Gaa n'Isiokwu

Ọ Bụrụ na Ọ Na-agụ M Agụụ Ka Mụ na Nwoke Ibe M Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Nwee Mmekọahụ, Ọ̀ Pụtara na Mụ na Ya Ga-enwerịrị Ya?

Ọ Bụrụ na Ọ Na-agụ M Agụụ Ka Mụ na Nwoke Ibe M Ma Ọ Bụ Nwaanyị Ibe M Nwee Mmekọahụ, Ọ̀ Pụtara na Mụ na Ya Ga-enwerịrị Ya?

Mbanụ!

 Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị na-eto eto, ndị ọ na-agụ agụụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ, na-emecha kwụsị inwe ụdị agụụ ahụ.

 Ihe otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Lisette kwuru gosiri na ihe a anyị kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “Ihe a kụziiri anyị n’ụlọ akwụkwọ mere ka m ghọta na mgbe mmadụ na-eto, ọtụtụ ihe na-agbanwe n’ahụ́ ya. Obi siri m ike na ọ bụrụ na ndị na-eto eto amatakwuo ihe na-eme n’ahụ́ ha, ha ga-aghọta na onye ọ na-agụ agụụ ka ya na nwoke ibe ya ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ nwere ike imecha tofee ya. Ọ ga-emekwa ka ha ghara ịga nwewe ụdị mmekọahụ ahụ.”

Ndị na-eto eto niile ga-ekpebi ma hà ga-eso ụzọ ọjọọ ụwa a si ele mmekọahụ anya, ka hà ga-eme omume ọma Okwu Chineke kwuru ka a na-eme

 Ma, ọ bụrụkwanụ na nke gị ekwebeghị gị ntofe? Ị̀ ga-asị na Chineke mere gị ihe ọjọọ ma ọ gwa gị ekwekwala ka gị na nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwee mmekọahụ?

 Ọ bụrụ na ị sị na Chineke mere gị ihe ọjọọ ma ya gwa gị emela ụdị ihe ahụ, mara na ihe mere i ji kwuo ya bụ maka na ndị mmadụ na-asị na onye mee ihe gụrụ ya, o meghị ihe ọjọọ. Ma, Baịbụl mere ka o doo anya na ọ bụghị iwu na mmadụ ga-emerịrị ihe gụrụ ya. Kama, Chineke kere anyị otú anyị ga na-arụ ahụ́ anyị ụka.​—Ndị Kọlọsi 3:5.

 Anyị mee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-abara anyị uru. O kwuru na ndị ọ na-agụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ kwesịrị ‘ịgbara ịkwa iko ọsọ’ otú ahụ mmadụ na-ekwesịghị ikwe ka ya na onye na-abụghị di ya ma ọ bụ nwunye ya dinaa. (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nweela ọtụtụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-akwabu iko ma mechaa mụta ịna-ejide onwe ha otú Baịbụl kwuru n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa na-anwa ha. Ndị ọ na-agụ agụụ ka ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwee mmekọahụ ga-ejideli onwe ha ma ọ bụrụ na ha chọrọ ime Chineke obi ụtọ.​—Diuterọnọmi 30:19.