Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị kọrịnt 15:1-58

  • A kpọlitere Kraịst n’ọnwụ (1-11)

  • Okwukwe anyị hiwere isi ná mkpọlite a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ (12-19)

  • Mkpọlite a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ gosiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ (20-34)

  • Ahụ́ nkịtị na ahụ́ mmụọ (35-49)

  • Ahụ́ na-anaghị anwụ anwụ na ahụ́ na-anaghị ere ure (50-57)

  • Ọtụtụ ihe a ga-arụ n’ọrụ Onyenwe anyị (58)

15  Ụmụnna m, m na-echetara unu ozi ọma m ziri unu,+ nke unu nabatara, nke unu jidesikwara ike.  A ga-azọpụta unu ma unu jidesie ozi ọma m ziri unu ike. Ma ọ bụrụ na unu ejisighị ya ike, n’eziokwu, o nweghị uru ọ bara na unu bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.  Ihe kacha mkpa a kụziiri m ka m kụziiri unu, ya bụ, na Kraịst nwụrụ maka mmehie anyị otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+  E likwara ya+ ma kpọlite ya+ n’ụbọchị nke atọ+ otú Akwụkwọ Nsọ kwuru.+  Ọ pụtakwara n’ihu Sifas,*+ mechaakwa pụta n’ihu ndịozi ya iri na abụọ.+  Mgbe e mechakwara, ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise (500) n’otu mgbe.+ Anyị na ọtụtụ n’ime ha ka nọkwa, ma ụfọdụ anwụọla.*  O mechara pụta n’ihu Jems,+ mechaakwa, pụta n’ihu ndịozi niile.+  Mụnwa bụkwa onye ikpeazụ ọ pụtara n’ihu ya,+ dị ka à ga-asị na m bụ nwa a mụkworo amụkwo.  N’ihi na n’ime ndịozi niile, ọ bụ m kacha nta, e kwesịghịkwa ịkpọ m onyeozi, maka na akpagburu m ọgbakọ Chineke.+ 10  Ma, ọ bụ amara Chineke meere m ka m ji nwee ike ịna-arụ ọrụ a. Amara a o meere m efughịkwa ọhịa, n’ihi na m gbara mbọ karịa ndịozi ndị ọzọ niile. Ma, agbaghị m mbọ a n’ike m, kama ọ bụ amara Chineke meere m. 11  Ma ọ̀ bụ m ma ọ̀ bụ ha na-ezi ozi ọma, otu ihe ka anyị na-ezisa, unu kwekwaara na ya. 12  Ma ọ bụrụ na anyị na-ekwusa na a kpọlitere Kraịst n’ọnwụ,+ olee ihe mere ụfọdụ n’ime unu ji ekwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ? 13  Ọ bụrụ n’eziokwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ pụtara na a kpọliteghị Kraịst. 14  Ma ọ bụrụ na a kpọliteghị Kraịst, ọ pụtara na ozi ọma anyị na-ezisa enweghị isi, okwukwe unu enweghịkwa ebe o hiwere isi. 15  Ọ bụrụkwa n’eziokwu na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ pụtara na Chineke akpọliteghị Kraịst.+ Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-agha ụgha na Chineke kpọlitere ya.+ 16  N’ihi na ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, a kpọliteghịkwa Kraịst. 17  Ọ bụrụkwa na a kpọliteghị Kraịst, okwukwe unu abaghị uru. A gbagharabeghị unu mmehie unu.+ 18  Ya bụrụ otú ahụ, ndị nwụrụ anwụ,* bụ́ Ndị Kraịst, agaghịkwa adị ndụ ọzọ.+ 19  Ọ bụrụ naanị ná ndụ a ka anyị nwere olileanya na Kraịst, e kwesịrị imetere anyị ebere karịa onye ọ bụla ọzọ. 20  Ma, n’eziokwu, o doro anyị anya na a kpọlitela Kraịst n’ọnwụ. Ọ bụ ya bụ onye mbụ a kpọlitere n’ọnwụ, dị ka mkpụrụ mbụ.+ 21  Otú ahụ ọnwụ si n’aka otu onye+ ka ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ ga-esikwa n’aka otu onye.+ 22  Otú ahụ mmadụ niile na-anwụ n’ihi Adam+ ka a ga-ejikwa maka Kraịst kpọlite ndị niile nwụrụ anwụ.+ 23  Ma a na-akpọlite ha n’usoro: onye mbụ a kpọlitere bụ Kraịst, dị ka mkpụrụ mbụ,+ e mechaakwa, n’oge ọnụnọ ya, a ga-akpọlite ndị nke Kraịst.+ 24  N’ikpeazụ, mgbe o mechara ka ọchịchị niile na ndị niile nwere ikike inye iwu ghara ịdị, ọ ga-enyefe Alaeze Chineke n’aka Chineke bụ́ Nna ya.+ 25  N’ihi na ọ ga-achịgide ruo mgbe Chineke merichara ndị iro ya niile.+ 26  Ọnwụ bụ onye iro ikpeazụ a ga-emeri.+ 27  N’ihi na Chineke “edowela ihe niile n’okpuru ya.”*+ Ma mgbe e kwuru na ‘e dowela ihe niile n’okpuru ya,’+ o doro anya na Chineke, onye dowere ihe niile n’okpuru ya, esoghị nọrọ n’okpuru ya.+ 28  Ma mgbe Chineke dowechara ihe niile n’okpuru Ọkpara ya, Ọkpara ya ga-edowekwa onwe ya n’okpuru Chineke, onye dowere ihe niile n’okpuru ya.+ Naanị Chineke ga na-achịzi ihe niile.+ 29  Ma ọ́ bụghị ya, olee uru ndị a na-eme baptizim ka ha nwụọ ga-erite?+ Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, gịnị mere e ji na-eme ndị ahụ baptizim ka ha nwụọ? 30  Gịnịkwa mere na n’oge ọ bụla, anyị na-eme ihe e nwere ike iji maka ya gbuo anyị?+ 31  Ụmụnna m, n’ihi isi m ji unu bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs Onyenwe anyị na-anya, ana m ekwusi ike na a na-enwe ihe nwere ike igbu m n’ụbọchị niile. 32  Ọ bụrụ na mụ na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs otú ndị ọzọ na-eme,+ olee uru ọ baara m? Ọ bụrụ na a gaghị akpọlite ndị nwụrụ anwụ, “ka anyị na-eri, na-aṅụ n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”+ 33  Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.+ 34  Na-echenụ echiche nke ọma, na-emekwanụ ihe dị mma. Unu anọkwala na-eme mmehie. Ụfọdụ n’ime unu amaghị Chineke. Ana m ekwu ihe a ka ihere mee unu. 35  Ma, mmadụ nwere ike ịsị: “Olee otú a ga-esi kpọlite ndị nwụrụ anwụ? Oleekwa ụdị ahụ́ ha ga-ebu pụta?”+ 36  Onye na-enweghị uche, ọ̀ bụ na mkpụrụ ị kụrụ anaghị ebu ụzọ nwụọ tupu ya epulite?* 37  Ọ bụghị mkpụrụ pulitere epulite ka ị na-akụ, kama ọ bụ mkpụrụ nkịtị. O nwere ike bụrụ nke ọka wit ma ọ bụ mkpụrụ ọ bụla ọzọ. 38  Ma Chineke na-eme ka o too otú dị ya mma, mkpụrụ nke ọ bụla na-etokwa n’ụdị nke ya. 39  Anụ ahụ́ niile abụghị otu. Mmadụ nwere nke ya. Anụ ụlọ nwere nke ya. Nnụnụ nwere nke ya, azụ̀ enweekwa nke ya. 40  Ụdị ahụ́ ihe ndị dị n’eluigwe nwere+ dị iche n’ụdị ahụ́ ihe ndị dị n’ụwa nwere.+ Otú ihe ndị dị n’eluigwe si maa mma dịkwa iche n’otú ihe ndị dị n’ụwa si maa mma. 41  Otú anyanwụ si maa mma dị iche n’otú ọnwa si maa mma.+ Otú kpakpando si maa mma dịkwa iche. N’eziokwu, otú otu kpakpando si maa mma dị iche n’otú kpakpando ọzọ si maa mma. 42  Otú ahụkwa ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-adị. Ahụ́ onye nwụrụ anwụ na-ere ure, ma ahụ́ onye a kpọlitere n’ọnwụ anaghị ere ure.+ 43  E lie onye nwụrụ anwụ, e leda ya anya, ma, a kpọlite ya, a kwanyewere ya ùgwù.+ Onye e liri eli enweghị ike, ma, a kpọlite ya, ya enwee ike.+ 44  A na-eli ahụ́ nkịtị nke onye nwụrụ anwụ, ma, a na-akpọlite ya, ya enwee ahụ́ mmụọ. Ọ bụrụ na e nwere ahụ́ nkịtị, e nwekwara ahụ́ mmụọ. 45  E dere, sị: “Nwoke mbụ bụ́ Adam ghọrọ onye* dị ndụ.”+ Adam ikpeazụ ghọrọ mmụọ na-enye ndụ.+ 46  Ma, ahụ́ nke mbụ abụghị ahụ́ mmụọ, kama ọ bụ ahụ́ nkịtị, e mechaa, ahụ́ mmụọ esochie. 47  Nwoke mbụ si n’ụwa, e jikwa ájá kpụọ ya.+ Nwoke nke abụọ si n’eluigwe.+ 48  Ndị nọ n’ụwa a dị otú onye ahụ e ji ájá kpụọ dị. Ndị nọ n’eluigwe dịkwa otú onye ahụ si n’eluigwe dị.+ 49  Otú ahụ anyị yiri onye ahụ e ji ájá kpụọ+ ka anyị ga-eyikwa onye ahụ si n’eluigwe.+ 50  Ụmụnna m, ihe m na-ekwu bụ na anụ ahụ́ na ọbara enweghị ike iketa Alaeze Chineke, ihe na-ere ure enweghịkwa ike ịghọ ihe na-anaghị ere ure. 51  Ka m gwa unu otu ihe nzuzo dị nsọ: Ọ bụghị anyị niile ga-anwụ* ma nọtee aka tupu a kpọlite anyị. Ma a ga-agbanwe anyị niile+ 52  ozugbo, n’otu ntabi anya, n’oge a ga-afụ opi ikpeazụ. A fụọ opi ahụ,+ a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ha enwee ahụ́ na-anaghị ere ure, a ga-agbanwekwa anyị. 53  N’ihi na onye nwere ahụ́ nke nwere ike ire ure ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ire ure,+ onye nwekwara ahụ́ nke nwere ike ịnwụ anwụ ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ.+ 54  Ma mgbe onye nwere ahụ́ nke nwere ike ire ure nweziri ahụ́ nke na-enweghị ike ire ure, onye nwere ahụ́ nke nwere ike ịnwụ anwụ enweekwa ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ, mgbe ahụ ka ihe a e dere ga-emezu: “E loola ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.”+ 55  “Ọnwụ, olee ebe ike gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe i ji agba mmadụ dị?”+ 56  Ihe ọnwụ ji agba mmadụ bụ mmehie,+ ma ihe mmehie ji akpa ike bụ Iwu Mosis.+ 57  Ma ekele dịrị Chineke, n’ihi na o ji Onyenwe anyị Jizọs Kraịst enyere anyị aka imeri.+ 58  N’ihi ya, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike,+ kwụrụnụ chịm, nweekwanụ ọtụtụ ihe unu na-arụ mgbe niile+ n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu ma na ọrụ Onyenwe anyị unu na-arụsi ike abụghị na nkịtị.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Aha ya ọzọ bụ Pita.
Na Grik, “ehiela ụra ọnwụ.”
Na Grik, “ndị hiri ụra ọnwụ.”
Na Grik, “n’okpuru ụkwụ ya.”
Na Grik, “ya adị ndụ.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ga-ehi ụra ọnwụ.”