Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

M Na-ewebu Iwe Ọkụ, Na-alụkwa Ọgụ

M Na-ewebu Iwe Ọkụ, Na-alụkwa Ọgụ
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1974

  • ABỤ M ONYE: MEKSIKO

  • NDỤ M BIRI: E JI ỊLỤ ỌGỤ N’OKPORO ÁMÁ MARA M

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo Siudad Mante. Ọ bụ obere obodo mara mma dị́ na steeti Tamaulipas dị na Meksiko. Ndị obodo anyị na-emesapụ aka, dịrịkwa obiọma. Ma, ndị ọjọọ juru na ya anaghị ekwe ndị mmadụ ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

Anyị dị ụmụ nwoke anọ n’ezinụlọ anyị. Abụ m nke abụọ. Ndị mụrụ m mere m baptizim na Chọọchị Katọlik. M mechara soro ná ndị òtù ukwe na parish anyị. M chọrọ ime ihe dị Chineke mma n’ihi na achọghị m ịga ọkụ ala mmụọ.

Papa m na mama m gbasara mgbe m dị afọ ise, papa m ahapụ anyị. Ihe a o mere wutere m, meekwa ka obi gbawaa m. Aghọtaghị m ihe mere o ji hapụ anyị ebe anyị hụrụ ya n’anya. Ihe mama m bịaziri na-eme bụ, ya gaa ọrụ, ya anọọ ogologo oge ka o nwee ike inweta ego ọ ga-eji elekọta mụ na ụmụnne m ndị ọzọ.

M jizi ohere ahụ na-ahapụ ịga akwụkwọ mgbe ụfọdụ ma soro ndị tọrọ m na-akpagharị. Ha kụziiri m ịdụ ikwu, ise sịga, izu ohi na iti ọkpọ. Ebe m chọrọ ka ndị ọzọ na-atụ m ụjọ, m mụrụ otú e si eti ọkpọ, otú e si agba mgba, otú e si agba karat nakwa otú e si e ji ngwá ọgụ alụ ọgụ. M bidoro ịna-alụ ọgụ aghara aghara. M na-ejikarị égbè alụ ọgụ. O nwekwara mgbe ụfọdụ a na-akụ m ọ́ dị ndụ ọnwụ ka mma, ahụ́ m niile abụrụ ọbara ọbara, a hapụ m n’okporo ámá. Obi na-amapụ mama m ma ya hụ ebe m tọgbọ n’okporo ámá. Ọ na-eburu m ozugbo gawa ụlọ ọgwụ.

Mgbe m dị afọ iri na isii, otu enyi m nwoke aha ya bụ Jorge bịara n’ụlọ anyị. Mụ na ya matara mgbe anyị ka dị obere. Ọ gwara anyị na ya bụzi Onyeàmà Jehova nakwa na o nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ịgwa anyị. O bidoro jiri Baịbụl gwawa anyị ihe ndị o kweere. Agụtụbeghị m Baịbụl mbụ, obi tọkwara m ụtọ mgbe o si na Baịbụl gwa m aha Chineke na ihe ndị Chineke zubere ime. Ọ gwara anyị ka ọ mụwara anyị Baịbụl, anyị ekweta.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Obi ruru m ala mgbe m mụtara na ọkụ ala mmụọ adịghị nakwa na Baịbụl ekwughị gbasara ya. (Abụ Ọma 146:4; Ekliziastis 9:5) Ozugbo m mụtara ya, m malitere iji obi m niile na-atụ Chineke egwu, ọ bụghịzi nke m na-atụbu ya n’ihi na achọghị m ịga ọkụ ala mmụọ. M bịaziri were ya ka Nna hụrụ m n’anya, onye chọrọ ka ihe gaziere ụmụ ya.

Ka m nọ na-amụ Baịbụl, achọpụtara m na o nwere àgwà m ụfọdụ m kwesịrị ịgbanwe. M kwesịrị ịmụta ịdị umeala n’obi, kwụsịkwa ịna-alụ ọgụ ma a kpasuo m iwe. Otu ihe nyeere m aka bụ ihe e dere ná 1 Ndị Kọrịnt 15:33, ebe sịrị na mkpakọrịta ọjọọ “na-emebi àgwà ọma.” O mere ka m ghọta na tupu mụ enwee ike ịgbanwe àgwà ọjọọ m, m ga-akwụsịrịrị iso ndị ọjọọ na-akpa. Akwụsịziri m iso ndị enyi m mbụ akpa, metezie Ndị Kraịst ibe m enyi. Ndị Kraịst ibe m a nwee nghọtahie, ha anaghị alụ ọgụ, kama, ha na-esi otú Baịbụl kwuru ka e si kpezie kpezie.

Amaokwu Baịbụl ndị ọzọ nyeere m aka bụ Ndị Rom 12:17-19. Ebe ahụ sịrị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ. . . . Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo. . . . Unu abọrọla onwe unu ọbọ, . . . n’ihi na e dere, sị: ‘“Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ,” ka Jehova kwuru.’” M bịara ghọta na Jehova ga-eme ka ihe ọjọọ kwụsị n’oge ọ chọrọ nakwa otú o si chọọ ya. M jizi nwayọọ nwayọọ, kwụsị ịlụ ọgụ.

Anaghị m echefu ihe mere n’otu mgbede m na-alọta ụlọ echefu. Ụfọdụ ụmụ okorobịa nọ́ n’òtù ndị ha na ndị òtù m nọbu na ya na-alụ ọgụ bịara chọwa m okwu. Onyeisi ha kụrụ m ihe n’azụ, sị m: “Ngwa, kụgwara m!” M kpeere Jehova ekpere ozugbo n’obi m, sị ya nyere m aka idi mkparịa a. Ọ bụ eziokwu na ọ nọ na-enu m enu ka m kụgwara ya, m mechara hapụ ya gawa. Echi ya, m hụrụ onyeisi ha ahụ ka naanị ya so. Iwe eju m obi, mụ achọwa imegwara ya. Ma, m kpeere Jehova ekpere ọzọ ka o nyere m aka ijide onwe m. Ihe m na-atụghị anya ya meziri. Onyeisi ha ahụ bịakwutere m, sị m: “Biko ewela iwe maka ihe ahụ m mere gị ná mgbede ụnyaahụ. Ị̀ ma na m na-achọ otú m ga-esi adị ka gị? M chọrọ ịmụ Baịbụl.” Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na m gbalịrị jide onwe m. E bidoziri mụwara ya Baịbụl.

O wutere m na ụmụnne m na mama m kwụsịrị ịmụ Baịbụl mgbe ahụ. Ma, m nọgidere na-amụ Baịbụl. Ekpebiri m na mee elu mee ala, agaghị m akwụsị ịmụ Baịbụl. Ama m na iso ndị Chineke na-akpa ga-eme ka obi ruo m ala, meekwa ka m nweta ụdị ndị m chọrọ ka mụ na ha na-anọ. M nọgidere na-amụ Baịbụl. N’afọ 1991, e mere m baptizim, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova.

URU NDỊ M RITERELA:

Abụbu m onye iwe ọkụ, na-alụkarị ọgụ, na-achọkarịkwa ka okwu bie n’ọnụ m. Ma, Okwu Chineke agbanweela ndụ m kpamkpam. Ugbu a, m na-ezi onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe Baịbụl kwuru ozi ọma gbasara otú ha na ibe ha ga-esi na-adị n’udo. M na-ekwusa ozi ọma oge niile kemgbe afọ iri abụọ na atọ ugbu a.

O nwere oge m gara rụtụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị́ na Meksiko. Mgbe m nọ ebe ahụ, m matara otu nwa agbọghọ bụkwa Onyeàmà Jehova. Aha ya bụ Claudia. Mụ na ya lụkwara n’afọ 1999. Obi dị m nnọọ ụtọ na Jehova ji ezigbo nwaanyị gọzie m.

N’oge ahụ, mụ na nwunye m nọ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-eji asụsụ ndị ogbi nke Meksiko amụ ihe. Anyị na-enyere ndị ogbi nọ́ ebe ahụ aka ịmụta gbasara Jehova. E mechara gwa anyị ka anyị kwaga Beliiz gaa kwusawa ozi ọma. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ebi ndụ okomoko, anyị nwere ihe niile na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ. O nweghị ọrụ na-atọ anyị ụtọ ka ozi anyị na-eje ebe a.

Mama m na Ndịàmà Jehova maliteghachịrị ịmụ Baịbụl, ya emechaakwa mee baptizim. Nwanne m nwoke nke tọrọ m na nwunye ya na ụmụ ha atọ bụ Ndịàmà Jehova ugbu a. Mgbe m ghọrọ Onyeàmà Jehova, mụ na ụfọdụ ndị bụbu ndị enyi m malitere ịmụ Baịbụl. Ha bụkwa Ndịàmà Jehova ugbu a.

Ọ na-ewute m na ụfọdụ ndị ezinụlọ anyị nwụrụ n’ihi na ha akwụsịghị iwe iwe ọkụ. Á sị na agbanweghị m, ònye manụ ma m gaara adị ndụ ruo ugbu a? M na-ekele Jehova maka ime ka m mata ya, matakwa ndị na-efe ya. Ha ji ndidi na obiọma nyere m aka ime ihe Baịbụl kwuru.