Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

B1

Ihe Baịbụl Na-ekwu

Ọ bụ Jehova Chineke kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Otú o si achị kacha mma. Ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ ga-emezu.

Mgbe Afọ 4026 T.O.N.K. Gachara

“Agwọ ahụ” mara Jehova aka, sị na otú o si achị adịghị mma nakwa na o kwesịghị ịchị. Jehova kwere nkwa na ya ga-eme ka e nwee “nwa” ma ọ bụ “mkpụrụ” nke ga-emecha gwepịa agwọ ahụ bụ́ Setan isi. (Jenesis 3:1-5, 15, ihe e dere n’ala ala peeji ya) Ma, Jehova hapụgodịrị agwọ ahụ ka o jiri ụmụ mmadụ kwara ngwá ọrụ o ji achị ụwa.

Afọ 1943 T.O.N.K.

Jehova gwara Ebreham na “nwa” ahụ o kwere ná nkwa ga-abụ otu n’ime ụmụ ya.—Jenesis 22:18.

Mgbe Afọ 1070 T.O.N.K. Gachara

Jehova gwara Eze Devid nakwa nwa ya bụ́ Solomọn na “nwa” ahụ o kwere ná nkwa ga-esi n’ezinụlọ ha.—2 Samuel 7:12, 16; 1 Ndị Eze 9:3-5; Aịzaya 9:6, 7.

Afọ 29 O.N.K.

Jehova mere ka a mata na ọ bụ Jizọs bụ “nwa” ahụ o kwere ná nkwa, onye ga-anọchi n’ocheeze Devid.—Ndị Galeshia 3:16; Luk 1:31-33; 3:21, 22.

Afọ 33 O.N.K.

Agwọ ahụ bụ́ Setan merụrụ “nwa” ahụ Chineke kwere ná nkwa ahụ́ mgbe o mere ka e gbuo Jizọs. Ma, Jehova kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, mee ka ọ dịrị ndụ n’eluigwe. Ọ nabatakwara àjà Jizọs ji ndụ ya zuru okè chụọ. Ọ bụ àjà ahụ mere o ji agbaghara ụmụ Adam mmehie ha, ọ bụkwa ya mere ọ ga-eji enye ha ndụ ebighị ebi.—Jenesis 3:15; Ọrụ Ndịozi 2:32-36; 1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22.

Ihe Dị Ka n’Afọ 1914 O.N.K.

Jizọs chụdara agwọ ahụ bụ́ Setan n’ụwa. Ọ ga-anọ n’ụwa obere oge.—Mkpughe 12:7-9, 12.

N’Ọdịnihu

Jizọs ga-atụ Setan mkpọrọ otu puku afọ. E mechaa, ọ ga-egwepịa ya isi, nke pụtara igbu ya egbu. Ihe Jehova bu n’obi kee ụmụ mmadụ na ụwa ga-emezuzi. O nwekwaghị onye ga-emebi aha ya, ọ ga-edokwa onye ọ bụla anya na otú o si achị kacha mma.—Mkpughe 20:1-3, 10; 21:3, 4.