Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Mkpughe 21:1—“Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”

Mkpughe 21:1—“Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ”

 “Ahụkwara m eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, n’ihi na eluigwe mbụ na ụwa mbụ alaala n’iyi, oké osimiri adịghịkwa.”​—Mkpughe 21:​1, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ.

 “M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ.”​—Mkpughe 21:1, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Mkpughe 21:1 Pụtara

 Amaokwu a na-ekwu na Alaeze Chineke nke dị n’eluigwe ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ, ma o ji ihe atụ kwuo ya. Alaeze Chineke ga-ebibi ndị ajọ omume, chịwazie ụmụ mmadụ ndị ji obi ha niile kweta ịna-erubere ọchịchị ya isi.

 Ihe ndị dị n’akwụkwọ Mkpughe “nwere ihe ha nọchiri anya ha.” (Mkpughe 1:1) N’ihi ya, ọ dabara adaba ikwu na eluigwe na ụwa e kwuru okwu ha n’amaokwu a abụghị eluigwe nkịtị na ụwa nkịtị, kama e nwere ihe ha nọchiri anya ha. E nwekwara ebe ndị ọzọ e ji “eluigwe ọhụrụ” na “ụwa ọhụrụ” mee ihe atụ na Baịbụl. (Aịzaya 65:17; 66:22; 2 Pita 3:13) Ileba amaokwu ndị ahụ na amaokwu ndị ọzọ anya ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ha pụtara.

 “Eluigwe ọhụrụ.” N’ebe ụfọdụ na Baịbụl, okwu bụ́ “eluigwe” na-anọchi anya ọchịchị. (Aịzaya 14:12-14; Daniel 4:25, 26) Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ e ji eme nchọchọ ji kwuo na ihe eluigwe nọchiri anya ya n’amụma ndị dị na Baịbụl bụ ọchịchị. a Ná Mkpughe 21:1, “eluigwe ọhụrụ” na-anọchi anya Alaeze Chineke. Mgbe ụfọdụ, a na-akpọkwa ọchịchị a dị n’eluigwe “Alaeze eluigwe.” E kwuru okwu ya n’ọtụtụ ebe ná Mkpughe nakwa n’akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl. (Matiu 4:17; Ọrụ Ndịozi 19:8; 2 Timoti 4:18; Mkpughe 1:9; 5:10; 11:15; 12:10) Ọ bụ Jizọs bụ Eze nke Alaeze Chineke. Alaeze a ga-emecha nọchie “eluigwe mbụ,” ya bụ, ọchịchị niile dị n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè.​—Daniel 2:44; Luk 1:31-33; Mkpughe 19:11-18.

 “Ụwa ọhụrụ.” Baịbụl kwuru na a gaghị ebibi ụwa nkịtị ma ọ bụkwanụ gbanwe ya. (Abụ Ọma 104:5; Ekliziastis 1:4) Gịnịzi bụ ụwa ahụ e ji mee ihe atụ? Ọtụtụ mgbe, Baịbụl na-akpọ ụmụ mmadụ “ụwa.” (Jenesis 11:1; 1 Ihe E Mere 16:31; Abụ Ọma 66:4; 96:1) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na “ụwa ọhụrụ” nọchiri anya ndị ji obi ha niile kweta ịna-erubere ọchịchị Chineke nke dị n’eluigwe isi. A ga-ebibi “ụwa mbụ,” ma ọ bụ ụmụ mmadụ ndị na-enupụrụ Chineke isi.

 “Oké osimiri adịghịkwa.” Otú ahụ ihe ndị ọzọ e kwuru ná Mkpughe 21:1 si nwee ihe ha nọchiri anya ha ka “oké osimiri” nwekwara ihe ọ nọchiri anya ya. Oké osimiri na-amakarị jijiji, na-erugharịkwa erugharị. Ọ nọchiri anya ụmụ mmadụ ndị na-enupụrụ Chineke isi. (Aịzaya 17:12, 13; 57:20; Mkpughe 17:1, 15) A ga-ebibikwa ha. Akwụkwọ Abụ Ọma 37:10, sịrị: “N’oge na-adịghị anya, ndị ajọ omume agaghịzi anọ. Ị ga-ele anya n’ebe ha na-anọ, ma ha agaghị anọ ya.”

Ihe Ndị Gbara Mkpughe 21:1 Gburugburu

 Akwụkwọ Mkpughe buru amụma ihe ndị ga-eme “n’ụbọchị Onyenwe anyị.” (Mkpughe 1:10) Amụma Baịbụl gosiri na ụbọchị ahụ malitere n’afọ 1914, mgbe e chiri Jizọs Eze Alaeze Chineke, ya amalite ịchị. b Ma, ọ bụghị ya na-achị ụwa ugbu a. Amụma ndị ọzọ kwudịrị na ihe ga-akakwu njọ n’ụwa ma ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ malite. Ihe a na-akpọ oge ahụ bụ “oge ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1-5, 13; Matiu 24:3, 7; Mkpughe 6:1-8; 12:12) Mgbe oge ahụ dị oké egwu nke nsogbu juru na ya ga-agwụcha, Alaeze Chineke ga-ewepụ eluigwe na ụwa ahụ e ji mee ihe atụ ma mee ka ndị mmadụ dịrị n’udo, dịkwa n’otu. Ndị Alaeze Chineke ga-achị, ya bụ, “ụwa ọhụrụ” ahụ, ga-ebizi n’ụwa mara ezigbo mma, ebe nsogbu na-adịghị.​—Mkpughe 21:3, 4.

 Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Mkpughe na-ekwu.

a McClintock and Strong’s Cyclopedia (1891), Mpịakọta IV, peeji nke 122.