Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Ngwere Ahụ́ Ogwu Ogwu nke Ahụ́ Ya Na-amị Mmiri

Ngwere Ahụ́ Ogwu Ogwu nke Ahụ́ Ya Na-amị Mmiri

EBE a na-ahụkarị ngwere a e sere ebe a bụ n’Ọstrelia. Ọ na-amịrị mmiri dị n’ájá ma ọ bụ nke metụrụ ya n’ahụ́. Ọ bụrụkwa na igirigi adaa ya n’ahụ́, ya amịrị ya. Ọ na-amịrịkwa mmiri dị n’ikuku. Mmiri ọ bụla ọ mịịrị na-aga n’ọnụ ya, ya aṅụọ ya. Gịnị na-enyere ya aka ime ya? Ọ bụ akpụkpọ ahụ́ ya.

Otú akpụkpọ ahụ́ ngwere a dị na-eme ka mmiri o ji ahụ́ ya mịrị gaa n’ọnụ ya

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Ngwere a nwere akpịrịkpa. Akpịrịkpa nke ọ bụla nwekwara oghere dị́ n’akụkụ ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwuru na mmiri ọ bụla metụrụ ngwere a n’ahụ́ na-esi n’oghere ndị ahụ banye n’ime ahụ́ ya. Mmiri banye ya n’ime ahụ́, o nwere ebe ọ na-esizi gaa n’ọnụ ya.

Ma, gịnị na-eme ka ngwere a nwee ike isi n’akpụkpọ ahụ́ ya mịrị mmiri, ya abanye ya n’ime ahụ́, gagide ruo n’ọnụ ya? Gịnịkwa na-enyere ya aka iji afọ ya amịrị mmiri dị n’ala?

O nwere ihe ndị ọkachamara kwuru nwere ike ịbụ ya na-enyere ya aka ime ihe ndị a. Ha kwuru na e nwere ihe jikọrọ elu akpụkpọ ahụ́ ya na ime akpụkpọ ahụ́ ya. Ihe ahụ bụ oghere mmiri na-esi abanye n’ime ahụ́ ya. Oghere ahụ na-enye aka ka ahụ́ ya na-amịrị mmiri dị n’ala. Anyị nwere ike ikwu na ahụ́ ngwere a na-amị mmiri otú ahụ fom si amị mmiri.

E nwere otu ụlọ ọrụ na-eme ha leruchaa ihe ndị e kere eke anya, ha arụpụta ihe dị iche iche. Onyeisi ụlọ ọrụ a kwuru na ilerukwu anya n’otú ahụ́ ngwere a si amị mmiri ga-enyere ndị ọkachamara aka ịrụpụta ihe ndị ga na-amịrị mmiri dị n’ikuku. A ga-enwe nke ga na-amịrị ya iji nweta ezigbo mmiri ọṅụṅụ, nweekwa nke ga na-amịrị ya iji mee ka ime ụlọ na-ajụ oyi.

Gịnị ka i chere? Otú a ahụ́ ngwere a si arụ ọrụ ọ̀ nọkatara dịrị ka è nwere onye kere ya otú ahụ?