Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: OBI Ọ̀ TARA CHINEKE MMIRI?

Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Ji Ekwu na Obi Tara Chineke Mmiri?

Gịnị Mere Ụfọdụ Ndị Ji Ekwu na Obi Tara Chineke Mmiri?

MGBE ị hụrụ ajụjụ a jụrụ n’ihu magazin a, ò juru gị anya? Ọ na-eju ụfọdụ ndị anya. Ma e nwere ọtụtụ ndị ọ na-edoghị anya ma obi ọ̀ tara Chineke mmiri ma ọ bụ na ọ taghị ya. Ọtụtụ ndị chekwara na obi tara ya mmiri. Gịnị mere ha ji eche otú ahụ?

Ọ na-abụ ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasị ụfọdụ ndị, ha na-ajụ, sị: “Gịnị mere Chineke ji hapụ ihe ndị a ka ha na-eme? Ọ̀ ga-abụ na ihe ndị a na-emenụ anaghị emetụ ya n’obi? Obi ọ̀ tara ya mmiri?”

Ụfọdụ ndị na-ajụkwa ụdị ajụjụ ndị a n’ihi ihe ụfọdụ ha na-agụta na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ha gụọ otú Chineke si jiri iju mmiri bibie ndị mmadụ n’oge Noa, ha na-ajụ, sị: ‘Olee otú Chineke a sịrị na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ga-esi egbu ndị niile ahụ o gburu? Ọ̀ bụ onye obi ọjọọ?’

Ò nwere mgbe ajụjụ ndị a na-agbata gị n’obi? Ka ọ̀ na-abụ ndị mmadụ jụọ ụdị ajụjụ a, ị gaghị ama ihe ị ga-aza ha? Nke ọ bụla ọ bụ, ọ ga-adị mma ka i leba anya n’ajụjụ ọzọ a dị mkpa.

GỊNỊ MERE NA Ọ NAGHỊ ADỊ ANYỊ MMA ỊHỤ EBE A NA-EMEGBU NDỊ MMADỤ?

Ihe kpatara ya bụ na ihe ọjọọ anaghị adị anyị mma. O so n’ihe mere anyị ji dị iche n’ụmụ anụmanụ. Chineke kere anyị “n’onyinyo ya.” (Jenesis 1:27) Gịnị ka Chineke ike anyị “n’onyinyo ya” pụtara? Ihe ọ pụtara bụ na o kere anyị ka anyị na-akpa àgwà ka ya, ka ihe ọma na-adị anyị mma otú ọ na-adị ya nakwa ka anyị kpọọ ihe ọjọọ asị otú ọ kpọrọ ya. Chegodị echiche. Ọ bụrụ na ihe ọma na-adị anyị mma, anyị ana-asọkwa ihe ọjọọ nsọ maka na Chineke kere anyị n’oyiyi ya, ọ̀ bụ na nke a anaghị egosi na Chineke kpọkwara ihe ọjọọ asị?

N’eziokwu, Baịbụl gosiri na Chineke kpọdịrị ihe ọjọọ asị karịa anyị n’ihi na Chineke kwuru na Baịbụl, sị: “Ụzọ m dị elu karịa ụzọ unu, otú ahụkwa ka echiche m dị elu karịa echiche unu.” (Aịzaya 55:9) Ọ bụrụ na anyị ekwuo na obi fere Chineke azụ ma ọ bụ na obi tara ya mmiri, ihe ọ pụtara bụ na anyị na-ekwu na ụzọ anyị dị elu karịa ụzọ Chineke. N’eziokwu, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe niile dị n’okwu a tupu anyị ekwuwe na obi fere Chineke azụ. Ajụjụ anyị kwesịgodịrị ịjụ abụghị ma obi ọ̀ tara Chineke mmiri. Kama, ihe anyị kwesịrị ịjụ bụ, gịnị mere o ji adị ụfọdụ ndị ka obi ọ̀ tara Chineke mmiri? Ọ bụrụ na e kwuo na “obi tara Chineke mmiri” ma ọ bụ na ọ “dị obi ọjọọ,” gịnị ka ọ pụtara? Ka anyị lebagodị ajụjụ a anya n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịmata nke bụ́ eziokwu.

Ọ bụrụ na anyị ekwuo na obi tara mmadụ mmiri, ihe anyị na-ekwu bụ na onye ahụ bụ onye ọjọọ. Ọ na-atọ onye obi tara mmiri ụtọ ịhụ ka ndị ọzọ na-ata ahụhụ. Ọ chọdịghị ịma ma hà na-ata ahụhụ. N’ihi ya, ọ bụrụ na nna na-ata nwa ya ahụhụ maka na ọ na-atọ ya ụtọ ịhụ ebe nwa ya na-ebe ákwá, a ga-asị na obi tara nna ahụ mmiri. Ma ọ bụrụ na nna na-ata nwa ya ahụhụ ka nwa ya mụta ihe ma ọ bụ ka nwa ya ghara ịba ná nsogbu, a ga-asị na nna ahụ bụ ezigbo nna. N’eziokwu, o nwere mgbe anyị na-ekwu na ihe mmadụ mere adịghị mma maka na anyị amaghị ihe mere onye ahụ ji mee ihe ahụ.

Ka anyị lebagodị anya n’ihe abụọ mere ụfọdụ ndị ji eche na obi tara Chineke mmiri. Nke mbụ bụ ọdachi ndị na-emere onwe ha bụ́ ndị anyị na-ahụ taa. Nke abụọ abụrụ akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl banyere otú Chineke si bibie ụfọdụ ndị. Ma ajụjụ bụ, Ihe ndị ahụ hà na-egosi n’eziokwu na obi tara Chineke mmiri?