Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

“Ha Chọrọ Ka M Jiri Aka M Chọpụta nke Bụ́ Eziokwu”

“Ha Chọrọ Ka M Jiri Aka M Chọpụta nke Bụ́ Eziokwu”
  • A MỤRỤ M N’AFỌ: 1982

  • ABỤ M ONYE: DỌMINIKAN RIPỌBLIK

  • NDỤ M BIRI: EZINỤLỌ ANYỊ NA-EKPE CHỌỌCHỊ MỌMỌN

NDỤ M BIRI NA MBỤ:

A mụrụ m n’obodo a na-akpọ Santo Domingo nke dị na Dọminikan Ripọblik. Abụ m nwa nke anọ n’ime ụmụ anọ nne na nna m mụrụ. Nne na nna anyị gụrụ oké akwụkwọ, ha chọkwara ịnọ n’obodo a na-enwechaghị ndị ọjọọ na ya zụọ anyị. Afọ anọ tupu a mụọ m, papa m na mama m hụrụ ụmụ okorobịa ndị na-ekpe chọọchị Mọmọn. Ha si n’obodo ọzọ bịa ikwusa ozi ọma n’obodo anyị. Mgbe mama m na papa m hụrụ otú ha si akpa ezigbo àgwà ma na-eji ejiji dị mma, ha kpebiri ka ezinụlọ anyị kpewezie okpukpe ndị Mọmọn. Ọ bụ otú ahụ ka ezinụlọ anyị si soro ná ndị mbụ bidoro ikpe chọọchị Mọmọn n’obodo anyị.

Mgbe m na-eto, oriri na ọṅụṅụ a na-eme n’ụlọ ụka anyị na-atọ m ezigbo ụtọ. Ihe ọzọ na-amasịkwa m bụ na ndị chọọchị Mọmọn ejighị okwu gbasara ezinụlọ na mmadụ ịkpa àgwà ọma egwuri egwu. Obi na-atọ m ụtọ na m bụ onye Mọmọn. M kpebikwara na m ga-abụ onye Mọmọn na-ekwusa ozi ọma n’ala ọzọ ma m too.

Mgbe m dị afọ iri na asatọ, ezinụlọ anyị kwagara Amerịka ka m nwee ike gaa akwụkwọ n’ezigbo mahadum. Mgbe ihe dị ka otu afọ gafere, nwanne mama m na di ya bịara Flọrịda ileta anyị. Ha bụ Ndịàmà Jehova. Ha kpọkwara anyị ka anyị soro ha gaa mgbakọ ha. Ná mgbakọ ahụ, otú ndị mụ na ha nọ si na-asape Baịbụl ha ma jiri akwụkwọ na-edetu ihe ha na-amụta masịrị m. Nke a mere ka m gwa ha ka e nyetụ m akwụkwọ na mkpịsị akwụkwọ, mụ ejiri ha na-ede ihe m na-amụta.

Mgbe e mechara mgbakọ ahụ, nwanne mama m na di ya gwara m na ebe ọ bụ na m chọrọ ịga mba ọzọ na-ekwusa ozi ọma, na ha ga-enyere m aka ka m mara Baịbụl nke ọma. Ihe a ha kwuru dị m mma n’ihi na n’oge ahụ, amachaghị m Baịbụl otú m ma akwụkwọ ndị Mọmọn.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M:

Mgbe ọ bụla nwanne mama m na di ya ji fon na-akụziri m Baịbụl, ha na-agwa m ka m were ihe a na-akụziri m na chọọchị tụnyere ihe Baịbụl  kwuru. Ha chọrọ ka m jiri aka m chọpụta nke bụ́ eziokwu.

E nwere ọtụtụ ihe a na-akụzi na chọọchị Mọmọn m kwetara na ha bụ eziokwu, ma amakwanụghị m ma hà si na Baịbụl ma ọ bụ na ha esighị. Nwanne mama m ahụ ziteere m Teta! (Bekee) nke November 8, 1995. * Otu isiokwu dị na Teta! ahụ kwuru banyere ihe ndị Mọmọn kweere. Mgbe m gụchara magazin ahụ, o juru m anya ịhụ na e nwere ọtụtụ ihe ndị Mọmọn na-akụzi m na-amaghị. Nke a mere ka m gaa n’ebe ndị Mọmọn na-edebe ihe n’Ịntanet ka m chọpụta ma ihe ahụ e dere na Teta! ahụ ọ̀ bụ eziokwu. Achọpụtara m na ọ bụ eziokwu. Ihe ọzọ mere m ji mata na ọ bụ eziokwu bụ ihe m hụrụ mgbe m gara n’obodo a na-akpọ Uta, bụ́ ebe ndị Mọmọn na-edebe ihe ochie ha.

M na-echebu na akwụkwọ ndị Mọmọn na Baịbụl na-ekwu otu ihe. Ma mgbe m malitere ịgụ Baịbụl nke ọma, achọpụtara m na e nwere ọtụtụ ihe ndị Mọmọn na-akụzi dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, n’Ezikiel 18:4, Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Ma n’akwụkwọ ndị Mọmọn, e kwuru n’Alma 42:9 na “mkpụrụ obi emekataghị nwụọ.”

Ihe wutere m abụghị naanị na ọtụtụ ihe ndị Mọmọn na-akụzi dị iche n’ihe Baịbụl kwuru. O wutekwara m na ihe ha na-akụzi na-eme ka ndị mmadụ chewe na e nwere mba ka ibe ya mma. Dị ka ihe atụ, ndị Mọmọn na-akụzi na ọ bụ na Jaksịn Kaụnti, nke dị na Mizuri, n’Amerịka, ka ogige Iden dịbu. Ndị isi chọọchị Mọmọn na-akụzikwa na mgbe Alaeze Chineke ga-abịa, na Chineke ga-eji ọchịchị mba Amerịka na-achị ụwa niile.

Ihe a ha na-akụzi mere ka m chewe ihe ga-emezi mba ndị ọzọ, dị ka Dọminikan Ripọblik bụ́ ebe a mụrụ m. M welitere okwu a n’otu mgbede mgbe otu nwa okorobịa onye Mọmọn kpọrọ m na fon. N’oge ahụ, a na-azụ nwa okorobịa ahụ ka ọ gaa kwusawa ozi ọma n’ala ọzọ. M jụrụ ya ma ọ̀ ga-alụso ndị Mọmọn ibe ya ọgụ ma ọ bụrụ na obodo ya na nke ndị Mọmọn ibe ya na-alụ agha. O juru m anya na ọ sịrị m na ya ga-alụso ha ọgụ. M mụsikwuru ihe ike ka m ghọta ihe chọọchị Mọmọn a m na-ekpe na-akụzi, m jụkwara ndị isi chọọchị Mọmọn ajụjụ. Ha gwara m na ajụjụ ndị ahụ m na-ajụ bụ ihe omimi, na a ga-emecha mata azịza ha otu ụbọchị.

Ihe a ha zara m ejughị m afọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka m bịara chee echiche nke ọma ka m ghọta ihe mere m ji chọọ ka chọọchị Mọmọn ziga m ala ọzọ ka m kwusawa ozi ọma. M chọpụtara na ihe kpatara ya bụ na m chọrọ inyere ndị mmadụ aka. Ihe ọzọkwa bụ na m chọrọ ka a na-akwanyere m ùgwù otú e si akwanyere ndị e zigara ala ọzọ ka ha kwusawa ozi ọma. Ma, a bịakwanụ n’ịma onye Chineke bụ, achịtaghị m ájá. Ọ bụ ezie na mụ agụọla Baịbụl ọtụtụ ugboro n’oge gara aga, o nweghị ihe m ji ya kpọrọ. A maghị m ihe bụ́ uche Chineke maka ụwa ma ọ bụkwanụ ihe bụ́ uche ya maka ụmụ mmadụ.

URU NDỊ M RITERELA:

Mgbe mụ na Ndịàmà Jehova mụwara Baịbụl, amụtara m ihe bụ́ aha Chineke, ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo uche Chineke, na ihe ndị ọzọ. N’ikpeazụ, ihe Baịbụl na-akụzi malitere ido m anya. Ebidokwara m ịkọrọ ndị ọzọ ihe ndị m na-amụta na Baịbụl. Ịkọrọ ya ndị ọzọ na-atọkwa m ụtọ. Kemgbe ụwa m, ekwetara m na Chineke dị, ma m bịaziri weere ya ka ezigbo enyi m m na-akọrọ obi m n’ekpere. Emere m baptizim n’abalị iri na abụọ nke ọnwa Julaị n’afọ 2004, mụ aghọọ Onyeàmà Jehova. Mgbe ọnwa isii gafere, aghọrọ m Onye Kraịst nke na-ekwusa ozi ọma oge niile.

Arụrụ m ọrụ afọ ise n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bruklin, Niu Yọk. Obi tọrọ m ụtọ na m nyere aka n’ibipụta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl bụ́ ndị na-abara ọtụtụ nde mmadụ bi n’ebe dị iche iche n’ụwa uru. M ka na-enyekwara ndị mmadụ aka ka ha mụta banyere Chineke.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ para. 12 Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta magazin a a na-akpọ Teta!