Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova nke Afọ 2016

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova nke Afọ 2016

Ụmụnna anyị na-akwụsi ike n’ebe Jehova nọ ma n’oge ihe siri ike ma n’oge ndị ha nwere okwu n’ụlọikpe. Ihe a ha na-eme na-agba anyị ume ịkwụsi ike n’okwukwe, ebe anyị ma na “Jehova ga-emeso onye na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ mmeso pụrụ iche.”​—⁠Ọma 4:⁠3.

AJENTINA | Nne na Nna Nwere Ikike Ịkụziri Nwa Ha Ihe Ha Kweere

E nwere otu nwaanyị aha ya bụ Ruth. A mụrụ ya n’ọgbakọ ma ọ pụrụ mgbe ọ dị obere. E mechara ya na otu nwoke amalite ịkpa, ya amụọrọ ya otu nwa nwaanyị. Otu ụbọchị, mgbe ọ nọ n’obodo a na-akpọ La Plata, ọ hụrụ Ndịàmà Jehova dosara akwụkwọ anyị na tebụl, ya echeta na a mụkwaranụ ya n’ọgbakọ. Ihe a mere ka ọ lọghachi n’ọgbakọ, malitekwa ịkụziri nwa ya nwaanyị Baịbụl. Ma, di ya gbara ya akwụkwọ n’ụlọikpe n’ihi na ọ chọghị ka Ruth na-akụziri nwa ha ihe ndị o kweere, nakwa ka ọ na-akpọ ya aga ọmụmụ ihe.

Onye ọkàiwu na-ekpechite ọnụ Ruth kwuru na ha abụọ nwere ikike ịkụziri nwa ha ihe ha kweere. O kwukwara na ụlọikpe ekwesịghị ịkwụsị onye nke ọ bụla ịkụziri nwa ha ihe, ọ gwụla ma à chọpụtara na ihe a na-akụziri nwa ahụ na-emebi ya. N’agbanyeghị na nwatakịrị ahụ dị naanị afọ anọ mgbe ahụ, ụlọikpe ahụ kpebiri na ndị mụrụ ya kwesịrị ịhapụ ya ka o jiri aka ya kpebie okpukpe ọ ga-ekpe. Ebe ọ bụ na nwa ha dị obere, Ruth gbara akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe ka e mee ka okwu ahụ dokwuo anya. Ụlọikpe ahụ kwuru na ebe ọ bụ na nwa ahụ agaghị ejili aka ya kpebie okpukpe ọ ga-ekpe, papa ya na mama ya nwere ikike ịkụziri ya ihe ha kweere.

Nwa Ruth na-agụ Baịbụl ya n’abalị ọ bụla. Ọ na-esokwa ya aga ọmụmụ ihe. Ọ na-atụsi anya ike mgbe ha ga-aga leta Betel dị na Buenos Aires.

AZEBAỊJAN | Ikike Mmadụ Nwere Ịgwa Ndị Ọzọ Ihe O Kweere

Pọl onyeozi kwuru na n’ọgbakọ ezigbo Ndị Kraịst, ‘ọ bụrụ na otu akụkụ ahụ́ na-ata ahụhụ, akụkụ ndị ọzọ dum na-eso ya ata ahụhụ.’ (1 Kọr. 12:26) Ihe Ndịàmà Jehova nọ n’ụwa niile mere mgbe a kpọchiri Nwanna Nwaanyị Irina Zakharchenko na Nwanna Nwaanyị Valida Jabrayilova n’ụlọ mkpọrọ n’Azebaịjan, gosiri na ihe a bụ eziokwu. N’ọnwa Febụwarị afọ 2015, ndị ọchịchị nwụchiri ha mgbe ha nọ n’ozi ọma ma sị na ozi ọma ha na-ezi megidere iwu. Ọkàikpe ji okwu a kwuru ka a kpọchie ha ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe. Ma, ọ nọgidere na-eyigharị ikpe ahụ nke mere na ụmụnna nwaanyị ndị a nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu afọ tupu eleba okwu ha anya. E mekpọkwara ha ọnụ ma napụ ha ihe ndị ruuru ha.

Azebaịjan: Nwanna Nwaanyị Valida Jabrayilova na Nwanna Nwaanyị Irina Zakharchenko

Mgbe ọkàikpe ahụ mechara kpee ụmụnna nwaanyị ndị a ikpe na Jenụwarị afọ 2016, ọ mara ha ikpe ma rie ha nhá. Ma, o mechara kagbuo nhá ahụ, ma sị ha laa ebe ọ bụ na ha anọọla ọtụtụ ọnwa n’ụlọ mkpọrọ. Ụmụnna nwaanyị ndị a gbara akwụkwọ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe dị na Baku ka e lebagharịa anya n’ebubo e boro ha na ha dara iwu. Ụlọikpe a kwuru na ya kwụ ebe nke mbụ kpere ha ikpe kwụ. Ha gbaziri akwụkwọ n’Ụlọikpe Kasị Elu. Ha degakwaara Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ akwụkwọ mkpesa ka ha mara gbasara otú e si napụ ha ikike ha nwere ịgwa ndị ọzọ ihe ha kweere nakwa otú e si mekpọọ ha ọnụ.

Ka ọ dị ugbu a, ụmụnna nwaanyị ndị a ji nwayọọ nwayọọ na-enweta onwe ha. Ha kwuru na obi dị ha ụtọ maka ọtụtụ ekpere anyị kpeere ha, nakwa otú anyị si gosi na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi. Nwanna Nwaanyị Jabrayilova degaara Òtù Na-achị Isi akwụkwọ ozi. O kwuru, sị: “Ekpere unu nyeere anyị aka idi nsogbu anyị. Ha ruru m n’ahụ́. Agaghị m echefu ịhụnanya unu na Jehova, nakwa ụmụnna anyị n’ụwa niile gosiri anyị.”

ERITRIA | A Tụrụ Ha Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere

Ka ọ na-erule ọnwa Julaị afọ 2016, gọọmenti Eritria akpọchiela Ndịàmà Jehova iri ise na ise n’ihi ihe ha kweere. E nwere ụmụnna nwoke atọ ha kpọchiri kemgbe ọnwa Septemba afọ 1994. Aha ha bụ Paulos Eyassu, Isaac Mogos, na Negede Teklemariam. E nwekwara ụmụnna nwoke itoolu ọzọ ha kpọchiri ọ dịkarịa ala kemgbe afọ iri.

Ma, e nwere otu ihe dị mma gọọmenti obodo a na-emetụbeghị mbụ, ha mere n’ọnwa Jenụwarị afọ 2016. Ihe ahụ bụ na a kpọpụrụ ụmụnna anyị a nwụchiri n’ụlọikpe. A nwụchiri ha n’ọnwa Eprel afọ 2014 mgbe a na-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs n’obodo Asmara. Nke a bụ nke mbụ gọọmenti obodo a na-ekwu iwu ha sị ụmụnna anyị dara ma kpọpụ ha n’ụlọikpe ka ha zara ọnụ ha. Ma, dị ka a tụrụ anya ya, ha mara ha ikpe sị na ha na-enwe ọmụmụ ihe iwu na-akwadoghị. E riri ha nhá, hapụkwa ha ka ha laa. Ma, akọnuche Nwanna Nwaanyị Saron Gebru, so ná ụmụnna ndị ahụ a kpọchiri, ekweghị ya kwụọ ụgwọ ahụ. N’ihi ya, a tụrụ ya mkpọrọ ọnwa isii. E kwere ka ndị mmadụ na-abịa eleta ya otu ugboro n’izu. O kwuru na a na-emeso ya ihe nke ọma ebe ahụ. Obi dị ya na ụmụnna iri ise na anọ ndị ọzọ a tụrụ ya na ha mkpọrọ ụtọ maka ọtụtụ ekpere ụmụnna na-ekpere ha. Anyị niile ‘na-echeta ndị nọ n’agbụ ụlọ mkpọrọ dị ka à ga-asị na e kere anyị na ha agbụ.’​—⁠Hib. 13:⁠3.

JAMANỊ | Iwu Kwadoro Ka Ha Nwetakwuo Ihe Ruuru Ha

N’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Disemba afọ 2015, steeti Bremen, nke dị n’ebe ugwu Jamanị, mechara nyekwuo Ndịàmà Jehova ikike ịna-enwetakwu ihe ndị ruuru ha otú iwu kwuru okpukpe ọ bụla kwesịrị ịna-enweta. Ọ bụ ihe a mere ka okwu Ndịàmà Jehova na steeti Bremen nwere n’ụlọikpe kemgbe afọ anọ bie. Tupu mgbe ahụ, otu ụlọikpe ka elu na Belin kwuru ka a na-enye Ndịàmà Jehova ihe ndị ruuru ha otú iwu kwuru. N’ihi ihe a ụlọikpe a kpebiri, ọtụtụ n’ime steeti iri na isii dị na Jamanị na-enyezi Ndịàmà Jehova ihe ndị ahụ ruuru ha. Ma, steeti Bremen ekwetaghị ime ya n’ihi ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị na-emegide anyị na-ekwu banyere anyị.

N’afọ 2015, ụlọikpe na-ahụ maka ihe ndị metụtara iwu na-achị mba na Jamanị kwuru na ihe a steeti Bremen na-eme bụ ịnapụ Ndịàmà Jehova ihe iwu kwuru ruuru ha. Ihe a ụlọikpe a kwuru gosiri na iwu kwadoro Ndịàmà Jehova nọ na Bremen inweta ihe ndị ruuru ha. Ọgbakọ ndị e nwere ebe ahụ ekwesịghị ịna-atụ ụtụ isi. E kwesịkwara ịna-emere ha ihe a na-emere okpukpe ndị ọzọ na Jamanị.

KEGỊSTAN | Ikike Mmadụ Nwere Ịgwa Ndị Ọzọ Ihe O Kweere

N’ọnwa Mach afọ 2013, ndị ọchịchị obodo Osh dị na Kegịstan boro Nwanna Nwaanyị Oksana Koriakina na mama ya bụ́ Nadezhda Sergienko ebubo. Ọkàiwu na-ekpechite ọnụ obodo Osh kwuru na ụmụnna ndị a nọ na-erigbu ndị mmadụ sị na ha na-akụziri ha Baịbụl. Ọkàikpe ji okwu ahụ kwuru ka a tụọ ha mkpọrọ n’ụlọ ha ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe. N’Ọktoba afọ 2014, ụlọikpe kwuru na ebubo ahụ e boro ụmụnna ahụ abụghị eziokwu, mkpọrọ a tụrụ ha n’ụlọ ha ekwesịghịkwa ekwesị, nakwa na aka ha dị ọcha. Ma, ọkàiwu na-ekpechite ọnụ obodo Osh wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe. N’Ọktoba afọ 2015, ụlọikpe mkpegharị ikpe kwadokwara ihe ụlọikpe mbụ a kwuru.

Ma, ọkàiwu ahụ wepụziri okwu ahụ n’Ụlọikpe Kacha Elu na Kegịstan. Ụlọikpe a kagburu ikpe ahụ e kpelaara ụmụnna nwaanyị ndị ahụ ma sị ka e kpegharịa ya. Mgbe a kpọlitere ikpe ahụ n’ọnwa Eprel afọ 2016, ndị ọkàiwu na-ekpechite ọnụ ụmụnna nwaanyị ndị ahụ kwuru ka a kagbuo ya n’ihi na oge e kwesịrị iji gbaa akwụkwọ maka ikpegharị ya agafeela. N’ihi ya, ọkàikpe ji ikpe ahụ kagburu ya. Ọ bụ otú a ka ikpe ahụ si bie.

N’oge niile ahụ ikpe ahụ na-aga n’ihu, obi anaghị ajọ ụmụnna nwaanyị ndị ahụ njọ. Nwanna Nwaanyị Sergienko kwuru, si: “Obi na-ajọkarị ndị mmadụ njọ ma a na-emekpọ ha ọnụ, ma m hụrụ na Jehova si n’aka ụmụnna anyị lekọta anyị ma gosi anyị na ọ hụrụ anyị n’anya. O nweghị mgbe ọ hapụrụ anyị.” Ụmụnna nwaanyị ndị a ji anya ha hụ na Jehova na-emezu ihe o kwuru n’Aịzaya 41:10. Ebe ahụ kwuru, sị: “Atụla egwu, . . . m ga-eji aka nri m nke ezi omume jidesie gị ike.”

KEGỊSTAN | Iwu Kwadoro Ndịàmà Jehova Ikpe Okpukpe Ha

N’abalị itoolu n’ọnwa Ọgọst afọ 2015, ndị uwe ojii iri wabatara n’ebe otu ọgbakọ nọ na-enwe ọmụmụ ihe n’obodo Osh dị na Kegịstan. Ha sịrị ụmụnna anyị kwụsị ọmụmụ ihe ha na-enwe ozugbo n’ihi na ha sịrị na iwu akwadoghị ya. Ha kwudịrị na ha ga-agbagbu ihe dị ka mmadụ iri anọ bịara ọmụmụ ihe ahụ. Ndị uwe ojii ahụ kpụụrụ ụmụnna iri gawa n’ụlọ ọrụ ha, kụọ mmadụ itoolu n’ime ha ezigbo ihe ma hapụ ha niile ka ha laa. Mgbe ụbọchị abụọ gachara, ha bịakwara kpụrụ otu n’ime ụmụnna ndị ahụ ha kụrụ ihe. Aha nwanna ahụ bụ Nurlan Usupbaev. Ha kwuru na ọ na-eduzi ọmụmụ ihe iwu na-akwadoghị ma gbaa ya akwụkwọ n’ụlọikpe Osh Siti.

Mgbe e lebara ikpe ahụ anya n’ụlọikpe Osh Siti, ọkàikpe ji okwu ahụ kagburu ya n’ihi na ọ chọpụtara na e nweghị ihe gosiri na Nwanna Usupbaev dara iwu. Ọkàiwu gbara akwụkwọ ahụ n’ụlọikpe wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe mkpegharị ikpe dị na Osh. Ụlọikpe a kagbukwara ikpe a ma kwuo na ikpe amaghị Nwanna Usupbaev n’ihi na e debara aha Ndịàmà Jehova n’akwụkwọ ka okpukpe iwu kwadoro na Kegịstan.

Ike agwụghị ọkàiwu ahụ. O wepụkwara okwu ahụ n’Ụlọikpe Kasị Elu na Kegịstan. N’ọnwa Mach afọ 2016, ụlọikpe a kagbukwara ikpe ahụ. Ọ kwadoro ihe ụlọikpe abụọ mbụ kpere ikpe a kpebiri, ya bụ, na Ndịàmà Jehova nweere onwe ha inwe ọmụmụ ihe ha na Kegịstan. Ụmụnna ndị ahụ ndị uwe ojii Osh kụrụ ezigbo ihe gbara ha akwụkwọ n’ụlọikpe ụfọdụ dị n’obodo ahụ. Ma, ka ọ dị ugbu a, ụlọikpe ndị ahụ e tinyebeghị ha ọnụ.

RỌSHỊA | Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe

N’agbanyeghị ezigbo mbọ ndị na-ahụ maka ihe ruuru mmadụ ná mba Rọshịa na-agba ka gọọmenti Rọshịa kwụsị ịna-enye ụmụnna anyị nọ ebe ahụ nsogbu ikpe okpukpe ha, ha ka na-enye ha nsogbu. Ka ọ dị ugbu a, ha amachieala akwụkwọ anyị dị iri asatọ na asatọ iwu ma kwuo na ha bụ akwụkwọ na-eduhie ndị mmadụ. Ha machikwara ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org n’obodo ha. N’afọ  2015, ndị kọstọm ekweghị ka e bubata Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ na Rọshịa. Otu ụlọikpe dị na Vibọg na-atụlekwa ma Baịbụl a ọ̀ ga-eso ná ndị ha ga-amachi n’iwu ka akwụkwọ na-eduhie ndị mmadụ. N’ọnwa Mach afọ 2016, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịgba Ndị Mmadụ Akwụkwọ na Rọshịa sịrị na ha ga-emechi alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Solneknoye, dị ná mpụga mpụga Sent Pitasbọg. Ha sịrị na ọ na-agba ọchịchị mgba okpuru.

N’agbanyeghị nsogbu a niile gọọmenti na-enye Ndịàmà Jehova n’obodo a, e nwere ihe ọma ndị meere anyị. N’ọnwa Ọktoba afọ 2015, ọkàiwu na-agba akwụkwọ gbara akwụkwọ ka a machie Ndịàmà Jehova nọ n’obodo Tyumen iwu. Obodo a dị ihe dị ka puku kilomita abụọ na otu narị ma e si Mọsko gawa ya. N’agbanyeghị na o doro ụlọikpe dị na Tyumen anya na ndị uwe ojii ma ụma na-ebo anyị ebubo, ha kwuru ka a machie Ndịàmà Jehova nọ ebe ahụ iwu. Ma, n’abalị iri na ise n’ọnwa Eprel afọ 2016, Ụlọikpe Kasị Elu na Rọshịa kagburu mkpebi ahụ. Ụlọikpe a kwuru na “e nweghị ihe mere a ga-eji amachi Ndịàmà Jehova nọ na Tyumen iwu.” Mgbe ọkàikpe ji okwu ahụ na-agụpụta mkpebi a, ụmụnna iri isii nọ n’ebe ahụ biliri, kụwa ezigbo aka.

Ndịàmà Jehova nọ na Rọshịa kpebisiri ike na ha ga-anọgide na-efe Jehova n’agbanyeghị ‘ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso ha ọgụ.’​—⁠Aịza. 54:⁠17.

RỤWANDA | Onye Ọ Bụla Nweere Onwe Ya Ịga Akwụkwọ n’Agbanyeghị Okpukpe Ọ Na-ekpe

Kemgbe afọ ole na ole ugbu a, a na-achụpụ ụmụ Ndịàmà Jehova n’ụlọ akwụkwọ na Rụwanda. Ihe kpatara ya bụ na ha anaghị eso ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ eme ihe gbasara okpukpe ma ọ bụ na-ekwe ukwe e ji eto mba. Ndị ọchịchị achọghịzi ka ụdị ihe a na-eme. Ọ bụ ya mere ha ji nye iwu n’abalị iri na anọ n’ọnwa Disemba afọ 2015 ka a kwụsị inye ụmụaka nsogbu n’ụlọ akwụkwọ n’ihi okpukpe ha. Iwu ahụ kwuru na ụlọ akwụkwọ ekwesịghị ịna-enye ụmụ akwụkwọ nsogbu n’ihi na ha nweere onwe ha ikpe okpukpe masịrị ha.

N’abalị itoolu n’ọnwa Jun, afọ 2016, e nwere otu isiokwu gbara n’ebe a na-akpọ Akụkọ na jw.org. Isiokwu ahụ bụ “Gọọmenti Rụwanda Enye Iwu Ka A Kwụsị Nsogbu A Na-enye Ụmụ Akwụkwọ n’Ihi Okpukpe Ha.” Otu akwụkwọ akụkọ a ma ama tinyere ihe a n’akwụkwọ akụkọ ha na-adị n’Ịntanet. Obere oge, ihe karịrị puku mmadụ atọ gụrụ ihe ahụ ha dere ma kwuo okwu ọma gbasara ihe ahụ gọọmenti mere. Obi na-atọ Ndịàmà Jehova nọ na Rụwanda ụtọ n’ihi iwu a gọọmenti nyere n’ihi na o mere ka obi sie ha ike na ụmụ ha nweziri ike ịga akwụkwọ n’enweghị onye na-enye ha nsogbu n’ihi okpukpe ha.

Rụwanda: Obi dị ha ụtọ na a kpọghachịla ha n’ụlọ akwụkwọ

SAỤT KORIA | Mmadụ Ịjụ Ịba Amị n’Ihi Akọnuche Ya

Kemgbe ihe karịrị afọ iri isii ugbu a, gọọmenti Saụt Koria chọrọ ka ụmụ nwoke bụ́ Ndịàmà Jehova nọ n’agbata afọ iri na itoolu na afọ iri atọ na ise na-aba amị. Gọọmenti Saụt Koria enweghị iwu kwuru na mmadụ nwere ike ịjụ ịba amị n’ihi akọnuche ya, o nwekwanụghị ọrụ na-abụghị ọrụ agha ha na-enye onye jụrụ ịba amị. Nke a emeela ka a tụọ ọtụtụ ụmụnna anyị mkpọrọ. Dị ka ihe atụ, n’ezinụlọ ụfọdụ, a tụọla ma nna, ma nwa ma nna nna mkpọrọ n’ihi na ha jụrụ ịba amị mgbe ha ruru ịba amị.

Ụlọikpe Na-eleba Anya n’Ihe Gbasara Iwu Obodo na Saụt Koria e kpebiela ugboro abụọ na iwu kwadoro ịmanye ndị ruru ịba amị ka ha baa amị. Ma ụlọikpe ndị obere na ndị ahụ a na-emekpọ ọnụ n’ihi na ha jụrụ ịba amị n’ihi akọnuche ha na-arịọ ka ụlọikpe a lebagharịa ihe ha kpebiri anya. Ọ bụ ya mere na n’abalị itoolu n’ọnwa Julaị afọ 2015, ụlọikpe ahụ nyere ndị ahụ jụrụ ịba amị ohere ka ndị ọkàiwu ha kpechite ọnụ ha. Otu nwanna aha ya bụ Min-hwan Kim nọrọ n’ụlọ mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii n’ihi na akọnuche ya ekweghị ya baa amị. O kwuru, sị: “Atụọla m mkpọrọ ma mechaa hapụ m. Ma, ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na agaghị atụ ndị ọzọ jụrụ ịba amị n’ihi akọnuche ha mkpọrọ. Ọ bụrụ na a sị ha rụwa ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ agha, ha ga-abara obodo uru.” A na-atụ anya na ụlọikpe ahụ ga-ekpebi okwu a n’oge na-adịghị anya.

TỌKMENESTAN | Bahram Hemdemov

Nwanna Hemdemov dị afọ iri ise na atọ. O nwere nwunye na ụmụ nwoke anọ. O ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị obodo ya na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù. N’ọnwa Mee afọ 2015, a mara ya ikpe ma tụọ ya mkpọrọ afọ anọ n’ebe ọ ga na-arụgbu onwe ya n’ọrụ. Ha sịrị na ọ na-eduzi ọmụmụ ihe iwu na-akwadoghị n’ụlọ ya. Ọ bụ n’ụlọ mkpọrọ jọrọ ezigbo njọ dị n’obodo Seydi ka ha tinyere ya. A gbaala ya ajụjụ ọtụtụ ugboro, kụọkwa ya ezigbo ihe. Ma Nwanna Hemdemov ma ndị ezinụlọ ya ka guzosiri ike n’ebe Jehova Chineke nọ. Nwunye ya aha ya bụ Gulzira na-aga eleta ya mgbe ụfọdụ ma na-agba ya ume.

Ka ụmụnna anyị na-eguzosi ike n’ebe Jehova nọ n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara ha, anyị na-echeta ha n’ekpere. Otú ha si na-eguzosi ike na-eme ka anyị na-eguzosikwa ike n’ebe Jehova nọ n’ihi na anyị ma na ọ ga-emezu ihe o kwuru n’Abụ Ọma 37:28. Ebe ahụ kwuru, sị: “Ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.”