Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpebi M Mere Mgbe M Bụ Nwatakịrị

Mkpebi M Mere Mgbe M Bụ Nwatakịrị

Mgbe m bụ nwatakịrị

N’afọ 1985, ụmụaka si Kambodia gafetara n’ụlọ akwụkwọ anyị dị na Kolọmbọs, Ohayo, dị n’Amerịka. Adị m naanị afọ iri mgbe ahụ. Otu n’ime ụmụaka ahụ matụ asụsụ Bekee. Ọ malitere ise ihe, jiri ya na-akọrọ m otú e si mekpọọ ndị mmadụ ọnụ, otú e si gbuo ndị mmadụ, na otú ndị mmadụ si gbaa ọsọ ndụ. Akụkọ ndị ahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ́. M na-ebe ákwá n’abalị ma m cheta ụmụaka ahụ. M chọrọ ịgwa ha gbasara Paradaịs na mbilite n’ọnwụ. Ma, ha anaghị anụ Bekee. N’agbanyeghị na m dị obere mgbe ahụ, m kpebiri ịmụ asụsụ Kambodian ka m nwee ike ịgwa ha gbasara Jehova. Amachaghị m na ihe a m kpebiri ime ga-emecha baara m uru.

Ịmụ asụsụ Kambodian siiri m ike. E nwere ugboro abụọ m kpebiri na agaghịzi m amụ ya. Ma, Jehova si n’aka papa m na mama m gbaa m ume. Ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe m mechara nyewe m nsogbu ka m nweta ọrụ ga na-enye m ezigbo ego. Ma, achọrọ m ịbụ ọsụ ụzọ. N’ihi ya, mgbe m nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị, ekpebiri m ịmụ ihe ndị ga-enyere m aka inweta ọrụ na-agaghị ewekọrọ oge m niile. Ọ na-abụ, anyị gbasaa akwụkwọ, mụ esoro ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ gaa ozi ọma. M wepụtakwara onwe m na-akụziri ụmụ akwụkwọ ibe m Bekee. Ihe ahụ m na-eme mechara baara m uru.

Mgbe m dị afọ iri na isii, anụrụ m na e nwere ụmụnna ole na ole na-eji asụsụ Kambodian amụ ihe n’ebe a na-akpọ Lọṅ Bich, dị na Kalịfọnịa, n’Amerịka. M gara ebe ahụ mụọ otú e si agụ Kambodian. Ozugbo m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, m malitere ịsụ ụzọ, na-ezi ndị Kambodia bi n’akụkụ ụlọ anyị ozi ọma. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, echewela m echiche ịga biri na Kambodia. N’oge ahụ, nsogbu ka dị n’obodo ahụ. Ma, ama m na ọtụtụ n’ime nde mmadụ iri bi na Kambodia anụbeghị ozi ọma. N’oge ahụ, ọ bụ naanị otu ọgbakọ ka e nwere n’obodo ahụ. Ndị nkwusa nọ na ya dị iri na atọ. Mgbe mbụ m gara Kambodia bụ mgbe m dị afọ iri na itoolu. Mgbe m dị afọ iri abụọ na otu, m kwagara ebe ahụ. Mgbe m ruru, m nwetara ọrụ na-agaghị ewekọrọ oge m, ya bụ, ọrụ nsụgharị na ịkụzi Bekee. M mechara lụọ otu nwanna nwaanyị kpebiri iji ndụ ya jeere Jehova ozi otú m kpebiri. Obi dị mụ na ya ụtọ na anyị enyerela ọtụtụ ndị Kambodia aka ha aghọọ Ndịàmà Jehova.

Jehova ‘enyela m ihe obi m na-arịọ.’ (Ọma 37:4) Ikwusa ozi ọma bụ ihe kacha eme obi ụtọ mmadụ nwere ike ịna-eme. Kemgbe afọ iri na isii m nọwara na Kambodia, ọ bụghịzi naanị ndị nkwusa iri na atọ ka e nwere. E nweziri ọgbakọ iri na abụọ na ìgwè nta anọ na-aghọbeghị ọgbakọ.—Akụkọ Jason Blackwell kọrọ.