—Abụ Ọma 34:15; 1 Pita 3:12.

 “Abụ m Chineke gị.” Jehova na-echetara ndị na-efe ya na n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ha, na ọ ka ga-abụ Chineke ha, hanwa abụrụkwa ndị ya. Ihe a na-eme ka obi ruo ha ala. Obi kwesịrị isi ha ike na o nweghị ihe ọ bụla ga-emeli ka Chineke ghara inyere ha aka.​—Abụ Ọma 118:6; Ndị Rom 8:32; Ndị Hibru 13:6.

 “M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.” Jehova kwuru ihe atọ a yiri ibe ha iji mesie ndị ya obi ike na ya ga na-akwado ha. O ji ihe atụ ebe o sekpụ anyị n’aka nri ya mee ka anyị mara na ọ ga-enyere anyị aka mgbe ọ bụla anyị kpọrọ ya. E nwee onye daranụ, Chineke na-eji aka nri ya selite onye ahụ.​—Aịzaya 41:13.

 Otu ihe gbara ọkpụrụkpụ Chineke ji enyere ndị na-efe ya aka bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl. (Joshụa 1:8; Ndị Hibru 4:12) Dị ka ihe atụ, e nwere ezigbo ndụmọdụ ndị dị n’Okwu Chineke nwere ike ịbara ndị ihe na-esiri ike, ndị na-arịa ọrịa, ma ọ bụkwanụ ndị mmadụ nwụnahụrụ uru. (Ilu 2:​6, 7) Chineke nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya, ya bụ, ike ya o ji arụ ọrụ, nyere ndị na-efe ya aka ka ha cheta ihe ga-enyere ha aka idi nsogbu bịaara ha, meekwa ka ha ghara ịda mbà.​—Aịzaya 40:29; Luk 11:13.

Ihe Ndị Gbara Aịzaya 41:10 Gburugburu

 Ihe ndị e kwuru n’amaokwu a gbara ndị Juu ji obi ha na-efe Chineke e mechara dọrọ n’agha laa Babịlọn ume. Jehova kwuru na mgbe ọ ga-afọ obere ka ndị Juu a dọọrọ n’agha nwere onwe ha, na a ga-anụ akụkọ na e nwere onye iro ga-abịa ibibi Babịlọn na mba ndị gbara ya gburugburu. (Aịzaya 41:​2-4; 44:​1-4) Akụkọ a ga-eme ka ndị Babịlọn na mba ndị gbara ha gburugburu chịrị obi n’aka. Ma, ndị Juu ekwesịghị ịtụ ụjọ n’ihi na Jehova ga-echebe ha. Ọ gwara ha ugboro atọ, sị: “Atụla egwu.” Ihe a ọ gwara ha mere ka obi sie ha ike​—Aịzaya 41:​5, 6, 10, 13, 14.

 Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị Juu bi na Babịlọn ka e bu n’obi dee ihe a dị n’Aịzaya 41:​10, ma Jehova kwere ka ọ ka dịrị na Baịbụl iji kasie ndị niile na-efe ya obi. (Aịzaya 40:8; Ndị Rom 15:4) Jehova na-enyere ndị na-efe ya n’oge a aka, dịkwa ka o nyeere ndị fere ya n’oge ochie.

Gụọ Aịzaya isi 41 na ihe ndị e dere n’ala ala peeji nakwa ihe ndị e dere n’etiti peeji ya.

a Ezigbo aha Chineke bụ Jehova.​—Abụ Ọma 83:18.