Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AJỤJỤ NKE 8

Ajụjụ nke 8: Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata?

“Chineke emekataghị mee ihe ọjọọ. Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emekataghị mee ihe na-adịghị mma.”

Job 34:10

“Ka onye ọnwụnwa bịaara ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na o nweghị onye nwere ike iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, Chineke anaghịkwa eji ihe ọjọọ anwa onye ọ bụla.”

Jems 1:13

“Na-akọrọnụ ya ihe niile na-echegbu unu, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”

1 Pita 5:7

“Jehova anaghị egbu oge imezu nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị chere. Kama, ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na o nweghị onye ọ chọrọ ka e bibie, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”

2 Pita 3:9