Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 6:1-20

  • Ụmụnna na-akpụpụ ibe ha ụlọikpe (1-8)

  • Ndị na-agaghị eketa Alaeze Chineke (9-11)

  • Jirinụ ahụ́ unu na-eto Chineke (12-20)

    • “Gbaaranụ ịkwa iko ọsọ” (18)

6  Gịnị mere o ji abụ unu na ibe unu see okwu,+ unu ewega okwu unu n’ụlọikpe ka ndị na-amaghị Chineke kpeere unu ikpe? Ọ́ bụghị ndị nsọ ka unu kwesịrị ịga kpesara ya?  Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị nsọ ga-ekpe ụwa ikpe?+ Ọ bụrụkwa na ọ bụ unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ̀ bụzi ụmụ obere ihe ndị na-esere unu ka unu na-agaghị edozili?  Ọ̀ bụ na unu amaghị na anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi ikpe?+ Gịnịzi mere na anyị agaghị edozili ụmụ obere ihe ndị na-esere anyị ugbu a?  N’ihi ya, ọ bụrụ na unu nwere obere okwu ndị e kwesịrị idozi,+ gịnị mere o ji bụrụ ndị ọgbakọ weere na ha erughị eru na-ekpere unu ikpe?  M na-ekwu ihe a ka ihere mee unu. Ọ̀ bụ na e nweghị onye ọ bụla ma ihe n’ime unu ga-ekpeziliri nwanna na nwanna ibe ya?  Ma, nwanna na nwanna na-aga n’ụlọikpe, ndị na-amaghị Chineke ana-ekpere ha ikpe.  Ọ bụrụ na unu na-akpụpụ ibe unu ụlọikpe, unu na-emenye onwe unu ihere. Gịnị mere unu enweghị ike idi ihe ọjọọ ụmụnna unu mere unu?+ Ọ́ kaghị mma ka unu hapụ ha ka ha rigbuo unu?  Ma, unu na-eme ụmụnna unu ihe ọjọọ, na-erigbukwa ha.  Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa Alaeze Chineke?+ Unu ekwela ka e duhie unu. Ndị na-akwa iko,*+ ndị na-ekpere arụsị,+ ndị di ma ọ bụ ndị nwunye na-akwa iko,+ ndị na-ekwe ka ụmụ nwoke ibe ha dinaa ha,+ ndị na-edina ụmụ nwoke ibe ha,*+ 10  ndị ohi, ndị anyaukwu,+ ndị aṅụrụma,+ ndị na-ekwujọ mmadụ,* nakwa ndị na-apụnara mmadụ ihe, agaghị eketa Alaeze Chineke.+ 11  Ụfọdụ n’ime unu na-akpabu àgwà ndị a. Ma, Chineke asachaala unu,+ doo unu nsọ,+ kpọọkwa unu ndị ezi omume+ n’aha Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nakwa n’ike mmụọ nsọ. 12  Enwere m ike ime ihe niile iwu na-egbochighị m ime, ma ọ bụghị ha niile bara uru.+ Enwere m ike ime ihe niile iwu na-egbochighị m ime, ma agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla na-achị m. 13  Nri bụ maka afọ, afọ bụkwa maka nri, ma Chineke ga-ebibi ma afọ ma nri.+ Ahụ́ anyị abụghị maka ịkwa iko,* kama ọ bụ maka iji rụọrọ Onyenwe anyị ọrụ.+ Onyenwe anyị na-elekọtakwa ahụ́ anyị. 14  Ma Chineke kpọlitere Onyenwe anyị n’ọnwụ.+ Ọ ga-ejikwa ike ya+ kpọlite anyị n’ọnwụ.+ 15  Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu na ahụ́ Kraịst bụ otu?+ Ùnu chere na m ga-esi n’ahụ́ unu wepụ ahụ́ Kraịst ma mee ka ahụ́ unu na ahụ́ nwaanyị akwụna bụrụ otu? Tụfịakwa! 16  Ọ̀ bụ na unu amaghị na onye ya na nwaanyị akwụna kwara iko, ya na ya bụzi otu ahụ́? N’ihi na Chineke sịrị, “Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́.”+ 17  Ma onye ya na Onyenwe anyị dị n’otu, ya na ya bụ otu mmụọ.+ 18  Gbaaranụ ịkwa iko* ọsọ.+ Mmadụ mee mmehie ọ bụla ọzọ, onye ahụ emehieghị ahụ́ ya, ma onye na-akwa iko na-emehie ahụ́ ya.+ 19  Ọ̀ bụ na unu amaghị na ahụ́ unu bụ ụlọ nsọ,+ nakwa na mmụọ nsọ Chineke nyere unu bi na ya?+ Ọ bụghịzi unu nwe onwe unu,+ 20  n’ihi na Chineke ji ihe dị oké ọnụ zụta unu.+ N’ihi ya, jirinụ ahụ́ unu+ na-eto Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “ụmụ nwoke ndị ha na ụmụ nwoke na-enwe mmekọahụ.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”
Ma ọ bụ “ndị na-akparị mmadụ.”
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.