Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 1 n'Afọ 2021 | Gịnị Mere I Ji Kwesị Ịna-ekpe Ekpere?

È nwetụla mgbe ọ dị gị ka Chineke anaghị aza ekpere gị? Ọ bụrụ otú ahụ, e nwere ndị ọ dị otú ọ dị gị. Ọtụtụ ndị ekpeela ekpere ka Chineke nyere ha aka ná nsogbu ha, ma ha na nsogbu ndị ahụ ka na-alụ. Isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche a ga-ekwu ihe mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke na-anụ ekpere anyị. Ha ga-ekwukwa ihe mere Chineke anaghị aza ekpere ụfọdụ na otú anyị ga-esi ekpe ekpere Chineke aza ya.

 

Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ekpere

Ekpere ọ̀ bụ ezigbo onyinye Chineke nyere anyị, ka ọ̀ bụ na e nweghị uru ọ bara ikpe ekpere?

Chineke Ọ̀ Na-Anụ Ekpere Anyị?

Baịbụl gwara anyị na Chineke na-anụ ekpere anyị ma anyị kpee ya otú kwesịrị ekwesị.

Gịnị Mere Chineke Anaghị Aza Ekpere Niile?

Baịbụl gwara anyị ụdị ekpere Chineke ga-anụ na nke ọ na-agaghị anụ.

Olee Otú Ị Ga-esi Ekpe Ekpere Chineke Anụ Ya?

Gwa Chineke okwu n’ebe ọ bụla na n’oge ọ bụla. Na-agwakwa ya okwu n’ime obi gị ma ọ bụ kwupụta ya ekwupụta. Jizọs medịrị ka anyị mata ihe anyị ga-ekwu.

Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị

Olee otú ekpere ga-esi enyere gị aka idi nsogbu ndị na-abịara gị?

Chineke Ọ̀ Na-anụ Ekpere Gị?

Baịbụl gwara anyị na i kpegara Chineke ekpere, ọ na-anụ ekpere gị, chọọkwa inyere gị aka.