Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Mmadụ ma Ọ Bụ Ajọ Mmadụ?

Gịnị Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Mmadụ ma Ọ Bụ Ajọ Mmadụ?

Echiche Baịbụl

Gịnị Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Ezigbo Mmadụ ma Ọ Bụ Ajọ Mmadụ?

KEMGBE ụwa, a na-anụkarị akụkọ otú ndị mmadụ si akpọ ibe ha asị ma na-egbu ibe ha. Ma, a na-anụkwa otú ndị mmadụ si egosi ibe ha obiọma pụrụ iche ma na-ewepụta onwe ha enyere ndị ọzọ aka. Gịnị mere obi ji efe ụfọdụ ndị azụ, ha ana-egbu mmadụ ibe ha, ma ndị ọzọ enwee nnọọ obiọma, na-emenyekwara ibe ha? Gịnị mere ụmụ mmadụ ji akpa àgwà ka anụ ọhịa mgbe ụfọdụ?

Ezughị Okè na Akọnuche

Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Ọchịchọ obi mmadụ jọrọ njọ malite n’oge ọ bụ nwata gawa.” (Jenesis 8:21) Ọ bụ ya mere ụmụaka ji arụ ụmụ arụrụala ụfọdụ. (Ilu 22:15) Anyị niile bu mmehie pụta ụwa. (Abụ Ọma 51:5) Iji hụ na anyị na-eme ihe ọma, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike dị nnọọ ka onye gwuuru mmiri na-agbago agbago mgbe mmiri na-asọda asọda ga-agbasi mbọ ike ka mmiri ghara iburu ya.

N’agbanyeghị na anyị bu mmehie pụta ụwa, Chineke nyere anyị akọnuche. Akọnuche a, nke na-agwa anyị ihe dị mma na ihe dị njọ, na-enyere ọtụtụ n’ime anyị aka ime ihe dị mma. Nke a medịrị e ji ahụ ndị na-amaghị iwu Chineke ma ha ana-egosi ndị ọzọ obiọma. (Ndị Rom 2:14, 15) Ma dị ka anyị kwuru na mbụ, mmehie anyị bu pụta ụwa na-eme ka o siere anyị ike ịna-eme ihe dị mma. Gịnị ọzọ na-eme ka o siere anyị ike ime ihe dị mma?

Ụwa Ọjọọ Anyị Bi n’Ime Ya

Ọ bụ ebe ogwumagala nọ na-ekpebi otú ọ ga-acha. Otú ahụkwa ka ndị ha na ndị omekome na-akpa na-esikarị amụta àgwà ha. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Esonyela ìgwè mmadụ ịga mee ihe ọjọọ.” (Ọpụpụ 23:2) Ọ bụrụkwa na ndị anyị na ha na-akpa bụ ndị na-ekwu eziokwu, ndị na-akwụwa aka ha ọtọ, na ndị na-akpa àgwà ọma, anyị ga-amụta ime ihe ọma.—Ilu 13:20.

Ma, anyị ekwesịghị iche na anyị agaghị eme ihe ọjọọ naanị n’ihi na anyị na ndị na-eme ihe ọjọọ anaghị akpa. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ihe ọjọọ nwere ike ịdị anyị n’obi na-eche oge anyị ga-eme ya. (Jenesis 4:7) Ihe ọzọ bụ na ihe ọjọọ nwere ike isi n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi bata n’ụlọ anyị. Egwuregwu vidio, ihe nkiri ndị a na-eme na televishọn, na fim ndị a na-emepụta na-akụzikarịrị anyị na ime ihe ike na e mee e megwara dị mma. Ịgụkarị akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ igekarị akụkọ ụwa nwedịrị ike ime ka ihe ọjọọ ndị juru ebe niile na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata taa ghara ịna-emetụ anyị n’ahụ́.

Gịnị mere ihe ọjọọ ji ju n’ụwa anyị a? Baịbụl kwuru sị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Akwụkwọ Nsọ kwuru na “ajọ onye ahụ,” onye bụ́ Setan bụ́ Ekwensu, bụ onye ụgha na ogbu mmadụ. (Jọn 8:44) O ji ụwa ọjọọ ya eme ka ihe ọjọọ ju ebe niile.

Ebe ọ bụ na ihe ndị a niile na-eme ka ụmụ mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ, ụfọdụ ndị nwere ike ịsị na ihe ọjọọ ha na-eme esighị ha n’aka. Ma, olee nke bụ́ eziokwu? Otú ahụ e si eji ụmara eme ka ụgbọ mmiri gaa ebe a chọrọ ka ọ gaa, otú ahụkwa ka obi anyị si ekpebi ihe anyị ga-eme.

Ọ Dị Gị n’Aka Ime Ihe Ọma ma Ọ Bụ Ihe Ọjọọ

Ihe ọ bụla mmadụ kpachaara anya mee, ma ọ̀ bụ nke ọma ma ọ bụ nke ọjọọ, onye ahụ bu ụzọ chee ya eche. Onye na-eche ihe dị mma n’obi ya ga na-eme ihe dị mma. N’otu aka ahụkwa, ọ bụrụ na mmadụ na-echekarị ihe ọjọọ n’obi ya, o doro anya na onye ahụ ga na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ. (Luk 6:43-45; Jems 1:14, 15) N’ihi ya, e nwere ike ịsị na mmadụ na-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-abụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ ajọ mmadụ.

Ọ dị mma ịmara na Baịbụl kwuru na mmadụ nwere ike ịmụta ime ihe dị mma. (Aịzaya 1:16, 17) Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka mmadụ mee ihe ọma, n’ihi na “ịhụnanya adịghị eme onye agbata obi mmadụ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 13:10) Ọ bụrụ na anyị amụta ịhụ ndị mmadụ n’anya, anyị agaghị eme ha ihe ọjọọ.

Ihe a ka otu nwoke aha ya bụ Ray, onye bi na Pensụlvenịa nke dị n’Amerịka, mụtara. Ray si na nwata lụwa ọgụ, nke na ndị mmadụ jizi ịlụ ọgụ mara ya. Ọ na-ewekarịkwa iwe ọkụ. Ma ka o bidoro ime ihe ọ na-amụta na Baịbụl, o ji nwayọọ nwayọọ gbanwee omume ya. Ma ime mgbanwe ndị ahụ adịghịrị ya mfe. Mgbe ụfọdụ, ọ na-adị ya otú ọ dị Pọl, onye so dee Baịbụl, bụ́ onye sịrị: “Mgbe m chọrọ ime ihe ziri ezi, ọ bụ ihe ọjọọ na-adị n’ebe m nọ.” (Ndị Rom 7:21) Ugbu a, Ray amụtala ‘iji ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ’ n’agbanyeghị na o were ya ọtụtụ afọ.—Ndị Rom 12:21.

Gịnị mere o ji dị mma ka mmadụ “na-eje ije n’ụzọ ndị ezi mmadụ”? (Ilu 2:20-22) Ọ bụ n’ihi na ihe ọma ga-emecha merie ihe ọjọọ. Baịbụl kwuru, sị: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ . . . N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:9-11) Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile. Ndị niile na-agba mbọ ime ihe ọma ugbu a ga-enwe ezigbo obi ụtọ n’oge ahụ.

Ì CHETỤLA NKE A N’ECHICHE?

● Ònye ka e kwesịrị ịta ụta maka ihe ọjọọ ọ bụla anyị mere?—Jems 1:14.

● Ànyị nwere ike ịgbanwe àgwà ọjọọ anyị?—Aịzaya 1:16, 17.

● Ihe ọjọọ ọ̀ ga-emecha kwụsị?—Abụ Ọma 37:9, 10; Ilu 2:20-22.

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Mmadụ na-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-abụ ezigbo mmadụ ma ọ bụ ajọ mmadụ