Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara

Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara

IHE NA-EMEKARỊ

Ka e were ya na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị sere okwu, gị ekwuo n’obi gị na ị gaghị arịọ ya mgbaghara maka na o nweghị ihe i mere ya.

Ka i kwuchara ya, gị agbachi nkịtị. Ma ihe na-ebenụ ka na-ebe. Ọ na-emetụ gị n’obi ka ị rịọ ya mgbaghara, ma ya ana-esiri gị ike.

IHE MERE ỊRỊỌ MGBAGHARA JI ARA AHỤ́

Ịdị mpako. Otu nwoke aha ya bụ Uchendu * kwuru na mgbe ụfọdụ, ịrịọ nwunye ya mgbaghara na-ara ya ahụ́ n’ihi na ịrịọ mgbaghara bụ dimkpa ịkparị onwe ya. Ihe a o kwuru gosiri na ọ na-esiri onye mpako ike ikweta na o nwere ihe o mejọrọ.

Otú mmadụ si ele ya anya. I nwere ike ịna-eche na naanị mgbe i kwesịrị ịrịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara bụ mgbe i mejọrọ ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Chidimma kwuru na ọ bụ naanị mgbe o doro ya anya na ya mejọrọ di ya ka ya na-arịọ ya mgbaghara. Ma, o kwuru na ọ na-esiri ya ike ịrịọ di ya mgbaghara ma ọ bụrụ na di ya gwara ya okwu ọjọọ, ya agwagwara ya. Ọ sịrị na ya ekwesịghị ịrịọ ya mgbaghara ma ha abụọ mejọọ ibe ha.

Mmadụ nwere ike ịna-eche na ya ekwesịghị ịrịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ bụghị yanwa chọrọ okwu. Otu nwoke aha ya bụ Ikenna kwuru, sị: “Ọ bụrụ na obi siri gị ike na o nweghị ihe i mere, otú ị ga-esi mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị mara bụ ịjụ ịrịọ ya mgbaghara.

Otú e si zụọ mmadụ. N’ezinụlọ ụfọdụ, ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ịrịọ ibe ha mgbaghara. Ọ bụrụ na i toro n’ụdị ezinụlọ a, o nwere ike ịbụ na ị mụtaghị ịrịọ mgbaghara. N’ihi ya, o nwere ike ịna-esiri gị ike ịrịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara ebe ọ bụ na e jighị aka ahụ zụọ gị.

IHE I NWERE IKE IME

Otú ahụ e si eji mmiri emenyụ ọkụ ka ịrịọ mgbaghara si eme ka obi onye a kpasuru iwe dajụọ

Buru ọdịmma di gị ma ọ bụ nwunye gị n’obi. Ọ bụrụ na o nwere mgbe mmadụ mejọrọ gị, mechaakwa rịọ gị mgbaghara, o doro anya na obi tọrọ gị ụtọ. I nwere ike ime ka obi dị di gị ma ọ bụ nwunye gị ụtọ otú ahụ. Ọ bụrụgodị na i chere na i mejọghị ya, ọ ga-adị mma ka ị rịọ ya mgbaghara ka obi jụrụ ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 6:31.

Buru ọdịmma ezinụlọ gị n’obi. Mmadụ ịrịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara apụtaghị na onye ahụ na-eweda onwe ya ala. Kama, ọ na-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo. A sị ka e kwuwe, onye e mejọrọ ya eburu iwe n’obi “karịrị obodo siri ike.” (Ilu 18:19) Ị manụ na di na nwunye na-ebu iwe n’obi, ha agaghị na-ebi n’udo. Ma, ị na-arịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara, ụmụ obere ihe agaghị abụrụ unu nsogbu. Ime otú a na-egosi na ọdịmma ezinụlọ gị dị gị mkpa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Filipaị 2:3.

Na-arịọ mgbaghara n’egbughị oge. Ọ bụ eziokwu na ọ bụrụ na i mejọghị di gị ma ọ bụ nwunye gị, ịrịọ ya mgbaghara nwere ike ịra gị ahụ́, ma ọ pụtaghị na ị ga-eji maka ya ghara ime ihe dị mma. Gbalịa rịọ ya mgbaghara. Cheta na ihe agaghị aka mma ma ị gba nkịtị. Ọ bụrụ na ị na-arịọ ya mgbaghara, yanwa ga na-arịọkwa gị, ọ gaghịkwa na-esiri unu ike ịrịọ ibe unu mgbaghara.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Matiu 5:25.

Gosi na o si gị n’obi. Mmadụ ekwesịghị ịnọ ebe ọ na-arịọ di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbaghara gosiwe ya otú ihe o mere si dị mma. O kwesịghịkwa ikwu na ya amaghị na obere ihe ahụ o mere ga-ewe ya iwe. O kwesịrị ikweta na ya mejọrọ ya, rịọkwa ya mgbaghara a sịgodị na o chere na ihe ahụ ekwesịghị iwute ya.

Cheta na i zughị okè. Echefula na o nwere mgbe ị ga-emejọ ihe n’ihi na o nweghị onye zuru okè. Ọ bụrụgodị na i chere na o nweghị ihe i mere di gị ma ọ bụ nwunye gị, yanwa nwere ike iche na i mejọrọ ya. Baịbụl kwuru, sị: “Onye bu ụzọ n’okwu ikpe ya bụ onye ezi omume; onye nke ọzọ na-abata ma mee ka a chọpụta ihe bụ́ eziokwu banyere onye ahụ.” (Ilu 18:17) Ọ bụrụ na i cheta na i zughị okè, ọ ga-eme ka ị na-arịọ di gị ma ọ bụ nwunye gị mgbaghara.

^ para. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.