Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị

Uru Ekpere Nwere Ike Ịbara Gị

Otu nwaanyị aha ya bụ Pamela gara ụlọ ọgwụ n’ihi ọrịa kansa ọ na-arịa. Ọ rịọrọ Chineke ka o nye ya ike ọ ga-eji na-edi nsogbu a ya na ya na-alụ. È nwere uru ekpere a o kpere baara ya?

Pamela sịrị: “Ezigbo ụjọ tụrụ m mgbe a na-agwọ m ọrịa kansa a. Ma mgbe m kpegaara Jehova Chineke ekpere, ahụ́ bịara ruo m ala, mụ akwụsịkwa ụjọ ahụ m na-atụ. Ahụ́ ka na-egbu m ezigbo mgbu, ma ekpere nyeere m aka ịna-edi nsogbu m. Ndị mmadụ jụọ m otú m mere, m na-agwa ha, sị: ‘Ahụ́ adịghị m, ma obi dị m ụtọ.’”

Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ichere ka ezigbo nsogbu bịara anyị tupu anyị ekpee ekpere. Nsogbu na-abịara anyị niile, ma ndị ukwu ma ndị nta, anyị makwa na anyị chọrọ enyemaka iji merie ha. Ekpere ò nwere ike ịbara anyị uru?

Baịbụl sịrị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ekwe ka onye ezi omume maa jijiji.” (Abụ Ọma 55:22) Ihe a Baịbụl kwuru na-akasi anyị obi. N’ihi ya, olee otú ekpere nwere ike isi nyere gị aka? Ọ bụrụ na i kpegara Chineke ekpere n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ ga-enye gị ihe ndị dị gị mkpa iji die nsogbu gị.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Otú Ekpere Ga-esi Nyere Gị Aka.”